Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jiri Ihe Ndị Dị Nsọ Kpọrọ Ihe!

Jiri Ihe Ndị Dị Nsọ Kpọrọ Ihe!

MAka Ndị Na-eto Eto

Jiri Ihe Ndị Dị Nsọ Kpọrọ Ihe!

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ amaokwu ndị a, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere. Jiri uche gị kirie ebe ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.

Ndị bụ́ isi n’akụkọ a: Aịzik, Ribeka, Jekọb, na Isọ

Nchịkọta: Isọ resịrị Jekọb, bụ́ ejima ya, ọnọdụ ya dị ka diọkpara.

1 CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ JENESIS 25:20-34.

Olee àgwà ndị Isọ na Jekọb kpara mgbe ha ka nọdị n’afọ nne ha?

․․․․․

Olee otú i chere Jekọb na Isọ dị mgbe ha bụ ụmụ okorobịa?

․․․․․

Olee otú i chere obi dị Jekọb na Isọ mgbe ha na-ekwurịta ihe ahụ dị n’amaokwu nke 30 ruo nke 33?

․․․․․

LEBAKWUO YA ANYA.

Jiri ihe ndị e ji eme nchọnchọ i nwere chọpụta ihe ụfọdụ banyere ihe ndị ruuru diọkpara. Olee ihe ndị mere ihe ndị ahụ ji dị mkpa? Olee ihe Isọ ire ihe ruuru ya dị ka diọkpara n’ihi otu efere nri pụtara?

․․․․․

2 CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ JENESIS 27:1-10, 30-38.

Olee otú i chere obi dị Isọ site n’ụda olu ya mgbe ọ ghọtara na nwanne ya anarala ngọzi diọkpara?

․․․․․

LEBAKWUO YA ANYA.

Ribeka na Jekọb hà mejọrọ ihe mgbe ha mere ka Jekọb nweta ngọzi ahụ a gaara enye nwanne ya nwoke? Gịnị mere i ji zaa otú ahụ? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ Jenesis 25:23, 33.)

․․․․․

3 MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE  . . .

Ihe ndị na-esi n’ịchọ igbo agụụ ngwa ngwa apụta.

․․․․․

ỤZỌ NDỊ ỌZỌ Ị GA-ESI MEE IHE Ị MỤTARA.

Olee ihe ndị dị nsọ e nyefere gị?

․․․․․

Olee ụzọ ndị i nwere ike isi gosi na i ji ihe ndị dị nsọ kpọrọ ihe?

․․․․․

4 OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤ MAKA GỊNỊ?

․․․․․

Ọ bụrụ na i nweghị baịbụl, gwa Ndịàmà Jehova ka ha nye gị otu, ma ọ bụ gị amatakwuo banyere ya na www.watchtower.org na www.pr418.com