Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Dị Mgbe e Nwere Ogige Iden n’Ezie?

Ọ̀ Dị Mgbe e Nwere Ogige Iden n’Ezie?

Ọ̀ Dị Mgbe e Nwere Ogige Iden n’Ezie?

Ị̀ MAARA akụkọ Adam na Iv na akụkọ ogige Iden? Ọtụtụ ndị n’ụwa maara ya. Ọ́ gaghị adị mma ka ị gụọ ya n’onwe gị? Ị ga-ahụ ya na Jenesis 1:26–3:24. Lekwa ihe akụkọ ahụ na-ekwu:

Jehova Chineke * ji ájá kpụọ mmadụ, gụọ ya Adam ma tinye ya n’otu ogige nke dị n’ebe a na-akpọ Iden. Ọ bụ Chineke kụrụ ubi ahụ. Mmiri na-ede ya nke ọma, o nwere ọtụtụ osisi mara mma na-amị mkpụrụ. N’etiti ubi ahụ, e nwere ‘osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ.’ Chineke gwara ụmụ mmadụ ka ha ghara iri mkpụrụ osisi a, kwuo na ha ga-anwụ ma ha rie ya. Ka oge na-aga, Jehova weere otu n’ime ọgịrịga Adam meere ya onye inyeaka, bụ́ nwaanyị a kpọrọ Iv. Chineke nyere ha ọrụ ilekọta ubi ahụ ma gwa ha ka ha mụọ ọmụmụ ma jupụta ụwa.

Mgbe Iv nọ naanị ya, agwọ gwara ya okwu, nwaa ya ka o rie mkpụrụ osisi ahụ a sịrị ha erila, kwuo na Chineke ghaara ha ụgha, nakwa na o nwere ihe ọma ọ na-ezoro ha, bụ́ nke ga-eme ka ha dị ka Chineke. O nwetara Iv, Iv erie mkpụrụ osisi ahụ a sịrị ha erila. Adam mechara soro nwunye ya nupụrụ Chineke isi. Jehova mara Adam, Iv na agwọ ahụ ikpe. Mgbe a chụpụchara ụmụ mmadụ n’ubi paradaịs ahụ, ndị mmụọ ozi nọchiri ọnụ ụzọ ya.

O nwere mgbe ọtụtụ ndị ọkà mmụta, ndị gụrụ oké akwụkwọ, na ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu na ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ Baịbụl bụ́ Jenesis bụ eziokwu, meekwa emee. N’oge ndị a, ọtụtụ ndị na-arụzi akụkọ ndị dị otú ahụ ụka. Ma, olee ihe mere ha jizi enwe obi abụọ n’ihe Jenesis kọrọ banyere Adam, Iv na ogige Iden? Ka anyị tụlee ajụjụ anọ a na-ajụkarị.

1. È nwere ebe bụ́ ogige Iden n’ezie?

Gịnị mere ha ji enwe obi abụọ n’okwu a? O nwere ike ịbụ na nkà ihe ọmụma so kpata ya. Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị ọkà mmụta okpukpe kwuru na o nwere ebe ogige Chineke ahụ ka dị. Ma, ndị ọkà ihe ọmụma, ndị dị ka Plato na Aristotle, bụ́ ndị Gris, megharịrị chọọchị anya. Ndị ọkà ihe ọmụma a kweere na o nweghị ihe zuru okè dị n’ụwa. Naanị n’eluigwe ka e nwere ihe zuru okè. N’ihi ya, ndị ọkà mmụta okpukpe chere na ọ ga-abụrịrị na Paradaịs mbụ ahụ dị nso n’eluigwe. * Ụfọdụ kwuru na ubi ahụ dị n’elu ugwu dị oké elu nke na-adịghị nso n’ụwa a rụrụ arụ; ndị ọzọ kwuru na ọ dị n’Ebe Ugwu Ụwa ma ọ bụ n’Ebe Ndịda Ụwa; ndị ọzọkwanụ kwuru na ọ dị n’ọnwa ma ọ bụ dịrị nso n’ọnwa. Ọ bụghị ihe ijuanya na ndị mmadụ weziiri ihe mere n’Iden ka akụkọ ifo. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta nke oge a kwuru na ebe ahụ a sịrị na Iden dị abụghị ebe ọ dị, na-ekwu na ọ dịtụghị mgbe e nwere ebe dị otú ahụ.

Ma, Baịbụl ekwughị ihe dị otú ahụ banyere ubi ahụ. Na Jenesis 2:8-14, e nwere ihe ụfọdụ a kapịrị ọnụ banyere ubi ahụ. Ọ dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ebe a kpọrọ Iden. Otu osimiri nke ghọrọ isi mmiri anọ na-ede ubi ahụ mmiri. E kwuru aha nke ọ bụla n’ime ha anọ, kwutụkwa ihe ụfọdụ banyere ebe ha na-asọga. Ọ dịla anya ndị ọkà mmụta nwewara mmasị ịmata ihe ndị ahụ e kwuru, nke mere ka ọtụtụ n’ime ha nyochaa ihe ndị ahụ Baịbụl kwuru iji mata ebe Iden oge ochie ahụ dị. Ma, mgbe ha mere nke a, ha enweghị otu olu n’ihe ha chọpụtara. Nke a ọ̀ pụtara na ihe Baịbụl kwuru banyere Iden, ubi ya, na osimiri ndị dị na ya bụ akụkọ ifo?

Chegodị echiche: Ihe ndị mere n’ubi Iden malitere ihe dị ka puku afọ isii gara aga. O doro anya na ọ bụ Mozis dere ha, ma eleghị anya, o si n’akụkọ ndị a kọọrọ ya ma ọ bụdị n’akwụkwọ ndị dịbu adị dee ha. N’agbanyeghị nke ahụ, Mozis dere ihe ndị ahụ mgbe ihe dị ka puku afọ abụọ na narị ise ha mechara gachara. Iden adịkwaghị adị n’oge ahụ. N’ihi ya, ọ̀ ga-abụ na ihe ndị e ji hụwa ebe ahụ ama, dị ka osimiri, agbanweela n’ime ọtụtụ narị afọ gaferelanụ? Ala na-echigharị echigharị mgbe niile. Ebe o nwere ike ịbụ na Iden dịbu bụ ebe ala ọma jijiji na-emekarị—bụ́ ebe ihe dị ka otu ala ọma jijiji n’ime ala ọma jijiji ise ọ bụla kacha njọ na-eme n’ụwa taa na-eme. N’ebe ndị dị otú ahụ, ọdịdị ala na-agbanwe mgbe niile. O nwekwara ike ịbụ na Iju Mmiri nke oge Noa gbanwere ọdịdị ala otú anyị na-agaghị amatali taa. *

Ma, lekwa ihe ole na ole anyị maara: Akwụkwọ Jenesis kwuru na ubi ahụ bụ ebe dịrị adị n’ezie. Osimiri abụọ n’ime osimiri anọ ahụ a kpọrọ aha n’akụkọ ahụ, ya bụ, Yufretis na Taịgris, ma ọ bụ Hidekel, ka na-asọ taa. Ụfọdụ n’ime ebe mmiri ndị ahụ si asọpụta dị nnọọ nso n’ibe ha. Akụkọ ahụ kwudịrị aha ala ndị osimiri ndị ahụ sọfere, kwuokwa akụ̀ ndị dị n’ime ala e ji mara ebe ahụ. Akụkọ a doro ndị Izrel, bụ́ ndị mbụ gụrụ ya, anya.

Ọ̀ bụ otú ahụ ka akụkọ ifo na-adị? Ka hà na-ahapụkarị ịkọ otú ihe ụfọdụ si mee kpọmkwem bụ́ ndị e nwere ike iji chọpụta ma hà bụ́ eziokwu ma ọ bụ ụgha? Otú e si amalite akụkọ ifo bụ: “E nwere otu mgbe, n’ala dị anya.” Ma, akụkọ mere eme na-ekwu kpọmkwem otú ihe si mee, dị ka akụkọ Iden mere.

2. Ànyị kwesịrị ikwere n’ezie na Chineke ji ájá kpụọ Adam ma jiri agịrịga Adam kpụọ Iv?

Ndị ọkà mmụta sayensị nke oge a ekwuola na ihe dị iche iche dị n’ala, dị ka ikuku hydrogen, ikuku oxygen, na carbon, dịchakwa n’ahụ́ mmadụ. Ma, olee otú e si jikọta ihe ndị ahụ mee mmadụ?

Ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu na ndụ maliteere onwe ya, na ọ malitere n’ụdị dị mfe ma jiri nwayọọ nwayọọ na-adịzi mgbagwoju anya ka ọtụtụ nde afọ na-agafe. Ma, okwu ahụ bụ́ “mfe” nwere ike iduhie mmadụ, n’ihi na ihe niile dị ndụ, ọbụna obere ihe ndị dị ndụ anya nkịtị na-anaghị ahụ bụ́ ndị nwere otu mkpụrụ ndụ, dị nnọọ mgbagwoju anya. E nweghị ihe na-egosi na ọ dịtụla mgbe ihe dị ndụ pụtaara onwe ya ma ọ bụ na ọ ga-emekata mee otú ahụ. Kama nke ahụ, ihe niile e kere eke nwere ihe na-egosi na ọ bụ onye nwere ọgụgụ isi ka nnọọ nke anyị kere ha. *Ndị Rom 1:20.

Ị̀ ga-anụ egwú dị ụtọ ma ọ bụ kirie ihe osise mara mma ma ọ bụ hụ ihe ndị nkà na ụzụ mepụtara ma ka na-esi ọnwụ na ihe ndị a pụtaara onwe ha? Mbanụ! Ma ihe ndị ahụ magburu onwe ha adịghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere otú ahụ́ mmadụ si dị mgbagwoju anya, maa mma, ma ọ bụ otú e si jiri nkà kee ya. Olee otú anyị ga-esi chewe na e nweghị Onye kere ya? E wezụga nke ahụ, akwụkwọ Jenesis kọwara na n’ime ihe niile dị ndụ n’ụwa, ọ bụ naanị ụmụ mmadụ ka e kere n’onyinyo Chineke. (Jenesis 1:26) Ọ dabara nnọọ adaba na ọ bụ naanị ụmụ mmadụ yiri Chineke n’ịchọ imepụta ihe, mgbe ụfọdụ na-echepụta egwú ndị dị ụtọ, na-ese ihe, na-ejikwa nkà na ụzụ emepụta ihe dị iche iche. Ò kwesịrị iju anyị anya na Chineke ka anyị mara otú e si emepụta ihe?

A bịa n’iji ọgịrịga nwoke kee nwaanyị, olee ihe siri ike na ya? * Chineke gaara esi n’ụzọ ọzọ kee nwaanyị ma ọ chọọ, ma otú ahụ o si kee ya nwere ihe dị mkpa ọ pụtara. Ọ chọrọ ka nwoke na nwaanyị ahụ lụọ ma dịrị n’otu, ka à ga-asị na ha bụ “otu anụ ahụ́.” (Jenesis 2:24) Otú nwoke na nwaanyị si enyerịtara ibe ha aka, ghọọ ndị dị n’otu ma na-elekọta ibe ha, ọ́ naghị egosi nnọọ na ọ bụ Onye Okike maara ihe ma hụ ha n’anya kere ha?

E wezụga nke ahụ, ndị ọkà mmụta nke oge a, bụ́ ndị na-amụ banyere ihe mmadụ bu pụta ụwa, kwetara na ọ dị ka mmadụ niile hà si n’otu nwoke na nwaanyị. N’ihi ya, ihe Jenesis kọrọ esighị ike nkweta?

3. Osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ na osisi nke ndụ yiri akụkọ ifo.

N’ezie, akwụkwọ Jenesis ekwughị na osisi ndị a nwere ikike pụrụ iche. Kama nke ahụ, ha bụ osisi nkịtị ndị Jehova ji mere ihe nnọchianya.

Ọ̀ bụ na ụmụ mmadụ anaghị eme ihe yiri nke ahụ mgbe ụfọdụ? Dị ka ihe atụ, ọkàikpe nwere ike ịdọ mmadụ aka ná ntị ka ọ ghara ileda ụlọikpe ya anya. Ọ bụghị oche ndị dị n’ụlọikpe ahụ, ọkụ ndị e tinyere na ya, na ahụ́ ájá ya ka ọkàikpe ahụ na-ekwu ka a ghara ileda anya kama ọ bụ ndị na-ekpe ikpe n’ụlọikpe ahụ, bụ́ ndị ụlọikpe ahụ nọchiri anya ha. Ndị eze dị iche iche na-elekwa mkpara na okpueze anya dị ka ihe ndị na-anọchi anya ike ọchịchị ha.

Oleezi ihe osisi ndị ahụ nọchiri anya ha? E nweela ọtụtụ ihe ndị dị mgbagwoju anya ndị mmadụ kwurula. Ọ bụ ezie na ezigbo azịza ya dị mfe, ma o nwere ihe dị mkpa ọ pụtara. Osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ nọchiri anya ikike ọ bụ naanị Chineke nwe, ya bụ, ikike ikpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe bụ́ ihe ọjọọ. (Jeremaya 10:23) Ka a sịkwa ihe mere ịghọrọ mkpụrụ osisi ahụ ji bụrụ ohi! N’aka nke ọzọ, osisi nke ndụ ahụ nọchiri anya onyinye nke naanị Chineke nwere ike inye mmadụ, ya bụ, ndụ ebighị ebi.—Ndị Rom 6:23.

4. Ikwu na agwọ kwuru okwu yiri ihe na-eme n’akụkọ ifo.

N’ezie, akụkọ agwọ a a kọrọ na Jenesis nwere ike ịdị mgbagwoju anya, karịsịa ma ọ bụrụ na anyị echebaraghị ebe ndị ọzọ na Baịbụl echiche. Ma, Akwụkwọ Nsọ ji nwayọọ nwayọọ mee ka ihe a dị mgbagwoju anya doo anya.

Olee onye ma ọ bụ ihe mere ka o yie ka agwọ ahụ ọ̀ na-ekwu okwu? Ndị Izrel oge ochie maara ihe ndị ọzọ mere ka a ghọtakwuo ihe agwọ ahụ mere. Dị ka ihe atụ, ha maara na ọ bụ ezie na anụmanụ anaghị ekwu okwu, mmụọ nwere ike ime ka o yie ka anụmanụ ọ̀ na-ekwu okwu. Ọ bụ Mozis dekwara akụkọ Belam; Chineke zigara otu mmụọ ozi ka o mee ka ịnyịnya ibu Belam kwuo okwu ka mmadụ.—Ọnụ Ọgụgụ 22:26-31; 2 Pita 2:15, 16.

Ndị ọzọ bụ́ mmụọ, tinyere ndị nke bụ́ ndị iro Chineke, hà nwere ike ịrụ ọrụ ebube? Mozis hụrụ ka ndị dibịa anwansi ndị Ijipt rụghachiri ụfọdụ ọrụ ebube ndị o ji ike Chineke rụọ, dị ka ime ka mkpara yie ka ọ̀ ghọrọ agwọ. O doro anya na ọ bụ ndị iro Chineke bụ́ mmụọ nyere ikike e ji rụọ ọrụ ebube ndị ahụ.—Ọpụpụ 7:8-12.

O doro anya na ọ bụkwa Mozis si n’ike mmụọ nsọ dee akwụkwọ Job. Akwụkwọ ahụ kwuru ọtụtụ ihe banyere onye iro kachanụ nke Chineke, bụ́ Setan, onye mara Jehova aka na ndị ohu ya niile agaghị ekwesị ntụkwasị obi. (Job 1:6-11; 2:4, 5) Ọ̀ ga-abụzi na ndị Izrel oge ochie chere na Setan ji agwọ ahụ rụọ ọrụ n’Iden, mee ka o yie ka ọ̀ na-ekwu okwu, duhie Iv ma mee ka ọ ghara ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ? O yiri ka hà chere otú ahụ.

Ọ̀ bụ Setan ji agwọ ahụ rụọ ọrụ? Jizọs mechara kwuo na Setan bụ “onye ụgha, bụrụkwa nna ya.” (Jọn 8:44) “Nna ụgha” ga-abụ onye ghara ụgha mbụ a ghatụrụla, ọ́ bụghị ya? Ọ bụ n’okwu agwọ ahụ gwara Iv ka e nwere ụgha mbụ a ghatụrụla. Agwọ ahụ kwuru ihe megidere ịdọ aka ná ntị Chineke, nke bụ́ na onye riri mkpụrụ osisi ahụ Chineke sịrị erila ga-anwụ, ma kwuo, sị: “Unu agaghị anwụ ma ọlị.” (Jenesis 3:4) O doro anya na Jizọs maara na Setan ji agwọ ahụ rụọ ọrụ. Mkpughe Jizọs nyere Jọn onyeozi mere ka nke ahụ doo anya, n’ihi na ọ kpọrọ Setan “agwọ mbụ ahụ.”—Mkpughe 1:1; 12:9.

Ọ̀ bụ nnọọ ihe siri ike ikweta na mmụọ dị ike nwere ike iji agwọ rụọ ọrụ, mee ka o yie ka ọ̀ na-ekwu okwu? Ụmụ mmadụ, bụ́dị ndị na-esirughị nnọọ ike ka ndị bụ́ mmụọ, nwere ike ime ka o yie ka ihe ndị na-adịghị ndụ hà na-ekwu okwu ma mee ka ihe ndị na-enweghị ike ime eme yie ka hà mere eme.

Ihe Akaebe Kacha Gbaa Ọkpụrụkpụ

Ị́ hụghị na ịrụ akụkọ Jenesis ụka enweghị isi? N’aka nke ọzọ, e nwere ọtụtụ ihe ndị na-egosi na akụkọ ndị dị na ya mere eme.

Dị ka ihe atụ, a kpọrọ Jizọs Kraịst “onye àmà nke kwesịrị ntụkwasị obi.” (Mkpughe 3:14) Ebe ọ bụ na o zuru okè, o nweghị mgbe ọ ghara ụgha ma ọ bụ kwuo ihe na-abụghị eziokwu. E wezụga nke ahụ, ọ kụziri na ya dịrị ndụ ogologo oge tupu ya aghọọ mmadụ—n’ezie, ya na Nna ya, bụ́ Jehova, bi “mgbe ụwa na-adịbeghị.” (Jọn 17:5) N’ihi ya, ọ dị ndụ mgbe ndụ malitere n’ụwa. Olee akaebe onye àmà a kacha bụrụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi gbara?

Otú Jizọs si kwuo okwu banyere Adam na Iv gosiri na ha bụ ndị dịrị ndụ. O kwuru banyere alụmdi na nwunye ha mgbe ọ na-ekwu banyere ndokwa Jehova mere ka nwoke na-alụ naanị otu nwaanyị. (Matiu 19:3-6) Ọ bụrụ na ọ dịghị mgbe ha dịrị ndụ, ya abụrụkwa na ubi ahụ ha biri na ya bụ ubi akụkọ ifo, ọ pụtara na e duhiere Jizọs ma ọ bụkwanụ na ọ bụ onye ụgha. Ọ dịghị ha abụọ nke bụ́ eziokwu! Jizọs dịrị ndụ n’eluigwe, hụ mgbe ọdachi ahụ mere n’ubi ahụ mere. Ò nwere ihe akaebe ga-akarị nke ahụ?

N’ezie, ịrụ akụkọ Jenesis ụka bụ ime ka a ghara inwe okwukwe na Jizọs. Ekweghịkwa n’akụkọ ahụ na-emekwa ka o siere ndị mmadụ ike ịghọta ihe ndị kacha gbaa ọkpụrụkpụ Baịbụl kụziri na nkwa ya ndị na-emesi nnọọ obi ike. Ka anyị hụ ihe mere o ji dị otú ahụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Jehova bụ aha a kpọrọ Chineke na Baịbụl.

^ par. 7 Echiche ahụ esighị n’Akwụkwọ Nsọ. Baịbụl na-akụzi na ihe niile Chineke kere zuru okè; ezughị okè si ebe ọzọ. (Diuterọnọmi 32:4, 5) Mgbe Jehova kechara ụwa, o kwuru na ihe niile o kere “dị nnọọ mma.”—Jenesis 1:31.

^ par. 9 Ọ ga-abụ na Iju Mmiri ahụ, bụ́ nke Chineke wetara, kpochapụrụ ihe niile e ji mara ubi Iden ahụ. Ezikiel 31:18 gosiri na na narị afọ nke asaa T.O.A. (Tupu Oge Anyị), “osisi ndị dị n’Iden” adịlarị anya ha na-adịkwaghị. N’ihi ya, ndị niile mechara na-achọ ubi Iden amaghị ihe ha na-eme.

^ par. 14 Gụọ broshuọ bụ́ The Origin of Life—Five Questions Worth Asking, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 16 Ọ dị mma ịmara na ndị ọkà mmụta ọgwụ na ahụ́ ike nke oge a achọpụtala na ọgịrịga na-alachi n’ụzọ pụrụ iche. Ọ dị iche n’ọkpụkpụ ndị ọzọ n’ihi na o nwere ike iruchi ma ọ bụrụ na ihe ndị jikọtara ya n’ahụ́ ka dị.