Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebee Ka Anyị Nwere Ike Inweta Enyemaka Iji Merie Nsogbu Ndị Anyị Na-enwe Taa?

Ebee Ka Anyị Nwere Ike Inweta Enyemaka Iji Merie Nsogbu Ndị Anyị Na-enwe Taa?

Okwu Pụrụ Iche a Ga-agwa Ọhaneze

Ebee Ka Anyị Nwere Ike Inweta Enyemaka Iji Merie Nsogbu Ndị Anyị Na-enwe Taa?

Ndụmọdụ juru ebe niile n’ụwa taa. Akwụkwọ na ihe omume tiivi ndị na-akụziri ndị mmadụ otú ha ga-esi nyere onwe ha aka na-amasị ọtụtụ ndị. N’agbanyeghị nke ahụ, nsogbu ndị kacha enye ụmụ mmadụ nsogbu ka dị. I nwere ike na-ajụ onwe gị, sị, ‘Ò nwere ebe m nwere ike isi nweta nduzi nke m ga-atụkwasị obi n’ezie?’ Azịza ya bụ ee!

N’agbanyeghị na Baịbụl agbaala ọtụtụ puku afọ, o nwere ndụmọdụ ndị bara uru mgbe niile, bụ́ ndị nwere ike ịza ajụjụ ndị dị ka ndị a:

▪ Olee otú m nwere ike isi dozie esemokwu, mụ na ndị ọzọ adịkwuokwa ná mma?

▪ Olee otú m nwere ike isi nweta obi ụtọ?

▪ Olee otú m nwere ike isi merie ụkọ ego?

▪ Olee otú m nwere ike isi kwụsịlata ichegbu onwe m?

A ga-aza ajụjụ ndị a n’okwu a ga-agwa ọhaneze nke isiokwu ya bụ “Ndụmọdụ Ndị Dị na Baịbụl—Hà Nwere Ike Inyere Anyị Aka Imeri Nsogbu Ndị Anyị Na-enwe Taa?” A ga-ekwu okwu a si na Baịbụl n’ụwa niile n’ihe karịrị narị ala abụọ na iri atọ. N’ọtụtụ ebe, a ga-ekwu ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova na Sọnde, Mee 1, 2011.

Obi ga-adị Ndịàmà bi gị nso ụtọ ịgwa gị oge na ebe a ga-anọ ekwu ya. Anyị ji obi ụtọ na-akpọ gị ka ị bịa.