Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

OLEE otú otu nwaada na-ere mmanya n’ụlọ oriri na nkwari bụ́ onye na-akpọ iyi, na-aṅụ oké mmanya ma na-aṅụ ọgwụ ọjọọ si gbanwee ndụ ya? Olee ihe mere onye bụ́bu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke kpọrọ okpukpe asị ji ghọọ onye na-ekwusa ozi ọma? Olee nsogbu ndị otu onye uwe ojii Rọshịa nke na-akụzi otú e si alụ ọgụ meriri iji ghọọ Onyeàmà Jehova? Gụọ ihe ha kwuru.

“Mụ na nne m adịghachila ná mma.”—NATALIE HAM

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1965

ABỤ M ONYE: ỌSTRELIA

NDỤ M BIRI: ANA M AṄỤ ỌGWỤ ỌJỌỌ

NDỤ M BIRI NA MBỤ: M toro n’obere obodo a na-akụ azụ̀ na ya, bụ́ Robe, nke dị n’Ebe Ndịda Ọstrelia. N’obodo ndị dị otú ahụ, ebe ndị mmadụ na-aga atụrụ ndụ bụ n’ụlọ oriri na nkwari. Ndị nne na nna na-anọ ogologo oge n’ụlọ oriri ndị ahụ, n’ihi ya, ụmụ ha na-amụta ịṅụbiga mmanya ókè, ikwu okwu rụrụ arụ, na ise sịga ka ha na-eto.

Mgbe m dị afọ iri na abụọ, amalitela m ise sịga, na-akpọ nnọọ ndị mmadụ iyi, mụ na nne m ana-esekwa okwu mgbe niile. Mgbe m dị afọ iri na ise, nne m na nna m kewara, m hapụkwara ụlọ ka otu afọ na ọkara gachara. M ṅụrụ ọgwụ ọjọọ ruo oge ụfọdụ, na-aṅụbiga mmanya ókè, na-ebikwa ndụ rụrụ arụ. Obi anaghị adị m mma, anọkwa m ná mgbagwoju anya. Ma, ebe ọ bụ na m ji afọ ise mụọ ịgba karat na otú ụmụ nwaanyị si echebe onwe ha, echere m na m ga-elekọtali onwe m. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe m nọdụrụ ọdụ chebara ndụ m echiche, obi na-ajọ m nnọọ njọ, m na-arịọkwa Chineke n’ekpere ka o nyere m aka. M na-agwa ya, sị: “Kama asịkwala m gaa chọọchị.”

Ka e mechara, otu enyi m ji okpukpe kpọrọ ihe, nke na-enweghịkwanụ chọọchị ọ na-aga nyere m Baịbụl. Ọ na-esekwa igbo otú ndị enyi anyị ndị ọzọ na-ese. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-ekwu na ya ji obi ya niile kwere na Chineke, meekwa ka m kweta na e kwesịrị ime m baptizim. Ọ kpọ m gaa n’otu ọdọ mmiri dị anyị nso ma mee m baptizim. Site mgbe ahụ gawa, echere m na mụ na Chineke dị n’ezigbo mma. Ma, ọ dịghị mgbe m nwere ohere ịgụ Baịbụl.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: N’afọ 1988, Ndịàmà abụọ kụrụ aka n’ọnụ ụzọ m. Otu n’ime ha jụrụ m, sị, “Ị̀ maara aha Chineke?” Onyeàmà ahụ gụrụ Abụ Ọma 83:18 na Baịbụl ya, bụ́ nke kwuru, sị: “Ka ndị mmadụ wee mara na gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.” Ọ tụrụ m n’anya! Mgbe ha lawara, m ji ụgbọala gbaa kilomita iri ise na isii ruo ebe a na-ere akwụkwọ Ndị Kraịst ka m nwee ike ịgụ nsụgharị Baịbụl ndị ọzọ ma chọzie aha ahụ n’akwụkwọ ọkọwa okwu. Mgbe o doro m anya na aha Chineke bụ Jehova, anọ m na-eche ma è nwere ihe ọzọ m na-amaghị.

Nne m gwara m na Ndịàmà Jehova anaghị eme ihe otú ibe ha na-eme. Obere ihe m maara banyere ha mere ka m chee na ha na-eme ihe ka ndị mgbe ochie nakwa na ha amaghị otú e si ekpori ndụ. M kwuru n’obi m na m ga-eme ka à ga-asị na mụ anọghị n’ụlọ ma ha bịa. Ma, m gbanwere obi m mgbe ha bịara. M kpọbatara ha n’ụlọ, anyị amalite ịmụ Baịbụl ozugbo.

Mgbe ọ bụla anyị mụchara ihe, m na-akọrọ Craig, bụ́ enyi m nwoke, ihe m mụtara. O mechara wee iwe nke na ọ naara m akwụkwọ ahụ anyị ji amụ ihe ma malite ịgụ ya. N’ime izu atọ, o kwubiri na ya achọtala eziokwu banyere Chineke. Mụ na Craig mechara kwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ na ịṅụbiga mmanya ókè, m kwụsịkwara ire mmanya n’ụlọ oriri na nkwari. Anyị kpebiri ịlụ iji mee ka ndụ anyị kwekọọ n’ihe Baịbụl kwuru.

URU NDỊ M RITERELA: Ọ fọrọ obere ka mụ na Craig kewaa tupu anyị na Ndịàmà Jehova amalite ịmụ Baịbụl. Taa, Craig bụ ezigbo di, anyị amụtakwala ọmarịcha ụmụ abụọ. Anyị nwekwara ezigbo ndị enyi anyị na ha kweere n’otu ihe.

Ná mmalite, iwe were nne m mgbe ọ nụrụ na mụ esowela Ndịàmà Jehova. Ma, ihe kpatara nchegbu ya bụ na ọ ghọtachaghị ndị Ndịàmà Jehova bụ. Ugbu a, mụ na nne m adịghachila ná mma. Ọ nazighị adị m ka ndụ m abaghị uru. Kama nke ahụ, ndụ m enweela isi, m chekwara na a na-egboro m mkpa ime mmụọ m.—Matiu 5:3.

“Amụtara m ọtụtụ ihe dị ịtụnanya na Baịbụl.”—ISAKALA PAENIU

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1939

ABỤ M ONYE: TUVALU

NDỤ M BIRI: ABỤ M ONYE NDỌRỌ NDỌRỌ ỌCHỊCHỊ

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Amụrụ m na Nukulaelae, bụ́ otu agwaetiti Pasifik mara mma nke dị na Tuvalu ugbu a. Ọ bụ ndị pastọ a zụrụ n’ụlọ akwụkwọ ndị pastọ dị na Samoa na-ekwu ihe na-eme n’agwaetiti ahụ. Ọ bụ ndị bi n’agwaetiti ahụ na-enye ndị pastọ na ndị ezinụlọ ha nri kwa ụbọchị, na-enye ha ụlọ, na-enyekwa ha ihe ndị kacha mma ha nwere. Ọ bụrụgodị na ndị bi n’agwaetiti ahụ enweghị nri ga-ezuru ezinụlọ nke ha, ha ga-enyerịrị ndị pastọ nri.

Ọ bụ pastọ bi n’agwaetiti anyị na-elekọta ụlọ akwụkwọ dị n’obodo anyị ma na-akụzi banyere okpukpe, mgbakọ na mwepụ, na nkà mmụta ihe ndị dị n’ụwa. M na-echeta oge m hụrụ ka pastọ ahụ kụrụ ụmụ akwụkwọ ihe nke na ahụ́ ha niile bụ ọbara ọbara. Ma, o nweghị onye nwara anwa kwuo pịm, ọbụna ndị mụrụ ụmụaka ahụ. A na-efe pastọ ahụ ka Chi.

Mgbe m dị afọ iri, m hapụrụ ụlọ anyị gawa akwụkwọ na naanị otu ụlọ akwụkwọ gọọmentị dị n’ógbè ahụ, bụ́ nke dị n’agwaetiti ọzọ. Mgbe m gụchara, m rụwara ọrụ Bekee. N’oge ahụ, agwaetiti ndị ahụ so n’ebe mba Briten na-achị nke a na-akpọ Agwaetiti Gilbert na Ellice. M rụrụ ọrụ na ngalaba dị iche iche tupu mụ aghọọ onye nchịkọta akụkọ nke akwụkwọ akụkọ gọọmenti na-ebipụta kwa izu. Ihe nọ na-aga nke ọma ruo mgbe m bipụtara otu akwụkwọ ozi nke otu onye na-agụ akwụkwọ akụkọ anyị dere nke o ji katọọ ego e mefuru iji kwadebe maka ọbịbịa Ọkpara Eze Ndị Ịngland. Onye dere akwụkwọ ozi ahụ ejighị ezigbo aha ya dee ya, onyeisi m jụkwara m ezigbo aha onye ahụ. Ekweghị m agwa ya, ọtụtụ ndị nụkwara banyere nghọtahie a anyị nwere.

Obere oge ihe a mechara, m kwụsịrị ọrụ Bekee ma banye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ bụ m meriri na Nukulaelae ná ntụliaka e mere, e mekwara m Minista Na-ahụ Maka Azụmahịa na Akụ̀ Ndị Dị n’Ime Ala. Mgbe e mechara, n’oge ndị bi n’agwaetiti Kiribati (nke bụ́bụ Gilbert) na agwaetiti Tuvalu (nke bụ́bụ Ellice) na-achọ inwere onwe ha n’aka Briten, gọvanọ anyị gwara m ka m bụrụ onyeisi n’ọchịchị Tuvalu. Ma, achọghị m ka ndị mmadụ were m dị ka onye aka ya dị n’ọchịchị ndị Briten. N’ihi ya, ekweghị m, n’agbanyeghị nke ahụ, m zọrọ ọkwá dị elu ná ntụliaka e mere n’obodo anyị. M dara. Mgbe nke ahụ mechara, mụ na nwunye m laghachiri n’agwaetiti anyị, anyị kpebikwara ibiwe ndụ otú e si ebi n’ime obodo.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: N’agwaetiti anyị, ụbọchị Sọnde bụ Ụbọchị Izu Ike, onye ọ bụla wekwaara ya dị ka ụbọchị dị nsọ ma e wezụga m. Ọ bụ ụbọchị m ji akwọgharị ụgbọ na mmiri ma na-egbu azụ̀. Achọghị m ka a mara m dị ka onye okpukpe. Nna m gwara m otú omume m si ewute ya na ndị ọzọ. Ma, m kpebisiri ike na ọ bụghị chọọchị ga-atụrụ m ihe m ga-eme.

N’otu n’ime oge ndị m gara n’agwaetiti Funafuti, bụ́ isi obodo Tuvalu, nwanne m nwoke nke m tọrọ gwara m ka m soro ya gaa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Otu Onyeàmà na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ mechara nye m ọtụtụ magazin Ụlọ Nche na Teta! ka m gụọ. O nyekwara m otu akwụkwọ nke gbara ozizi ọtụtụ chọọchị sị na ha bụ Ndị Kraịst n’anwụ, bụ́ ndị malitere n’aka ndị na-ekpere arụsị. M gụrụ akwụkwọ ahụ ọtụtụ ugboro. M mụtara ọtụtụ ihe dị ịtụnanya na Baịbụl, mụtakwa na e nyeghị Ndị Kraịst iwu idebe Ụbọchị Izu Ike kwa izu. * M gwara nwunye m ihe ndị ahụ m mụtara, ya akwụsịkwa ịga chọọchị ozugbo.

Ma, m fooro ntutu taa na o nweghị ihe ga-ejikọ mụ na okpukpe. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ abụọ gafere, ma echefughị m ihe ndị m mụtara. M mechara degara onye ahụ na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ nọ na Funafuti akwụkwọ, gwa ya na m dịla njikere ịgbanwe obi m. Ọ bara ụgbọ mmiri ọzọ na-abịa n’agwaetiti anyị ma bịa inyere m aka ịmụtakwu Baịbụl. Nna m were iwe ọkụ mgbe ọ chọpụtara na m chọrọ ịghọ Onyeàmà Jehova. Ma, m gwara ya na Ndịàmà akụzierela m ọtụtụ ihe na Baịbụl nke na m kpebiela ịghọ Onyeàmà.

URU NDỊ M RITERELA: N’afọ 1986, e mere m baptizim, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova, e mekwara nwunye m baptizim n’afọ sochiri ya. Ụmụ anyị nwaanyị abụọ mụtakwara ihe Baịbụl na-akụzi ma kpebie ịghọ Ndịàmà Jehova.

Obi dị m ụtọ ugbu a na mụ esonyerela okpukpe nke na-enweghị òtù ndị ụkọchukwu, otú ahụ Ndị Kraịst narị afọ mbụ na-enweghị. (Matiu 23:8-12) Ha na-ejikwa umeala n’obi eso ihe nlereanya Jizọs ma na-akọrọ ndị ọzọ banyere ọchịchị Alaeze Chineke. (Matiu 4:17) M na-ekele Jehova Chineke maka ikwe ka m mụta eziokwu banyere ya na ndị ya!

“Ndịàmà amanyeghị m ikwere ihe ha na-akụzi.”—ALEXANDER SOSKOV

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1971

ABỤ M ONYE: RỌSHỊA

NDỤ M BIRI: ANA M AKỤZI OTÚ E SI ALỤ ỌGỤ

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Amụrụ m na Mọsko, nke bụ́ isi obodo Sọviet Yuniọn n’oge ahụ. Ezinụlọ anyị bi n’otu nnukwu ụlọ ọtụtụ ndị bi, ọtụtụ ndị agbata obi anyị na-arụkwa ọrụ n’otu ụlọ ọrụ. Echetara m mgbe ha na-eme mkpesa na m dị nnọọ aghara ma kwuo na m ga-anwụchu ọnwụ ma ọ bụ gaa mkpọrọ. N’ezie, mgbe m dị afọ iri, aha m abaala n’akwụkwọ ndị uwe ojii.

Mgbe m ruru afọ iri na asatọ, a manyere m ịbanye ọrụ soja, m ghọkwara onye agha na-eche ókè mba anyị nche. Mgbe afọ abụọ gasịrị, m lọghachiri ụlọ ma rụọ ọrụ n’otu ụlọ ọrụ na-emepụta ihe, ma ọrụ ahụ gbụrụ m. N’ihi ya, abanyere m n’òtù ndị uwe ojii Mọsko na-akwụsị ọgba aghara, na-akụzikwa otú e si alụ ọgụ aka. M na-enye aka ijide ndị omekome na Mọsko ma na-aga n’ebe dị iche iche ọgba aghara dị ná mba anyị. Ihe na-adị m n’obi mgbe niile bụ tigbuo zọgbuo. Mgbe m lọtara, mụ na nwunye m anaghị ehi otu ebe mgbe ụfọdụ—m na-atụ ụjọ na m ga-emerụ ya ahụ́ mgbe m na-ehi ụra.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Mgbe Ndịàmà Jehova malitere ịkụziri m Baịbụl, m chọpụtara na ndụ ime ihe ike m na-ebi ekwekọghị n’ihe Baịbụl kwuru. M chọpụtakwara na m kwesịrị ịkwụsị ise sịga ma selata aka ná mmanya na-aba n’anya m na-aṅụ. Ma, m chere na agaghị m agbanweli ọrụ m, ebe m na-enweghị aka ọrụ ọzọ m ga-eji nweta ọrụ m ga-eji na-akpa afọ ezinụlọ m. M chekwara na agaghị m ekwusali ozi ọma otú Ndịàmà na-eme.

O mechara doo m anya na ihe e dere na Baịbụl bụ eziokwu. Ihe e dere n’Ezikiel 18:21, 22, kasikwara m obi. Ebe ahụ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ajọ omume ahapụ mmehie niile o mere . . . , a gaghị echeta iwu niile o mebiri iji mee ya ihe.”

Ọ masịrị m na Ndịàmà amanyeghị m ikwere ihe ha na-akụzi kama ha nyeere m aka ichebara ihe m na-amụ echiche. M weere magazin ha dị iri anọ ma ọ bụ karịa ma gụchaa ha n’ime izu atọ. Ihe m mụtara mere ka o doo m anya na achọtala m ezi okpukpe.

URU NDỊ M RITERELA: Tupu mụ amalite ịmụ Baịbụl, ọ fọrọ ntakịrị ka mụ na nwunye m gbaa alụkwaghịm. Ugbu a alụmdi na nwunye anyị akala mma. Nwunye m malitere ịmụ Baịbụl mgbe ahụ m malitere, anyị kpebikwara ifekọ Jehova ọnụ. Ezinụlọ m enwekwuola obi ụtọ ugbu a. M nwetakwara ọrụ na-emegideghị ụkpụrụ Baịbụl.

Mgbe m malitere ịga ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ, ahụ́ na-eme m tigbuo zọgbuo, bụ́ otú ọ na-adị m mgbe anyị na-achọ ịga ijide ndị ọjọọ. Obi siri m ike ugbu a na m ga-ejideli onwe m, ya bụrụgodị na mmadụ anwaa ịkpasu m iwe. Kemgbe ahụ, amụtala m inwere ndị mmadụ ndidi. Ọ na-ewute m na m ji ọtụtụ afọ ná ndụ m mee ihe na-abaghị uru, ma echere m ugbu a na ndụ m bara ezigbo uru. Ọ na-atọ m ụtọ iji ike m niile na-ejere Jehova Chineke ozi ma na-enyere ndị ọzọ aka.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 24 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nke a, gụọ isiokwu bụ́ “Ì Kwesịrị Idebe Ụbọchị Izu Ike Kwa Izu?” nke gbara n’Ụlọ Nche, Febụwarị 1, 2010, peeji nke 11-15.