“Taa Bụ Ụbọchị Unu”
Ememme Ngụsị Akwụkwọ Nke Klas Nke 129 nke Gilied
“Taa Bụ Ụbọchị Unu”
NA Septemba 11, 2010, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku mmadụ asatọ gbakọtara maka otu ihe omume pụrụ iche—ememme ngụsị akwụkwọ nke klas nke 129 nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Samuel Herd, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova gwara ụmụ akwụkwọ ahụ, sị, “Taa bụ ụbọchị unu. Anyị bịara isoro unu ṅụrịa!”
“Ntị nke Na-anụ Ihe”
Nwanna Herd malitere ihe omume ahụ site n’ịkọwa na ọ dị Ndị Kraịst niile mkpa iji “ntị nke na-anụ ihe” mee ihe bara uru site n’ige ntị n’Okwu Chineke. (Ilu 20:12) Nwanna Herd gwara klas ahụ, sị: “Unu nyere Jehova ntị unu kemgbe ọnwa ole na ole, unu ga na-emekwa otú ahụ ruo mgbe ebighị ebi.”
Olee otú ndị malitere ikwusa ozi ọma n’ala ọzọ ọhụrụ nwere ike isi jiri ntị ha mee ihe bara uru? Nwanna Herd kwuru, sị: “Ọ bụ site n’iji ya gee ntị n’Okwu Chineke.” O kwukwara, sị: “A ga-ekwu ọtụtụ ihe n’ihe omume nke taa bụ́ ndị ga-akwadebe unu maka ọrụ unu dị ka ndị na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ n’afọ ndị na-abịanụ.”
“Jirinụ Obi Unu Dum Tụkwasị Jehova Obi”
Gerrit Lösch, onye so n’Òtù Na-achị Isi, ji isiokwu a na-eme ka mmadụ chee echiche gwa ụmụ akwụkwọ ahụ okwu. Ọ kọọrọ ha ọtụtụ oge ndị Chineke tụkwasịrịla Jehova obi, ma n’oge ochie ma n’oge anyị.
N’otu aka ahụ, Nwanna Lösch kwuru na “ọ dị mkpa ka ndị na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ nwee okwukwe n’ọrụ ha.” O kwuru, sị: “Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịnọ na-eche, sị: ‘M̀ ga-amụtali asụsụ obodo ahụ? M̀ ga-amụtali omenala ha? M̀ ga-edili agụụ ịlọta ụlọ?’” Olee ihe bụ́ azịza ha? Nwanna Lösch gbara klas ahụ ume “ịtụkwasị Jehova obi.”
Nwanna Lösch gụkwara Ilu 14:26, bụ́ ebe kwuru, sị: “Onye na-atụ egwu Jehova na-enwe ezi obi ike na ya.” Anyị ga-atụkwasịkwu Jehova obi ma ọ bụrụ na anyị echeta ọtụtụ ụzọ o sirila gọzie anyị.
Baịbụl kwuru na onye tụkwasịrị Jehova obi “ga-adị ka osisi a kụrụ n’akụkụ mmiri, nke gbanyere mgbọrọgwụ n’akụkụ ọwa mmiri; ọ gaghịkwa ahụ mgbe okpomọkụ bịara, kama akwụkwọ ya ga na-ama pokopoko.”—Jeremaya 17:7, 8.
Ihe nke a na-akụziri anyị doro anya. Nwanna Lösch kwuru, sị: “N’agbanyeghị ihe ga-eme echi, unu kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi.”
“Ṅomienụ Ndị Mmụọ Ozi Kwesịrị Ntụkwasị Obi”
Nke ahụ bụ isiokwu nke okwu Stephen Lett, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi. Ndị mmụọ ozi bụụrụ anyị ezigbo ihe nlereanya. Nwanna Lett kwuru, sị: “Ihe niile Baịbụl kwuru banyere ha kwesịrị nṅomi.” O kwuziri àgwà anọ ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi nwere anyị kwesịrị iṅomi—ntachi obi ha, ịdị umeala n’obi ha, njikere ha dị inyere ndị ọzọ aka, na ikwesị ntụkwasị obi ha.
Baịbụl kọrọ na “onyeisi alaeze Peshia,” bụ́ mmụọ ọjọọ siri ike, nọchiiri otu mmụọ ozi ụzọ ruo ụbọchị iri abụọ na otu. (Daniel 10:13) Mmụọ ozi ahụ tachiri obi. Nwanna Lett kwuru na Ndị Kraịst nwekwara “mgba . . . megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ.” (Ndị Efesọs 6:12) Ọ gwara ụmụ akwụkwọ ahụ, sị: “Lụsienụ ọgụ ike ịnọgide n’ọrụ e kenyere unu.”
Mgbe Manoa, bụ́ nna Samsịn, jụrụ otu mmụọ ozi aha ya, mmụọ ozi ahụ ekweghị agwa ya. Mmụọ ozi ahụ gosiri ịdị umeala n’obi. (Ndị Ikpe 13:17, 18) Nwanna Lett gwara ụmụ akwụkwọ ahụ, sị: “Mgbe mmadụ nwara ito gị ma ọ bụ ịja gị mma maka ihe ọ bụla i mere, jiri umeala n’obi wegara Jehova otuto ahụ kama ịnara ya.”—1 Ndị Kọrịnt 4:7.
Mgbe Jizọs nọ n’ogige Getsemeni obere oge tupu ọnwụ ya, “otu mmụọ ozi nke si n’eluigwe pụtara ìhè n’ihu ya wee mee ka ọ dị ike.” (Luk 22:43) Mmụọ ozi ahụ nyeere ya aka. Nwanna Lett kwuru, sị: “Kpeenụ ekpere iji mata ihe ndị dị nnọọ ndị unu na-ekwusara ozi ọma n’ala ọzọ mkpa, sitekwa n’enyemaka Jehova, gbalịanụ igbo mkpa ndị ahụ.”
Ebe ọ bụ na ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi ka ndị nke sooro Setan nupụ isi, anyị nwere ike ikwu na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị mmụọ ozi bụ ihe nlereanya magburu onwe ya n’ikwesị ntụkwasị obi.—Mkpughe 12:4.
Nwanna Lett gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume, sị: “Dị nnọọ ka ndị mmụọ ozi ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, guzogidenụ Ekwensu. Guzogidenụ ya, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.”—Jems 4:7.
Isi Ihe Atọ Ọzọ E Mere
“Ka Jehova Bụụrụ Obi Gị Oké Nkume.” Mgbe Gary Breaux, bụ́ onye so na Kọmitii Alaka Amerịka, na-ekwu okwu n’isiokwu a na-eme ka mmadụ chee echiche sitere n’Abụ Ọma 73:26, o nyeere ụmụ akwụkwọ ahụ aka ịghọta na ọ dị ha mkpa ịdabere na Jehova. Olee otú Jehova si bụrụ oké nkume? Nwanna Breaux kwuru, sị: “Oké nkume nwere ike ijigide mpempe akwụkwọ mgbe oké ifufe na-efe. N’otu aka ahụ, Jehova nwere ike ime ka obi ruo unu ala.” N’ezie, obi anyị nwere ike iduhie anyị mgbe anyị nọ n’ọnwụnwa chọrọ ntachi obi. (Jeremaya 17:9) Ụdị ihu igwe ọhụrụ, nri ọhụrụ, ndị ha na mmadụ ga-ebi n’ebe obibi ndị na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ—nke ọ bụla n’ime ihe ndị a nwere ike ime ka mmadụ chewe echiche ịkwụsị ọrụ ikwusa ozi ọma n’ala ọzọ. Nwanna Breaux kwuru, sị: “Unu ga-ezute nsogbu ndị ga-eme ka unu tụlee ihe dị iche iche unu nwere ike ime ma kpebie ihe unu ga-eme na ha. Ùnu ga-eme mkpebi ga-adị Jehova mma? Ọ bụrụ na unu emee otú ahụ, Jehova ga-abụrụ ‘obi unu oké nkume.’ Ọ ga-eduzi nzọụkwụ unu.”
“Ùnu Nwere Okwukwe Ga-enyere Unu Aka Ịzọnye Ụkwụ na Mmiri?” Onye nkụzi Gilied, bụ́ Sam Roberson, kwuru okwu n’isiokwu ahụ, bụ́ nke si na Jọshụa isi 3. Olee otú ọtụtụ nde ndị Izrel ga-esi gafee Osimiri Jọdan mgbe o tojuru etoju? Jehova gwara Jọshụa ka o nye ndị nchụàjà iwu ka ha ‘kwụrụ otu ebe na Jọdan.’ Chineke kwere ha nkwa, sị: “Ozugbo ọbụ ụkwụ ndị nchụàjà . . . zọsara mmiri Jọdan, a ga-egbochi mmiri Jọdan, . . . ọ ga-eguzokwa otu ebe dị ka mmiri e gbochiri egbochi.” (Jọshụa 3:8, 13) Nwanna Roberson gwara ụmụ akwụkwọ ahụ, sị: “Unu ga-ezute Jọdan ihe atụ ná ndụ unu, bụ́ ndị ga-egbochi unu inweta ngọzi ga-abịara unu ma ọ bụrụ na unu ekwe.” Dị ka ihe atụ, o nwere ike isiri ha ike ha na ndị ibe ha na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ imekọrịta ihe nke ọma. Olee ihe ha ga-eme? “Legidenụ anya n’ọrụ e nyere unu; unu elela ndị ọrụ ibe unu.” Nwanna Roberson gbara klas ahụ ume, sị: “Ọ bụrụ na unu enwee okwukwe ịzọnye ụkwụ ná mmiri Jọdan ihe atụ ndị ahụ unu ga-ezute n’ọrụ ikwusa ozi ọma n’ala ọzọ unu, Jehova ga-enyere unu aka irufe ha.”
“Meenụ Ka Atụmatụ Unu Guzosie Ike.” Nke ahụ bụ isiokwu nke okwu onye nkụzi Gilied, bụ́ William Samuelson, kwuru. Okwu ya sitere n’Ilu 16:3, bụ́ ebe kwuru, sị: “Nyefee ọrụ gị n’aka Jehova, atụmatụ gị ga-eguzosikwa ike.” Nwanna Samuelson jụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ, sị: “Amaokwu a ọ̀ na-egosi na o nweghị ihe ọzọ unu ga-eme ka atụmatụ unu guzosie ike ma e wezụga ‘inyefe ọrụ unu n’aka’ Jehova?” Ọ zara ee e, n’ihi na Ilu 16:1 kwuru, sị: “Ọ bụ mmadụ na-ahazi ihe dị n’obi.” Nwanna Samuelson kwuru, sị: “Jehova anaghị arụ ọrụ ebube iji hazie ihe dị n’obi unu. Kama nke ahụ, unu kwesịrị ịhụ na ihe obi unu na-akpali unu ime dị mma. Site n’ịmụ ihe, ikpe ekpere, na unu na alaka ụlọ ọrụ imekọchi ihe anya, unu ga-anọgide na-enwe obi na-arụ ọrụ nke ọma, Jehova ga-emekwa ka atụmatụ niile unu guzosie ike.”
Ahụmahụ na Ajụjụ Ọnụ
Otu n’ime ụzọ ndị e si azụ ụmụ akwụkwọ Gilied bụ ha iso ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ebe ụlọ akwụkwọ ha dị ekwusa ozi ọma. Mark Noumair, onye nkụzi ọzọ nke Gilied, gbara ọtụtụ ụmụ akwụkwọ ajụjụ ọnụ banyere ahụmahụ ndị ha nwere. Ihe kacha pụta ìhè n’ahụmahụ ndị ahụ bụ otú ekpere si nyere ha aka ịchọta ndị nwere ezi obi bi n’ókèala ha.
Dị ka ihe atụ, otu di na nwunye nọ n’otu ebe a na-ere nri. Otu onye na-arụ ebe ahụ hụrụ ebe ha na-ekpe ekpere n’olu dị ala. Ọ bịakwutere ha ma jụọ ha ma hà bụ Ndịàmà Jehova. Mgbe ọ chọpụtara na ha bụ, ọ kọwaara ha na a zụlitere ya ka Onyeàmà ma na ya dapụrụ n’okwukwe. O medịrị mpụ nke mere ka ọ gaa mkpọrọ. Ugbu a nwa okorobịa ahụ chọrọ ka Jehova bataghachi ná ndụ ya. O kwukwara na tupu di na nwunye ahụ abata n’ụlọ oriri ahụ, na ya nọ na-ekpegara Chineke ekpere, na-agwa ya otú o si na-agụ ya agụụ inweta enyemaka iji maliteghachi ibi ezigbo ndụ. A zara ekpere ya!
Rudi Hartl, bụ́ onye na-arụ ná Ngalaba Na-ahụ Maka Iderịta Akwụkwọ Ozi ji isiokwu bụ́ “Detụnụ Jehova Ire Ma Hụ na Ọ Dị Mma” gbaa Wayne Wridgway nke si Mozambik, Jason Reed nke si Chili, na Kenji Chichii nke si Nepal ajụjụ ọnụ. Ha atọ bụcha ndị na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ a zụrụ na Gilied. Ụmụnna nwoke ndị a kwuru okwu n’ezoghị ọnụ banyere ụfọdụ n’ime nsogbu ndị ha nwere mgbe ha malitere ikwusa ozi ọma n’ala ọzọ ọhụrụ—ma ịmụ asụsụ ọhụrụ, ịmụta omenala ọhụrụ, ma idi agụụ ịlọta ụlọ. Nwanna Chichii kwuru, sị: “Otu ihe nyeere anyị aka bụ inweta ndị enyi n’ọgbakọ ọhụrụ anyị n’egbughị oge. Ka anyị na ndị ọgbakọ anyị kpachikwuwere anya, ọ dịkwuuru anyị mfe idi agụụ ịlọta ụlọ.”
Obere oge e nyechara ụmụ akwụkwọ iri ise na isii niile ahụ na-agụsị akwụkwọ diplọma ha, otu n’ime ha gụrụ akwụkwọ ozi ekele na-emetụ n’ahụ́ klas ahụ dere. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ha gwara Òtù Na-achị Isi bụ: “Anyị niile nọ na klas a ejirila anya anyị hụ na unu agbaala nnọọ mbọ iji ịhụnanya wepụta onwe unu, haziere anyị ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ a, leta anyị na klas, jirikwa Akwụkwọ Nsọ kụziere anyị ihe. Ebe anyị riterela uru n’ịhụnanya unu, anyị ga-eme ike anyị niile ịgbaso ihe nlereanya unu n’igosi ịhụnanya, ntachi obi, ịdị umeala n’obi, na inwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ mgbe anyị ruru n’ebe e kenyere anyị ikwusa ozi ọma n’ala ọzọ.”
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 28]
‘Mgbe mmadụ nwara ito gị, anarala ya’
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]
“Unu ga-ezute Jọdan ihe atụ ná ndụ unu”
[Chaatị/Map dị na peeji nke 31]
IHE BANYERE KLAS AHỤ
9 mba ole ha si
56 ole ụmụ akwụkwọ dị
28 mmadụ ole bụ́ di na nwunye
33.0 nkezi afọ ndụ ha
17.9 nkezi afọ ole ha nọrọla kemgbe e mere ha baptizim
13.3 nkezi afọ ole ha kwusarala ozi ọma oge niile
[Map]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
E kenyere ndị klas ahụ ọrụ ná mba 25 e dere n’okpuru ebe a
EBE NDỊ E ZIGARA NDỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA N’ALA ỌZỌ
BOLIVIA
BỌTSWANA
BỌLGERIA
KỌNGO (KINSHASA)
KOT DEVỤA
GAMBIA
JAMANỊ
INDIA
INDONISHA
KENYA
LAỊBERỊA
MASEDONIA
MADAGASKA
MALESHA
MOZAMBIK
PANAMA
PERU
PỌLAND
ROMENỊA
SEBIA
SIERA LIỌN
SWỌZILAND
TANZANIA
YUGANDA
ZIMBABWE
[Foto dị na peeji nke 30]
Ebe ụmụ akwụkwọ Gilied na-eme ihe ngosi nke ihe mere mgbe ha na-ekwusa ozi ọma
[Foto dị na peeji nke 31]
Ndị Gụsịrị Akwụkwọ na Klas nke 129 nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied
E nyere ahịrị ndị dị na foto a nọmba malite n’ihu laa azụ, aha ha malitekwara n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.
(1) Munaretto, R.; Olofsson, Y.; Budden, K.; Najdzion, L.; Moya, G.; Treviño, G.; Dion, A.; Fleegle, A.
(2) Smith, J.; Michael Raj, J.; Smith, S.; Paramo, A.; McDonald, J.; Deans, M.; Joyal, S.; Watson, L.
(3) Joyal, C.; Crawley, T.; Hacker, D.; Shynkarenko, J.; Knapp, T.; Ayling, J.; Highley, C.; Olofsson, B.
(4) Fitzpatrick, M.; Najdzion, B.; Skallerud, L.; Harris, A.; Harris, S.; Budden, R.; Paramo, Y.; Skallerud, K.
(5) Crawley, B.; Michael Raj, J.; Lodge, A.; Lodge, R.; Herms, N.; Fitzpatrick, J.; Moya, R.; Munaretto, P.
(6) Watson, S.; Deans, M.; Hacker, J.; McDonald, J.; Treviño, J.; Harris, S.; Herms, C.; Harris, P.
(7) Shynkarenko, V.; Highley, T.; Smith, A.; Dion, J.; Ayling, R.; Smith, B.; Knapp, T.; Fleegle, B.