Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ole Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Ahụ?

Ole Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Ahụ?

Ole Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Ahụ?

“ . . . n’elu ụwa dum mmadụ bi.”—MATIU 24:14.

NDỊÀMÀ JEHOVA na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ụwa niile. Ha na-eme nke a n’ụzọ dị iche iche. Otu ụzọ bụ . . .

Okwu Ọnụ. Dị ka Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya, Ndịàmà Jehova na-eji ozi ọma ahụ agakwuru ndị mmadụ. (Luk 8:1; 10:1) Ha anaghị atụ anya ka ndị mmadụ bịakwute ha. Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị dị ihe karịrị nde asaa, na-agbara ndị mmadụ àmà banyere Alaeze Chineke. Ha na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, n’okporo ámá, na telefon nakwa n’ụzọ ndị ọzọ. N’afọ gara aga, Ndịàmà ji ihe karịrị otu ijeri awa na ọkara rụọ ọrụ a.

Ihe ha na-akụziri ndị ọzọ abụghị naanị banyere Alaeze Chineke, kamakwa, “ihe niile [Jizọs] nyere . . . n’iwu.” (Matiu 28:20) Ha na-eduziri ihe karịrị nde mmadụ asatọ ọmụmụ Baịbụl mgbe niile n’ụlọ ha n’efu.

Ndịàmà na-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile—na narị mba abụọ na iri atọ na isii. Ha na-ekwusara ndị si n’agbụrụ dị iche iche ozi ọma. Ha na-ekwusa ya n’ime obodo na n’obodo ndị mepere emepe, n’oké ọhịa Amazọn na na nke Saịberia, n’ọzara Afrịka nakwa n’Ugwu Himalaya. A naghị akwụ ha ụgwọ maka ọrụ a; n’ihi ịhụnanya ha nwere maka Chineke na ndị agbata obi ha, ha na-eji ego ha na oge ha arụ ya. Ihe ọzọkwa ha ji ekwusa ozi ọma bụ . . .

Akwụkwọ E Biri Ebi. A na-ebipụta magazin a, nke aha ya zuru ezu bụ Ụlọ Nche nke Na-ekwusa Alaeze Jehova, ugbu a n’otu narị asụsụ na iri asatọ na ise, mbipụta ya nke ọ bụla na-akarịkwa nde iri anọ na abụọ. A na-ebipụta magazin a na-ebipụtakọ ya na nke a, bụ́ Teta!, nke na-akpọsakwa Alaeze ahụ, n’asụsụ iri asatọ na atọ, mbipụta ya nke ọ bụla na-adịkwa ihe dị ka nde iri anọ.

Ndịàmà nwere akwụkwọ, broshuọ, traktị, siidi/MP3, na diiviidi ndị e ji akụziri ndị mmadụ Baịbụl n’ihe dị ka narị asụsụ ise na iri anọ. Naanị n’ime afọ iri gara aga, Ndịàmà emepụtala ma kesaa ihe ndị a ihe dị ka ijeri iri abụọ, bụ́ ihe dị ka atọ maka onye ọ bụla bi n’ụwa!

Ndịàmà Jehova ebipụtakwala ma ọ bụ nye ikike ka e bipụta nsụgharị Baịbụl dị iche iche. Ugbu a, e nwere Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ, nke zuru ezu na nke na-ezughị ezu n’asụsụ iri itoolu na isii, bụ́ nke Ndịàmà sụgharịrị, na-ebipụta ma na-ekesa. E kesaala ya ihe karịrị otu narị nde na nde iri isii na isii. Ndịàmà na-ekwusakwa ozi ọma nke Alaeze ahụ . . .

N’Ọmụmụ Ihe Ndị Kraịst. Ọmụmụ ihe a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze kwa izu abụghị naanị nnọkọ okpukpe; a haziri ha iji kụziere ndị bịaranụ ihe. A na-eji isiokwu ndị si na Baịbụl ekwu okwu, a na-ejikwa magazin Ụlọ Nche na akwụkwọ ndị ọzọ amụ Baịbụl. N’ọmụmụ ihe Ndịàmà, ha na-amụtakwa otú ha ga-esi na-ekwusakwuru ndị ọzọ ozi ọma ahụ nke ọma.

Ndịàmà na-amụ otu ihe n’ihe karịrị otu narị puku ọgbakọ na puku asaa n’ụwa niile, bụ́ nke so eme ka ha na-adị n’otu. Mmadụ niile nwere ike ịbịa ọmụmụ ihe ndị a. A naghị ana ego na ha. N’ezie, ihe a niile agaghị enwe isi ma ọ bụrụ na Ndịàmà anaghị eme ihe ha na-ekwusa. N’ihi ya, ha na-agbalị ime ka ndị ọzọ nwee mmasị n’ozi ọma ahụ . . .

Site n’Ihe Nlereanya Ha. Ha na-agbalị ibi ezigbo ndụ otú Ndị Kraịst kwesịrị ibi, na-anwa ike ha niile imeso ndị ọzọ otú ha ga-achọ ka ndị ọzọ si meso ha. (Matiu 7:12) Ọ bụ ezie na ha bụ ndị na-ezughị okè ma na-emejọ ihe mgbe ụfọdụ, ha na-eji obi ha niile achọ iji ịhụnanya emeso mmadụ niile ihe, ọ bụghị naanị site n’ikwusa ozi ọma, kamakwa site n’inyere ndị ọzọ aka mgbe ọ bụla o kwere ha mee.

Ihe bụ́ mkpa Ndịàmà Jehova abụghị ime ka ụwa niile chegharịa. Kama nke ahụ, dị ka Jizọs buru n’amụma, mgbe a rụrụ ọrụ ahụ otú dị Jehova mma, ọgwụgwụ ga-abịa. Olee ihe nke ahụ ga-apụtara ụwa na ndị bi n’ime ya?

[Foto dị na peeji nke 7]

Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile