Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Chineke M, Biko, Cheta M, Imere M Ihe Ọma”

“Chineke M, Biko, Cheta M, Imere M Ihe Ọma”

Bịaruo Chineke Nso

“Chineke M, Biko, Cheta M, Imere M Ihe Ọma”

OTU nwaanyị bụ́ Onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi nke onwe ya gbụrụ kwuru, sị: “Echere m na Jehova, bụ́ onye maara m nke ọma, agaghị emekata hụ m n’anya ma ọ bụ ihe m amasị ya.” Ò nwetụla mgbe obi dị gị otú a, gị echee na i rughị eru Chineke ilebara gị anya, ma ya fọdụzie ihe gị ịmasị ya? Ya bụrụ otú ahụ, ihe e dere na Nehemaya 13:31 nwere ike ịgba gị ume.

Nehemaya, bụ́ gọvanọ ndị Juu na narị afọ nke ise T.O.A. (Tupu Oge Anyị), mere ike ya niile ime ka obi dị Chineke ụtọ. O butere ụzọ n’iwuzigharị mgbidi Jeruselem n’agbanyeghị mmegide ndị iro ha. O mere ka ndị Juu debe Iwu Chineke, lekọta ndị a na-emegbu emegbu, ma gbalịa iwusi okwukwe ndị Izrel ibe ya ike. Chineke ọ̀ hụrụ ihe ọma nwoke a kwesịrị ntụkwasị obi mere? Jehova ò nwere mmasị n’ebe Nehemaya nọ? Anyị nwere ike ịhụ azịza nke ajụjụ ndị a n’okwu ndị e ji pịachie akwụkwọ bú aha ya.

Nehemaya kpere ekpere, sị: “Chineke m, biko, cheta m, imere m ihe ọma.” * Nehemaya ọ̀ na-enwe obi abụọ ma Chineke ọ̀ hụrụ ọrụ ọma ya ma ọ bụ ma Chineke ọ̀ ga-echefu ya? Mba. O doro anya na Nehemaya maara ihe ndị mbụ so dee Baịbụl kwuru banyere mmasị Jehova nwere n’ebe ndị na-efe ya n’ikwesị ntụkwasị obi nọ nakwa n’ọrụ ọma ha. (Ọpụpụ 32:32, 33; Abụ Ọma 56:8) Gịnịzi ka ọ na-arịọ Chineke? Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru na okwu Hibru nke a sụgharịrị “cheta” na-egosi “ihe imetụ mmadụ n’obi na ihe onye ahụ mere mgbe ihe ahụ batara ya n’obi.” Ebe Nehemaya nwere okwukwe na ekpere na-arụ ọrụ, ọ na-arịọ Chineke ka ịhụnanya ya mee ka o cheta ya ma gọzie ya.—Nehemaya 2:4.

Jehova ọ̀ ga-aza ekpere Nehemaya ka o cheta ya? E nwere ike ikwu na ọ zaala ya. Na Jehova mere ka e dee ekpere Nehemaya n’ebe ọ ga-adịgide adịgide, ya bụ, mee ka o soro n’Akwụkwọ Nsọ e dere n’ike mmụọ nsọ, na-eme ka obi sie anyị ike na ịhụnanya ya mere ka o cheta Nehemaya. Ma, “Onye na-anụ ekpere” ga-emekwa ihe ndị ọzọ iji zaa ekpere Nehemaya ji obi ya niile kpee.—Abụ Ọma 65:2.

Chineke ka ga-akwụ Nehemaya ụgwọ maka ihe ọma niile o mere iji kwado ezi ofufe. (Ndị Hibru 11:6) N’ụwa ọhụrụ ezi omume Jehova kwere ná nkwa, ọ ga-agọzi Nehemaya site n’ịkpọlite ya n’ọnwụ. * (2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3, 4) N’oge ahụ, bụ́ mgbe Nehemaya ga-enwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ụwa, ọ ga-ahụ na Jehova echetala ya n’ezie imere ya ihe ọma.

Ekpere Nehemaya na-egosi na ihe a Eze Devid kwuru bụ eziokwu: “Gị onwe gị, Jehova, ga-agọzi onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume; ị ga-eji ihu ọma gbaa ya gburugburu dị ka à ga-asị na ọ bụ ọta ukwu.” (Abụ Ọma 5:12) N’ezie, Chineke na-ahụ mbọ anyị ji obi anyị niile na-agba ime ihe ga-atọ ya ụtọ, o jikwa ya kpọrọ ihe. Ya bụrụhaala na ị na-eme ihe niile i nwere ike ime iji na-ejere ya ozi, obi sie gị ike na ịhụnanya ya ga-eme ka o cheta gị ma gozie gị nke ukwuu.

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Febụwarị:

Nehemaya 1-13

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ihe a bụ nke ikpeazụ n’ime ugboro anọ Nehemaya kpegaara Chineke ekpere n’akwụkwọ Baịbụl a ka ọrụ o ji ikwesị ntụkwasị obi rụọ rụpụtara ya ezi ihe.—Nehemaya 5:19; 13:14, 22, 31.

^ par. 7 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe Chineke zubere imere ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi n’ụwa, gụọ isi nke 3 na nke 7 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.