Amụma nke Dị Oké Mkpa
Amụma nke Dị Oké Mkpa
“A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—MATIU 24:14.
NDỊ ọkà mmụta okpukpe kweere na amaokwu ahụ dị ezigbo mkpa. Ọ dị mkpa n’ihi na ọrụ ọ na-ekwu maka ya ga-abụ ọrụ zuru ụwa ọnụ. Ọ dịkwa mkpa n’ihi na o gosiri ọrụ Ndị Kraịst kwesịrị ịna-arụ, bụ́ ọrụ ikwusa ozi ọma a ga-ebu ụzọ rụọ iji maa ọkwa ọbịbịa nke ihe dị egwu ga-emetụta ụwa niile nke Jizọs kpọrọ “ọgwụgwụ.”
Amụma ahụ e buru n’amaokwu ahụ na-emezu taa. O metụtara gị n’ihi na ozi ọma ahụ o kwuru okwu ya ga-akpọ ndị mmadụ òkù ma dọọ ha aka ná ntị. Ọ na-enye gị ohere ịhọrọ otu n’ime ụzọ ihe abụọ: Ịnabata Alaeze Chineke ma ọ bụ imegide ya. Nke ọ bụla ị họọrọ ga-emetụta nnọọ ndụ gị.
Ka anyị tụlee oge e kwuru ihe dị n’amaokwu ahụ. Ụbọchị ole na ole tupu a kpọgbuo Jizọs, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya ma jụọ ya banyere ọdịnihu. Ha chọrọ ịma mgbe a ga-ehiwe Alaeze Chineke, bụ́ nke Jizọs kwuru banyere ya ọtụtụ ugboro. Ha chọkwara ịmara banyere “ọgwụgwụ usoro ihe a,” ma ọ bụ “ọgwụgwụ ụwa,” dị ka ụfọdụ nsụgharị si dee ya.—Matiu 24:3, Baịbụlụ nke International Bible Society.
Mgbe Jizọs na-aza ha ajụjụ ahụ, o buru amụma na a ga-enwe nnukwu agha, ụnwụ nri, ọrịa na-efe efe, na oké ala ọma jijiji. O kwukwara na mmebi iwu ga-amụba, na ndị nkụzi okpukpe ụgha ga-eduhie ọtụtụ ndị, nakwa na a ga-akpọ ezi Ndị Kraịst asị ma kpagbuo ha. Ihe a niile bụ akụkọ ọjọọ.—Matiu 24:4-13; Luk 21:11.
Ma, e nwekwara ozi ọma. Jizọs kwuziri okwu ndị ahụ e dere n’elu, bụ́ okwu kpaliri ọtụtụ ndị ime ihe kemgbe ọtụtụ narị afọ ma mee ka ha chee echiche. Ọ bụ ezie na ndị mmadụ kwetara na okwu ndị ahụ Jizọs kwuru dị mkpa, ha ekwekọrịtaghị n’ihe ọ pụtara. Olee kpọmkwem ihe bụ́ ozi ọma a? Gịnị bụ Alaeze ahụ? Olee mgbe amụma a ga-emezu, oleekwa ndị ga-emezu ya? Oleekwa ihe bụ́ “ọgwụgwụ” ahụ? Ka anyị hụ.
[Foto dị na peeji nke 2, 3]
Ihe odide Wọshịntịn Nke Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn e depụtaghachiri edepụtaghachi. E dere Matiu 24:14 ka ọ gbaa okpotokpo
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’akwụkwọ bụ́ Facsimile of the Washington Manuscript of the Four Gospels in the Freer Collection 1912