Ndị Bụ́ Mmụọ Olee Ndị Ha Bụ?
Ndị Bụ́ Mmụọ Olee Ndị Ha Bụ?
Na Yurop, otu agadi nwaanyị ji chaplet n’aka banye na chọọchị, gbuo ikpere n’ala n’ihu ihe oyiyi Meri iji kwanyere ya ùgwù. N’Afrịka, otu ezinụlọ wụsara mmanya ọkụ n’ili onye ikwu ha ha na-akwanyere ùgwù. N’Amerịka, otu nwa okorobịa bu ọnụ na-atụgharị uche, na-enwe olileanya na ọ ga-agwa mmụọ ozi na-echebe ya okwu. N’Eshia, otu onye ndú okpukpe na-akpọ ihe ndị mara mma e ji akwụkwọ mee ọkụ iji chụọrọ mmụọ ndị nna ochie àjà.
OLEE ihe jikọrọ ndị a? Ha niile kweere na e nwere ndị nwere ọgụgụ isi bụ́ mmụọ bụ́ ndị e nwere ike ịgwa okwu na ndị nwere ike ime ihe ga-emetụta nnọọ ndụ ndị mmadụ. N’ezie, nkwenkwe a amaliteghị ọhụrụ, ọ jukwaghị anyị anya. Ihe na-eju anya bụ na e nwere ọtụtụ ihe dịgasị iche iche ndị mmadụ kweere banyere ndị bụ́ mmụọ.
Ndị Alakụba na-efe otu Chi, bụ́ Allah. * Ndị nọ na Krisendọm na-ekwu na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu, nke bụ́ Chineke Nna, Chineke Ọkpara na Chineke Mmụọ Nsọ. Ndị Hindu kweere na e nwere ihe karịrị otu puku chi na chi nwaanyị. Ndị ọzọ na-ekwu na ndị mmụọ bi n’ụfọdụ anụmanụ, n’osisi, na nkume, na n’iyi. Ndị ọzọkwa kweere ihe ọtụtụ akwụkwọ, ihe nkiri, na ihe omume televishọn na-ekwu banyere ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ, mmụọ ndị nwụrụ anwụ na ototoo, chi na chi nwaanyị dị iche iche.
Otú ahụ e nwere ihe dịgasị iche iche ndị mmadụ kweere banyere chi dị iche iche, e nwekwara ọtụtụ ihe dịgasị iche iche ndị mmadụ kweere banyere otú e nwere ike isi gwa ha okwu. O doro anya na ọ bụghị ụzọ niile ndị mmadụ si agwa ha okwu ziri ezi. Ka anyị legodị ya anya otú a: Tupu anyị akpọọ mmadụ na telefon, anyị kwesịrị ịma onye anyị na-akpọ, obi kwesịkwara isi anyị ike na onye ahụ dị adị n’ezie nakwa na ọ ga-achọ ịza anyị. Ịkpọ onye anyị na-amaghị ma ọ̀ dị adị na fon enweghị isi. Nke kadị njọ bụ ịkpọ onye ọjọọ.
Ya mere, ole ndị bụ ndị mmụọ? Baịbụl zara anyị ajụjụ a ma kọwaara anyị onye anyị kwesịrị ịgwa okwu na ihe anyị ga-atụ anya ọ ga-eme mgbe anyị gwara ya okwu. Gụrụ gawa. Ihe Baịbụl kwuru nwere ike ịtụ gị n’anya.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 “Allah” abụghị aha kama ọ pụtara “Chineke.”