Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Enyi Ya na Chineke Hụrụ Ya n’Anya

Ndị Enyi Ya na Chineke Hụrụ Ya n’Anya

Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Ndị Enyi Ya na Chineke Hụrụ Ya n’Anya

O NWEGHỊ onye maara aha ya taa. Naanị ihe e ji mara ya ugbu a bụ aha nna ya, bụ́ Jefta. Ka anyị leba anya na Baịbụl ma mata banyere ha abụọ. Anyị ga-achọpụta na ma ndị enyi ada Jefta ma Chineke hụrụ ya n’anya.

Anyị nwere ike ịgụ banyere Jefta na nwa ya nwaanyị na Baịbụl ná Ndị Ikpe isi 11. Ebe ọ bụ na Jefta bụ ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, o doro anya na ọ na-akọrọ nwa ya nwaanyị ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ mgbe niile.

Jefta dịrị ndụ tupu ndị Chineke, bụ́ ndị Izrel, ekwuo ka e nye ha eze bụ́ mmadụ ga na-achị ha. Jefta bụ nwoke siri ike nke maara otú e si alụ ọgụ. N’ihi ya, ndị Izrel gwara ya ka o duru ha gaa ịlụso ndị Amọn agha, bụ́ mba ha na Izrel gbara, bụ́kwa ndị na-alụso ha ọgụ.

Jefta chọrọ ka Chineke nyere ya aka imeri ndị Amọn, n’ihi ya, o kwere Chineke nkwa. Jefta kwuru na ọ bụrụ na Jehova emee ka ya merie n’agha ahụ, ya ga-enye Jehova onye mbụ si n’ụlọ ya pụta izute ya mgbe ọ lọtara. Onye ahụ ga-eji ndụ ya niile jee ozi n’ụlọikwuu Chineke, bụ́ ebe ndị Chineke na-efe ofufe n’oge ahụ. Ị̀ maara onye mbụ pụtara izute ya? *

Ee, ọ bụ ada Jefta! O wutere nnọọ Jefta. O nwere naanị otu nwa. Ma, o kwela Jehova nkwa, ọ ga-emezurịrị ya. Ozugbo ahụ, nwa ya nwaanyị kwuru, sị: “Nna m, ọ bụrụ na i megheworo Jehova ọnụ gị, mee m ihe si n’ọnụ gị pụta.” O kwuziri ka e nye ya ọnwa abụọ ka ya gaa bee ákwá n’ugwu. Olee ihe mere ihe ahụ ji na-ewute ya? Ọ bụ n’ihi na ọ bụrụ na o mezuo nkwa ahụ nna ya kwere, ọ gaghị alụ di ma ọ bụ mụọ nwa. N’agbanyeghị nke ahụ, o cheghị na ọ bụ ọchịchọ nke ya ka mkpa. Ọ chọrọ irubere nna ya isi ma kwesị ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ. Ì chere na o mere Jehova na nna ya obi ụtọ?

Ya mere, Jefta hapụrụ nwa ya nwaanyị na ndị enyi ya nwaanyị ka ha jiri ọnwa abụọ nọọ n’ugwu. Mgbe ọ lọtara, nna ya mezuru nkwa ya site n’iziga ya n’ụlọikwuu Chineke dị na Shaịlo ka ọ nọrọ ebe ahụ ná ndụ ya niile. Kwa afọ, ụmụ agbọghọ Izrel na-aga Shaịlo ịgba ada Jefta ume.

Ọ̀ dị ndị na-eto eto ị maara na-erubere ndị mụrụ ha isi ma hụ Jehova n’anya?— Ọ dị mma ka ị matakwuo ụmụaka ndị ahụ ma mere ha enyi. Ọ bụrụ na i ṅomie ada Jefta ma na-erube isi, kwesịkwa ntụkwasị obi, ị ga-enwe ezi ndị enyi. Ị ga-eme ndị mụrụ gị obi ụtọ, Jehova ga-ahụkwa gị n’anya.

Gụọ ebe ndị a na Baịbụl gị

Diuterọnọmi 6:4-6

Ndị Ikpe 11:30-40

1 Ndị Kọrịnt 7:37, 38

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.