Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘O Mere Ka Obi Jehova Jụrụ’

‘O Mere Ka Obi Jehova Jụrụ’

Bịaruo Chineke Nso

‘O Mere Ka Obi Jehova Jụrụ’

“OTU nwoke nke kwụsịtụrụ ibi ndụ otú Chineke chọrọ, bụ́ nke a kụziiri ya mgbe ọ dị obere, kwuru, sị: “Onwe m gbụrụ m.” Mgbe ọ malitere ịgbanwe ndụ ya, ụjọ nọ na-atụ ya na Chineke agaghị emekata gbaghara ya. Ma, ihe Baịbụl kọrọ banyere Manase, nke e dere na 2 Ihe E Mere 33:1-17, mere ka onye mmehie a chegharịrị echegharị nwee olileanya. Ọ bụrụ na ọ dịtụla mgbe mmehie i mere n’oge gara aga mere ka onwe gị gbụ gị, ihe nlereanya Manase nwekwara ike ịkasi gị obi.

Ọ bụ nne na nna na-atụ egwu Chineke zụlitere Manase. Nna ya, bụ́ Hezekaya, bụ otu n’ime ndị eze kacha mma chịrị Juda. A mụrụ Manase ihe dị ka afọ atọ Chineke rụchara ọrụ ebube iji gbatịa afọ ndụ nna ya. (2 Ndị Eze 20:1-11) O doro anya na Hezekaya weere nwa ahụ dị ka onyinye Chineke ji obi ebere nye ya ma gbalịa ịkụziri ya ka ọ hụ ofufe dị ọcha n’anya. Ma, ọ bụghị mgbe niile ka ụmụaka ndị nne na nna ha na-atụ egwu Chineke na-eso nzọụkwụ ndị mụrụ ha. Otú ahụ ka ọ dị Manase.

Manase akarịghị afọ iri na abụọ mgbe nna ya nwụrụ. Ọ dị mwute na Manase ‘mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.’ (Amaokwu nke 1, 2) Ọ̀ ga-abụ ndị ndụmọdụ na-ejighị ezi ofufe kpọrọ ihe megharịrị eze a na-eto eto anya? Baịbụl ekwughị. Ma ihe ọ gwara anyị bụ na Manase malitere nnọọ ife arụsị na ime omume obi ọjọọ. O wuuru chi ụgha ebe ịchụàjà, chụọrọ ha ụmụ ya n’àjà, mee mgbaasị, ma tinye arụsị a wụrụ awụ n’ụlọ nsọ Jehova dị na Jeruselem. Manase onye isi ike jụrụ ndụmọdụ Jehova nyere ya ọtụtụ ugboro, bụ́ Chineke nke rụrụ ọrụ ebube mere e ji mụọ ya.—Amaokwu nke 3-10.

N’ikpeazụ, Jehova kwere ka e kee Manase agbụ ma kpụga ya Babịlọn. N’oge ahụ Manase bi n’ala ọzọ, o nwere ohere ichebara ndụ ya echiche. Ọ̀ ga-abụ na ọ chọpụtara na arụsị ya ndị na-adịghị ndụ echebelighị ya? Ò chetara ihe ndị nna ya na-atụ egwu Chineke kụziiri ya mgbe ọ dị obere? Nke ọ bụla ọ bụ, Manase gbanwere obi ya. Akụkọ ahụ kwuru, sị: “O mere ka obi Jehova bụ́ Chineke ya jụrụ . . . O wee na-ekpeku ya ekpere.” (Amaokwu nke 12, 13) Ma, Chineke ò nwere ike ịgbaghara onye mere mmehie dị oké njọ otú ahụ?

Nchegharị Manase ji obi ya niile chegharịa metụrụ Jehova n’obi. Chineke nụrụ arịrịọ ọ rịọrọ ya ka o meere ya ebere “wee mee ka ọ lọghachi Jeruselem, n’ọchịchị ya.” (Amaokwu nke 13) Iji gosi na ya echegharịala, Manase meziri ihe o nwere ike ime iji mezie ihe ndị o mebiri, wepụsịa arụsị n’alaeze ya ma gbaa ndị obodo ya ume “ka ha fee Jehova.”—Amaokwu nke 15-17.

Ọ bụrụ na i chere na Chineke agaghị agbaghaliri gị mmehie ndị i mere n’oge gara aga, ka ihe atụ Manase kasie gị obi. Akụkọ a so n’Okwu Chineke e si n’ike mmụọ nsọ dee. (Ndị Rom 15:4) O doro anya na Jehova chọrọ ka anyị mara na ya ‘dị njikere ịgbaghara mmehie.’ (Abụ Ọma 86:5) Ihe ga-ekpebi ma à ga-agbaghara mmadụ abụghị mmehie onye ahụ mere kama ọ bụ otú obi ya dị. Onye mmehie nke ji nnọọ mwute kpee ekpere, hapụ ụzọ ọjọọ ya, ma gbasie mbọ ike ime ihe ziri ezi nwere ike ‘ime ka obi Jehova jụrụ,’ dị ka Manase mere.—Aịzaya 1:18; 55:6, 7.

Ebe Anyị na-atụ aro Ka Ị gụọ na Baịbụl na Jenụwarị:

2 Ihe E Mere 29Ezra 10