Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jizọs “Na-ewepụ Mmehie Nke Ụwa”

Jizọs “Na-ewepụ Mmehie Nke Ụwa”

Jizọs “Na-ewepụ Mmehie Nke Ụwa”

Jọn Onye Na-eme Baptizim kwuru na Jizọs “na-ewepụ mmehie nke ụwa.” (Jọn 1:29) Nke a na-egosi ọrụ Jizọs ga-arụ iji gbapụta ụmụ mmadụ na-erube isi.

Ma, gịnị mere Jizọs ga-eji nwụọ iji gbapụta ndị mmehie?

Olee ihe ọnwụ o ji obi ya dum nwụọ rụpụtara?

Olee ndị ga-erite uru n’ọnwụ ya?

Olee uru o nwere ike ịbara gị?

Kwa afọ, Ndịàmà Jehova na-ezukọ iji cheta ọnwụ Jizọs n’ụbọchị ọ nwụrụ. N’afọ a, ncheta ọnwụ ya dabara na Sọnde, Eprel 17, mgbe anyanwụ dachara.

Ndịàmà Jehova ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù ka i soro ha zukọọ iji chọpụta ihe ọnwụ Jizọs pụtara. A ga-eji Baịbụl zaa ajụjụ ndị ahụ dị n’elu.

I nwere ike ịga nke a ga-eme n’ebe kacha nso n’ụlọ gị. Biko, jụta Ndịàmà Jehova bi gị nso ebe a ga-eme ya na oge ọ ga-abụ.