Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Jehova Ọ̀ Hụrụ Anyị n’Anya n’Agbanyeghị na Anyị Bụ Ndị India?”

“Jehova Ọ̀ Hụrụ Anyị n’Anya n’Agbanyeghị na Anyị Bụ Ndị India?”

Akwụkwọ Ozi Si Meksiko

“Jehova Ọ̀ Hụrụ Anyị n’Anya n’Agbanyeghị na Anyị Bụ Ndị India?”

MELESIO, onye na-asụ asụsụ O’dam, na-esi n’ugwu dị n’obodo ha agbadata mgbe ụfọdụ ịchọ ọrụ. Ọ na-aga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst ma were akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl ọ ga-enyetụ ndị ọzọ. Ọ rịọrọ ka mmadụ bịa leta ha ma kụzikwuoro ha Baịbụl.

Ndị O’dam, bụ́ otu agbụrụ bi n’ebe dịpụrụ adịpụ, bi n’ugwu dị elu dị n’etiti ebe ugwu Meksiko, nke dị ihe dị ka narị kilomita abụọ na iri anọ site n’ebe ọgbakọ Ndịàmà Jehova kacha ha nso dị. Ọtụtụ n’ime anyị kpebiri ịga leta ha.

Anyị si na Durango buru otu ụgbọala pikọp, ihe e ji ama ụlọikwuu, ihe ihi ụra, ihe oriri na mmanụ ụgbọala ga-ezuru anyị abalị atọ gawa. Anyị pụrụ n’elekere anọ nke ụtụtụ ma kwọọ ụgbọala awa asatọ n’ụzọ ugwu dị uzuzu uzuzu ruo n’ebe ọ kwụsịrị. Ọ bụ n’ebe a ka e si abanye n’ógbè ndị O’dam. E nwere nnukwu ndagwurugwu na ugwu ọzọ dị anyị n’ihu.

Anyị hapụrụ ụgbọala anyị n’otu obodo nta ma buru ngwongwo anyị jiri ụkwụ gaa awa atọ, gbadaruo na ndagwurugwu ahụ. Anyị mara ụlọikwuu n’ebe ahụ, kpata nkụ ga-ezuru anyị maka ọkụ anyị kwanyere iji chụpụsịa ụmụ anụmanụ, keekwa onwe anyị ihi ụra awa atọ atọ iji hụ na ọkụ ahụ anyụghị.

N’isi ụtụtụ echi ya, anyị malitere ịrị ugwu ahụ. E nwere ọtụtụ ụzọ ọhịa n’ebe ahụ, anyị fukwara ụzọ ọtụtụ ugboro. Otu onye n’ime anyị na-asụtụ O’dam, n’ihi ya, anyị ziri ndị bi n’ụzọ ebe ahụ ozi ọma. O juru anyị anya mgbe ndị mmadụ gwawara anyị na na Los Arenales, bụ́ ebe anyị na-aga, e nwere ndị kpọrọ onwe ha Ndịàmà Jehova nakwa na ha na-enwe ọmụmụ ihe n’ebe ahụ. Nke a juru anyị anya ma gbaa anyị ume.

Ụkwụ anyị gbatuchara agbatu mgbe anyị rutere na Los Arenales. Ihe e nwere n’obodo ahụ bụ ụlọ ájá ndị e ji katọn siri ike kpuchie elu ha bụ́ ndị dịsasịrị adịsasị, ha enweghịkwa ụlọ akwụkwọ na ọkụ eletrik. Ndị a bi n’ebe dịpụrụ adịpụ bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ, nri ha bụkwa achịcha e ji ọka mee na obere ụmụ ihe ndị ọzọ. Anyị hụrụ Melesio, bụ́ nwa okorobịa dị gịrịgịrị nke obi tọrọ ezigbo ụtọ ịhụ anyị. Ọ kpọbatara anyị n’ime ụlọ ya na-amachaghị mma ma gwa anyị na ya na-ekpe ekpere kemgbe kwa ụbọchị ka Jehova zite Ndịàmà Ya ka ha kụziere ezinụlọ ya na ndị O’dam ibe ya Baịbụl. O nweghị ike ịza ha ajụjụ niile ha na-ajụ.

Ndị O’dam bụ ndị ọgọ mmụọ. Ha na-eji ábụ́bà ugo na ọkpụkpụ emere ọtụmọkpọ, na-efe ihe ndị dị ka ifufe na mmiri ozuzo, na-atụkwa ndị dibịa afa ha ụjọ, bụ́ ndị na-erigbu ha. Melesio kọwara na mgbe ya mụtara na Jehova bụ ezi Chineke n’oge ya gara n’obodo mepere emepe, na ya bibiri ihe niile ya ji efe arụsị. Ndị obodo ha tụrụ anya na chi ha ga-egbu ya. Mgbe ọ na-enweghị ihe mere ya, ha ghọtara na Jehova ka chi ha dị iche iche ike. N’ihi ya, ha malitere ịbịa ọmụmụ Baịbụl Melesio na-eji akwụkwọ anyị eduziri ndị ezinụlọ ya.

Melesio kwuru, sị: “M gwara ha na ihe mbụ ha ga-eme bụ ịkpọ ọtụmọkpọ ha na arụsị ha ọkụ.” Ọtụtụ kwụsịrị ụjọ na-enweghị isi ha na-atụ, ndị na-abịa ọmụmụ ihe ahụ mụbakwara ma karịa iri mmadụ asatọ. Ihe ahụ ọ kọrọ tụrụ anyị n’anya, n’ihi ya, anyị kpebiri inwe ọmụmụ ihe n’ehihie ahụ. Anyị dunyere ndị mmadụ ka ha jiri ịnyịnya gaa kpọọ ndị na-abịa ọmụmụ ihe mgbe niile n’ụlọ Melesio òkù ka ha bịa. N’agbanyeghị na ụbọchị ahụ bụ etiti izu, a gwakwanụghị ha agwa n’oge, mmadụ iri abụọ na ise bịara, ụfọdụ ji ụkwụ, ụfọdụ ejiri ịnyịnya ibu.

Anyị ji Baịbụl zaa ha ajụjụ ndị ha jụrụ anyị. Ọ bụ Melesio sụgharịrị ajụjụ ha, sụgharịakwa azịza anyị. Ụfọdụ ajụjụ ndị ha jụrụ bụ: “Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya n’agbanyeghị na anyị bụ ndị India?” “Ọ̀ na-anụ ekpere n’asụsụ O’dam?” “Mgbe Amagedọn bịara, Jehova ọ̀ ga-echeta anyị n’agbanyeghị na anyị bi n’ebe dị anya n’obodo ndị mepere emepe?” Obi tọrọ anyị ụtọ na anyị ji Baịbụl mee ka obi sie ndị a dị umeala n’obi ike na Jehova hụrụ ndị dị nwayọọ n’obi n’anya n’agbanyeghị asụsụ ha na-asụ ma ọ bụ otú ebe ha bi si dịpụ adịpụ. Ha rịọrọ anyị ka e zitere ha onye ga-akụzikwuru ha ihe.

Mgbe anyị gbasara ọmụmụ ihe ahụ, anyị na ndị enyi ọhụrụ anyị a rikọrọ nri. Chi ejiela mgbe ahụ, ezigbo oyi na-atụkwa n’ebe a dị elu, n’ihi ya, anyị kelere ha mgbe ha gosiri anyị otu ọnụ ụlọ a ka na-arụ arụ anyị ga-ehi ụra na ya. N’ụtụtụ echi ya, ha si n’ụzọ na-adịghị anya duruo anyị n’ebe ụgbọala anyị dị, anyị wee laghachi Durango. Ọ bụ ezie na ike gwụrụ anyị, obi tọrọ anyị ụtọ.

Ọ bụụrụ anyị ihe ùgwù ịhụ ndị a nwere ezi obi. Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ n’ime ha amaghị otú e si agụ ma ọ bụ otú e si ede ma ọ bụ otú e si asụ Spanish, ha chọrọ ịmụta banyere ezi Chineke ma fee ya ofufe! Kemgbe ahụ anyị gachara ebe ahụ, Ndịàmà isii agaala n’ebe ahụ nọọ izu atọ. Ha nyeere mmadụ iri anọ na ise bụ́ ndị ji obi ha chọọ ife Jehova aka ịmara Ya. Ha niile na-agachi ọmụmụ ihe anya.

Otu ihe ọzọ bụ na naanị otu obere ụlọ ahịa dị na Los Arenales anakwaghị ere sịga. Ihe kpatara ya bụ na ọtụtụ ndị na-amụ Baịbụl ugbu a, ha niile akwụsịkwala ise sịga. Ha alụọkwala di na nwunye otú iwu kwadoro.

[Foto dị na peeji nke 24]

Melesio na nwunye ya na ụmụ ya nwaanyị anọ na ọgọ ya nwaanyị

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Ebe a na-eduziri mmadụ Baịbụl na ebe a na-enwe ọmụmụ ihe na Los Arenales

[Ebe e sigasị nweta foto dị na peeji nke 25]

Servicio Postal Mexicano, Correos de Mexico