Ị̀ Maara?
Ị̀ Maara?
Olee mpụ ndị Barabas mere?
▪ Mmadụ anọ so dee Oziọma ndị dị na Baịbụl kwuchara banyere Barabas, bụ́ nwoke onye ọchịchị Rom, bụ́ Pọntịọs Paịlet, hapụrụ kama ịhapụ Jizọs. A kpọrọ Barabas “onye mkpọrọ e ji ihe ọjọọ mara” na “onye na-apụnara mmadụ ihe.” (Matiu 27:16; Jọn 18:40) Ndị Rom tụrụ “ya na ndị na-emegide ọchịchị mkpọrọ” na Jeruselem. “Ndị a gburu ọchụ mgbe ha na-emegide ọchịchị.”—Mak 15:7.
Ọ bụ eziokwu na ọ dịghị akwụkwọ ụwa kwuru mpụ Barabas mere, ụfọdụ ndị ọkà mmụta chere na o so n’òtù ndị na-agba ọchịchị mgba okpuru e nwere na narị afọ mbụ n’Izrel ebe ọ bụ na a kpọkọtara ya na ndị na-emegide ọchịchị aha. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Flavius Josephus dere na òtù ndị omekome dị iche iche so kpata nnọọ ọgba aghara ndị e nwere n’oge ahụ; ndị omekome ahụ na-ekwu na ha chọrọ ịkwụsị mmegbu a na-emegbu ndị Juu bụ́ ndị ogbenye. Isi ahụ ha na-enupụ n’ihi mmegbu ha chere ndị Rom na ndị Juu bụ́ ndị oké ozu na-emegbu ha ruru ebe niile mgbe ọ na-erule ọkara narị afọ nke mbụ O.A. (Oge Anyị). Ọ bụ ndị òtù omekome dị iche iche mechara ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị agha ndị Juu chụpụrụ ndị Rom na Judia n’afọ 66 O.A.
Akwụkwọ bụ́ The Anchor Bible Dictionary kwuru, sị: “O nwere ike ịbụ na Barabas so ná ndị omekome e nwere n’ime ime obodo. Ndị nkịtị na-akwado ndị omekome ahụ n’ihi na ha na-ezu ndị Izrel, bụ́ ndị oké ozu, ohi, na-emegidekwa ọchịchị ndị Rom.”
N’oge ndị Rom, olee mpụ ndị a na-eji maka ha akpọgbu mmadụ otú e si kpọgbuo Jizọs?
▪ Otú ndị Rom si ata ndị gbara ọchịchị ha mgba okpuru, ndị omekome, na ndị nnupụisi ndị ọzọ bụ ịkpọgide ha n’osisi ịta ahụhụ ma hapụ ha ebe ahụ ka ha nwụọ. E lere nke a anya ka ụdị ọnwụ kacha njọ mmadụ nwere ike ịnwụ.
Akwụkwọ bụ́ Palestine in the Time of Jesus kwuru, sị: “A na-eme ya n’ihu ọha, ọ na-emenye ihere ma na-afụ ụfụ, a na-emekwa ya iji menye onye ọ bụla ga-anwa anwa gbaa ọchịchị mgba okpuru egwu.” Otu onye Rom na-ede akwụkwọ n’oge ochie kwuru banyere otú e si akpọgbu ndị omekome, sị: “Ebe a na-ahọrọ ịnọ mee ya bụ n’okporo ụzọ ndị kacha ekwo ekwo, bụ́ ebe ihe ka ọtụtụ nwere ike ịhụ ya ma tụọ egwu.”
Josephus kwuru na e gburu otu onye ndị agha Titus nwụdere mgbe ha nọchibidoro Jeruselem n’afọ 70 O.A. otú a n’ihu mgbidi obodo ahụ iji mee ka ndị na-azọ obodo ahụ tụọ egwu ma chịlie aka elu. E sikwa otú ahụ gbuo ọtụtụ ndị ọzọ mgbe e meriri obodo ahụ.
Mgbe e gburu ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ kachanụ e gbutụrụla otú a n’otu oge bụ mgbe aka kpaara òtù nnupụisi nke Spartacus bụ onyeisi ya (73-71 Tupu Oge Anyị), bụ́ mgbe a kpọgburu ndị ohu na ndị na-alụ ọgụ ọnwụ dị puku mmadụ isii n’ụzọ si Kapua gawa Rom.
[Foto dị na peeji nke 10]
“Nye anyị Barabas” nke Charles Muller sere, 1878