Alaeze Chineke Ọ̀ Bụ Ihe Dị Mmadụ n’Obi?
Alaeze Chineke Ọ̀ Bụ Ihe Dị Mmadụ n’Obi?
Poopu Benedict nke Iri na Isii dere n’akwụkwọ ya bụ́ Jesus of Nazareth, sị: “Alaeze Chineke na-abịa mgbe mmadụ ji obi ya na-ege [Jizọs] ntị.” Ụfọdụ ndị chere na nke ahụ bụ naanị ihe Alaeze Chineke bụ, ya bụ, mgbanwe mmadụ na-eme n’obi ya mgbe ọ nabatara Jizọs Kraịst ma kwere na ya. Alaeze Chineke ọ̀ bụ naanị mgbanwe i mere n’àgwà gị, alaeze ‘nke dị naanị n’obi gị’?
ALAEZE ahụ dị nnọọ Jizọs mkpa. Poopu Benedict kwetara na Alaeze ahụ “bụ ebe ozi ọma Jizọs gbakwasịrị ụkwụ.” Ọtụtụ mgbe n’obere oge ahụ Jizọs ji jee ozi n’ụwa, ọ gazuru obodo ya, “na-ekwusakwa ozi ọma alaeze ahụ.” (Matiu 4:23) Jizọs ji ihe ndị ọ kụziri na ọrụ ebube ndị ọ rụrụ mee ka o doo anya na Alaeze ahụ abụghị naanị mmadụ ikweta na Chineke dị na irubere ya isi. O metụtara ọchịchị, ikpe, na ngọzi ebighị ebi.
Ọchịchị na Ikpe
Otu oge n’ụbọchị ndị ikpeazụ Jizọs jere ozi n’elu ala, nne Jems na Jọn, bụ́ ndị na-eso ụzọ Jizọs abụọ ha na ya na-akpachi anya, bịakwutere Jizọs ma kwuo, sị: “Kwuo ka ụmụ m ndị ikom abụọ a nọdụ ala, otu onye n’aka nri gị, otu onye n’aka ekpe gị, n’alaeze gị.” (Matiu 20:21) O doro anya na ihe ọ na-ekwu banyere ya abụghị ihe dị n’obi ụmụ ya. Ọ ghọtara na Alaeze ahụ metụtara iso Jizọs chịa, ọ chọkwara ka ụmụ ya soro na ya. N’ezie, Jizọs kwere ndịozi iri na otu ya kwesịrị ntụkwasị obi nkwa na ha ga-anọ n’Alaeze ya, “nọdụkwa ala n’ocheeze” ma soro ya ‘na-ekpe ikpe.’ (Luk 22:30) Ya mere, ndị na-eso ụzọ Jizọs ghọtara na Alaeze Jizọs bụ ọchịchị.
Oleekwanụ banyere ndị dịrị ndụ n’oge Jizọs? Hà lere Alaeze ahụ anya ka mmadụ ịgbanwe àgwà ya, ka hà tụrụ anya ihe karịrị nke ahụ? Obere oge tupu Ememme Ngabiga nke afọ 33 Oge Anyị, mgbe Jizọs nọ n’elu nwa ịnyịnya ibu na-abanye Jeruselem, ìgwè mmadụ nabatara ya, ụfọdụ n’ime ha tikwara mkpu, sị: “Biko, zọpụta Nwa Devid!” (Matiu 21:9) Olee ihe mere ha ji tie ụdị mkpu ahụ? O yiri ka ọ̀ bụ n’ihi na ha aghọtala na Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa nakwa na Chineke ga-enye ya Alaeze ebighị ebi, bụ́ “ocheeze Devid bụ́ nna ya.” Ha chọrọ nnọọ inweta nzọpụta, udo, na ikpe ziri ezi Alaeze ahụ ga-eweta.—Luk 1:32; Zekaraya 9:9.
Ngọzi Ebighị Ebi
Ndị na-eyighịdị ka hà nwechara mmasị n’ozi Jizọs ghọtara otu n’ime ihe ndị ọ kụziri nke ọma. Mgbe a na-akpọgbu Jizọs, otu onye omekome a kpọgidere n’osisi n’akụkụ ya rịọrọ ya, sị: “Jizọs, cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.” Olee ihe Jizọs zara ya? O mesiri nwoke ahụ nọ n’ọnụ ọnwụ obi ike, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.”—Luk 23:42, 43.
O doro anya na onye ohi ahụ kweere na mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ na ọ ga-enweta Alaeze ma ọ bụ banye n’Alaeze. Ọ bụghị naanị na Jizọs ga-enwe ikike ịkpọlite nwoke ahụ n’ọnwụ na inyere ya aka ịgbanwe Jọn 5:28, 29.
àgwà ya—tinyere ọtụtụ nde ndị ọzọ—kamakwa, ọ ga-enwe mmasị ime otú ahụ. N’ezie, n’oge ahụ a ga-enye Jizọs ikike ịchị n’eluigwe, ọ ga-eji Alaeze ahụ wetara ụwa niile ngọzi ebighị ebi.—Alaeze nke Dị n’Etiti Ha
Jizọs ó kwughị, sị: “Alaeze Chineke dị n’etiti unu”? Ee, Jizọs kwuru ihe ahụ na Luk 17:21. N’ezie, ụfọdụ nsụgharị Baịbụl kwuru n’ebe ahụ, sị “alaeze Chineke dị n’ime unu.” (Dị ka ihe atụ, gụọ ya na King James Version na The New English Bible.) Olee ihe Jizọs bu n’obi mgbe o kwuru ihe ahụ?
Ihe a na-ekwu ebe ahụ gosiri na ndị Jizọs gwara ihe ahụ bụ ndị okpukpe Juu na-emegide ya, bụ́ ndị a na-akpọ ndị Farisii. Ha nwere ihe dị iche ha na-atụ anya ya banyere Mesaya na Alaeze ya. N’echiche ha, Mesaya ahụ ga-abịa “n’ígwé ojii nke eluigwe” dị ka Eze dị ebube, ịnapụta ndị Juu n’aka ndị Rom ma weghachiri Izrel alaeze. (Daniel 7:13, 14) Ma, Jizọs gosiri na ha hiere ụzọ mgbe ọ gwara ha, sị: “Alaeze Chineke agaghị abịa n’ụzọ pụtara oké ìhè.” O kwuziri okwu ndị ahụ bụ́: “Lee! alaeze Chineke dị n’etiti unu.”—Luk 17:20, 21.
N’agbanyeghị na Jizọs kụziri ihe ma rụọ ọrụ ebube ndị mere ka o doo anya na ọ bụ ya bụ Eze e kwere ná nkwa ga-achị Alaeze ahụ, ndị Farisii megidekwuru Jizọs n’ihi na obi ha adịghị ọcha, ha enweghịkwa ezi okwukwe. Ha ekwetaghị na Jizọs bụ Mesaya ahụ. N’ihi ya, ọ gwara ha nke bụ́ nnọọ eziokwu: Alaeze ahụ, nke Eze ya a họpụtarala nọchiri anya ya, dị ‘n’etiti ha.’ Ihe ọ na-ekwu abụghị ka ha lewe anya n’ime obi ha. * Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya guzo n’ihu ha. Ọ gwara ha, sị: “Unu na alaeze Chineke nọ ebe a.”—Luk 17:21, Contemporary English Version.
Alaeze nke Dị Gị Mkpa
Ọ bụ ezie na Alaeze Chineke adịghị n’ime obi ụmụ mmadụ bụ́ ndị mmehie, o kwesịrị ịdị anyị mkpa. Jizọs gbara mbọ iji ozizi ya na ọrụ ndị dị ike ọ rụrụ nyere ndị na-ege ya ntị aka iji obi ha niile nwee okwukwe n’ọchịchị ezi omume nke ga-eweta ezi udo na obi iru ala. Ọ chọrọ ka ha nwee okwukwe nke ga-eme ka ndụ ha ka mma. N’ezie, ọ kụziiri ha ikpe ekpere, sị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:9, 10) Okwu Jizọs metụrụ ọtụtụ n’ime ndị gere ya ntị n’ahụ́, ha enweekwa okwukwe nke mere ka ha malite iso ụzọ Jizọs iji nweta ngọzi nke Alaeze Chineke.
Ị̀ ga-achọ inwe ụdị okwukwe a? Oleezi ihe ị ga-emerịrị iji nwee ụdị okwukwe ahụ? Cheta okwu ndị a Jizọs ji malite Ozizi Elu Ugwu ya ahụ a ma ama: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.” (Matiu 5:3) Ọ́ gaghị adị mma ka i kwere ka Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị wetaara gị magazin a, mụwara gị Baịbụl? Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị ga-enwe olileanya, ọ bụghị naanị ịgbanwe àgwà gị, kama inwe okwukwe n’ọchịchị ezi omume na nke ikpe ziri ezi, bụ́ Alaeze nke ga-ewetara mmadụ niile udo na obi iru ala.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 13 Okwu ahụ bụ́ “unu” na-ekwu maka ndị Farisii, bụ́ ndị Jizọs na-agwa okwu. N’ezie, ihe Jizọs bu n’obi enweghị ike ịbụ ndị Farisii ahụ ịgbanwe àgwà ha ma ọ bụ ịnabata okwu ya.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]
Alaeze Chineke ọ̀ dị n’obi ndị ogbu ọchụ ahụ kpọrọ ekwo nkụ na-emegide Jizọs?