Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikpe Kacha Njọ e Kpetụrụla

Ikpe Kacha Njọ e Kpetụrụla

Ikpe Kacha Njọ e Kpetụrụla

O SIRI ike ịhụ ikpe e kpere n’oge ochie a maara ka ya. Akwụkwọ Baịbụl anọ a na-akpọ Oziọma kọrọ ọtụtụ ihe banyere njide Jizọs Kraịst, ikpe e kpere ya na ogbugbu ya. Olee ihe mere i kwesịrị iji nwee mmasị na ya? Ọ bụ n’ihi na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-echeta ọnwụ ya, nke mere ka ikpe e ji gbuo ya dịkwuo mkpa; n’ihi na anyị kwesịrị ịma ma ebubo ndị e boro ya hà bụ eziokwu; nakwa n’ihi na àjà Jizọs chụrụ site n’iji obi ya niile kwere ka e gbuo ya baara anyị ezigbo uru ugbu a nakwa n’ọdịnihu anyị.—Luk 22:19; Jọn 6:40.

N’oge e kpere Jizọs ikpe, ọ bụ ndị Rom na-achị Palestaịn. Ndị Rom nyere ndị isi ndị Juu ikike iji iwu ndị Juu kpee ndị Juu ikpe, ma o yiri ka ha enyeghị ha ikike igbu ndị omekome. N’ihi ya, ọ bụ ndị okpukpe ndị Juu bụ́ ndị iro Jizọs jidere ya, ma, ọ bụ ndị Rom gburu ya. Ozi ọma Jizọs nọ na-ekwusa menyere ndị okpukpe e nwere n’oge ahụ ihere nke na ha kpebiri na Jizọs ga-anwụrịrị. Ma, ha chọrọ ka o yie ka iwu ọ̀ kwadoro ogbugbu ya. Mgbe otu prọfesọ nke na-akụzi banyere iwu tụlechara mgbalị ha mere ịhụ na e gburu Jizọs, ọ kpọrọ ihe ahụ merenụ “ikpe mkpegbu kachanụ e kpetụrụla n’ụwa.” *

Ọtụtụ Ihe E Mejọrọ n’Ikpe Ahụ

A kpọọla Iwu Mozis nyere ụmụ Izrel “iwu kacha mma e nyetụrụla.” Ma, ka ọ na-erule n’oge Jizọs, ndị rabaị na-agbasoru iwu n’isi tinyekwuru ọtụtụ iwu ndị na-adịghị na Baịbụl na ya, bụ́ ndị e mechara dee na Talmud. (Gụọ igbe bụ́  “Iwu Ndị Juu na Narị Afọ Ndị Mbụ,” nke dị na peeji nke 20.) Ikpe e kpere Jizọs ò kwekọrọ n’iwu ndị a, ma ndị si na Baịbụl ma ndị nke na-esighị na ya?

È jidere Jizọs n’ihi akaebe mmadụ abụọ gbara na ha hụrụ ebe o mere otu ihe ọjọọ? Ka iwu nwee ike ịkwado njide e jidere ya, e kwesịrị inwe ndị akaebe abụọ. Na Palestaịn nke narị afọ mbụ, onye Juu nke chere na e mebiri iwu ga-ewepụta okwu ahụ n’ụlọikpe mgbe a na-ekpe ikpe. Ụlọikpe enweghị ike ibo mmadụ ebubo, ma naanị ihe o nwere ike ime bụ ịtụle ebubo ndị e wetaara ya. Naanị ndị nwere ike iwepụta okwu n’ụlọikpe bụ ndị akaebe hụrụ mgbe mmadụ mere ihe ahụ e boro ya n’ebubo. Ikpe na-amalite mgbe e nwere, ya dịkarịa ala, ndị akaebe abụọ kwuru na ha hụrụ mgbe e mere otu ihe ọjọọ. Ọ bụ akaebe ha abụọ gbara bụ ebubo a ga-ebo onye ahụ nke mere a ga-eji gaa jide ya. A naghị anabata akaebe nke otu onye. (Diuterọnọmi 19:15) Ma, n’ikpe nke Jizọs, ndị isi ndị Juu chọrọ “ụzọ kasị mma” ha ga-eji gbuo ya. E jidere ya mgbe e nwere “ohere dị mma,” ya bụ, n’abalị, “mgbe ìgwè mmadụ na-anọghị ya.”—Luk 22:2, 5, 6, 53.

Mgbe e jidere Jizọs, e nweghị ebubo e boro ya. Ọ bụ naanị mgbe e jidechara ya ka ndị nchụàjà na Sanhedrin, bụ́ ụlọikpe ukwu ndị Juu, malitere ịchọ ndị akaebe. (Matiu 26:59) Ha achọtalighị mmadụ abụọ akaebe ha kwekọrọ. Ma, ọ bụghị ọrụ ụlọikpe ahụ ịchọwa ndị akaebe. A. Taylor Innes, bụ́ ọkàiwu na onye edemede kwukwara na “ikpe mmadụ ikpe, nke ka nke, ikpe ọnwụ, n’ebughị ụzọ mata ihe ọjọọ mere e ji ekpe ya ikpe, bụ nnọọ ihe jọgburu onwe ya.”

Ìgwè mmadụ ahụ iwe ji bụ́ ndị nwụchiri Jizọs kpọọrọ ya gaa n’ụlọ Anas, onye bụ́bu nnukwu onye nchụàjà, bụ́ onye malitere ịjụ ya ajụjụ. (Luk 22:54; Jọn 18:12, 13) Ihe ahụ Anas mere mebiri iwu bụ́ na a na-ekpe onye a na-ekpe ikpe ọnwụ ikpe n’ehihie, ọ bụghị n’abalị. Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụ n’ụlọikpe ka e kwesịrị ịnọ chọpụta ihe ọ bụla a chọrọ ịchọpụta, ọ bụghị na nzuzo. Ebe Jizọs maara na iwu akwadoghị ajụjụ ahụ Anas na-ajụ ya, ọ zara ya, sị: “Gịnị mere i ji na-ajụ m ajụjụ? Jụọ ndị nụrụ ihe m gwara ha. Lee! Ha maara ihe m kwuru.” (Jọn 18:21) Ọ bụ ndị akaebe ka Anas kwesịrị ịjụ ajụjụ, ọ bụghị onye e boro ebubo. Ihe ahụ Jizọs kwuru nwere ike inyere onyeikpe na-akwụwa aka ọtọ aka ime ihe iwu kwuru, ma mkpa Anas abụghị ikpe ziri ezi.

Otu onye agha mara Jizọs ụra n’ihi ihe ahụ o kwuru, nke ahụ abụghịkwa naanị ihe ike e mesoro ya n’abalị ahụ. (Luk 22:63; Jọn 18:22) Iwu dị n’akwụkwọ Baịbụl bụ́ Ọnụ Ọgụgụ isi 35, banyere obodo mgbaba, kwuru na e kwesịrị ichebe onye e boro ebubo ruo mgbe a mara ya ikpe. E kwesịkwara ichebe Jizọs otú ahụ.

Ndị ahụ jidere Jizọs kpụzi ya gaa n’ụlọ nnukwu onye nchụàjà bụ́ Keyafas, bụ́ ebe ikpe abalị ahụ iwu na-akwadoghị nọ gaa n’ihu. (Luk 22:54; Jọn 18:24) N’ebe ahụ, ndị nchụàjà leghaara ihe niile iwu kwuru anya ma na-achọ “ihe ha ga-eji gbagide Jizọs akaebe ụgha ka ha wee gbuo ya,” n’agbanyeghịkwa nke ahụ, ọ dịghị ndị akaebe abụọ kwuru na ha nụrụ otu ihe a sịrị na Jizọs kwuru. (Matiu 26:59; Mak 14:56-59) N’ihi ya, nnukwu onye nchụàjà nwara ime ka Jizọs kwuo ihe ga-etinye ya ná nsogbu. Ọ jụrụ ya, sị: “Ó nweghị ihe ị ga-aza? Gịnị ka i nwere ikwu n’akaebe a ndị a na-agbagide gị?” (Mak 14:60) Iwu akwadotụghị ihe ahụ o mere. Innes, bụ́ onye e kwurula ihe o kwuru, sịrị na “ịjụ onye e boro ebubo ajụjụ na isi n’ọnụ ya nweta ihe a ga-eji maa ya ikpe megidere ikpe ziri ezi.”

Ụlọikpe ahụ mechara jiri ihe Jizọs kwuru kpee ya ikpe. Mgbe a jụrụ Jizọs, sị: “Ọ̀ bụ gị bụ Kraịst, Ọkpara nke Onye A Gọziri Agọzi?” Ọ zara, sị: “Ọ bụ m; unu onwe unu ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka ọ nọ ọdụ n’aka nri nke ike ma na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe.” Ndị nchụàjà weere ihe a o kwuru ka ikwulu Chineke, “ha niile [amaakwa] ya ikpe na o kwesịrị ọnwụ.”—Mak 14:61-64. *

Iwu Mozis kwuru na ọ bụ n’ihu ọha ka e kwesịrị ịnọ kpee mmadụ ikpe. (Diuterọnọmi 16:18; Rut 4:1) Ma, ọ bụ na nzuzo ka e kpere Jizọs ikpe. Ọ dịghị onye nwara ikwuchite ọnụ Jizọs, ọ dịkwanụghị onye e kwere ka o mee otú ahụ. E nyochaghị ihe ahụ Jizọs kwuru nke bụ́ na ya bụ Mesaya iji mata ma ọ̀ bụ eziokwu. E nyeghị Jizọs ohere ọ bụla ịkpọta ndị akaebe ga-agbachitere ya. Ọ dịghị ezigbo ntụliaka ndị ikpe ahụ mere iji mata ma ikpe ọ̀ mara ya ka ọ̀ laara ya.

N’ihu Paịlet

Ebe ọ bụ na o yiri ka ndị Juu enweghị ikike igbu Jizọs, ha kpọgaara ya Pọntiọs Paịlet, bụ́ gọvanọ ndị Rom. Ajụjụ mbụ Paịlet jụrụ bụ: “Olee ebubo unu na-ebo nwoke a?” Ebe ndị Juu maara na ọ dịghị ihe Paịlet ga-eji ebubo ụgha ahụ ha boro Jizọs, nke bụ́ na o kwuluru Chineke, kpọrọ, ha nwara ime ka ọ maa Jizọs ikpe ọnwụ n’ebughị ụzọ chọpụta ihe merenụ. Ha kwuru, sị: “A sị na nwoke a abụghị onye na-eme ihe ọjọọ, anyị agaraghị enyefe ya n’aka gị.” (Jọn 18:29, 30) Paịlet anabataghị ihe ahụ ha kwuru nke mere ka ndị Juu chepụta ebubo ọzọ, nke bụ́: “Anyị chọpụtara na nwoke a na-ekpu mba anyị ihu ma na-amachibido ịkwụ Siza ụtụ isi, na-ekwukwa na ya onwe ya bụ Kraịst, bụ́ eze.” (Luk 23:2) Ya mere, ha ji aghụghọ gbanwee ebubo ahụ bụ́ na o kwuluru Chineke ka ọ bụrụzie na ọ na-agba ọchịchị mgba okpuru.

Ebubo ahụ e boro Jizọs na ọ “na-amachibido ịkwụ Siza ụtụ isi” bụ ụgha, ndị na-ebo ya ebubo makwaara nke ahụ. Nke ahụ dị iche n’ihe Jizọs kụziri. (Matiu 22:15-22) A bịa n’ebubo nke bụ́ na Jizọs mere onwe ya eze, Paịlet ghọtara ozugbo na nwoke a nọ n’ihu ya abụrụghị Rom nsogbu. Paịlet kwuru, sị: “O nweghị ihe ọjọọ m hụrụ o mere.” (Jọn 18:38) Paịlet agbanweghị obi ya n’oge niile o kpere Jizọs ikpe.

Otú mbụ Paịlet chọrọ isi tọhapụ Jizọs bụ iso omenala a na-emere ndị Juu nke bụ́ ịtọhapụrụ ha otu onye mkpọrọ n’oge Ememme Ngabiga. Ma, onye Paịlet mechara tọhapụ bụ Barabas, bụ́ onye e ji eji maka imegide ndị ọchịchị na igbu ọchụ.—Luk 23:18, 19; Jọn 18:39, 40.

Ihe ọzọ gọvanọ onye Rom ahụ chọrọ iji tọhapụ Jizọs bụ ime ka iwe ndị Juu dajụlata. O mere ka a pịa Jizọs ihe, e yiwe ya uwe odo odo, kpuwe ya okpu ogwu, tie ya ihe, kwaakwa ya emo. O kwukwara ọzọ na ọ dịghị ihe ọjọọ ya hụrụ Jizọs mere. Ọ dị ka à ga-asị na Paịlet na-ekwu, sị: ‘Ndị nchụàjà, nke a ó zubereghị unu?’ Ikekwe, o chere na ha ga-enwe ọmịiko n’ebe ọ nọ ma ọ bụ ha agharazie ịchọ ịtakwu Jizọs ahụhụ mgbe ha hụrụ otú ndị Rom si pịa ya ihe. (Luk 23:22) Ma, nke ahụ emeghị.

“Paịlet nọ na-achọ otú ọ ga-esi hapụ [Jizọs]. Ma ndị Juu tiri mkpu, sị: ‘Ọ bụrụ na ị hapụ nwoke a, ị bụghị enyi Siza. Onye ọ bụla nke na-eme onwe ya eze na-ekwugide Siza.’” (Jọn 19:12) Siza na-achị n’oge ahụ bụ Taịbiriọs, bụ́ eze ukwu a ma ama maka igbu onye ọ bụla gbara ọchịchị ya ụkwụ—ma ndị nọ n’ọkwá dị elu n’ọchịchị ya. Paịlet akpasubuola ndị Juu iwe, n’ihi ya, ọ gaghị achọ ka ya na ha see okwu ọzọ, ma ya fọkwa ihe ga-eme ka ha bowe ya ebubo na ọ na-agba Siza mgba okpuru. Mkpu ìgwè mmadụ ahụ na-eti bụ nnọọ iji menye Paịlet ụjọ, ụjọ jidekwara Paịlet. O mere ihe ha chọrọ ma mee ka e gbuo Jizọs, bụ́ nwoke aka ya dị ọcha.—Jọn 19:16.

Ileba Anya n’Otú E Si Kpee Ikpe Ahụ

Ọtụtụ ndị na-akọwa iwu atụleela ihe Oziọma ndị dị na Baịbụl kọrọ banyere ikpe Jizọs. Ha kwubiri na ọ bụ ikpe mkpegbu, ikpe na-ezighị ezi. Otu ọkàiwu kwuru, sị: “Ikpe ahụ a malitere n’etiti abalị, kpechaa ya ma bie ya tupu chi abọọ megidere iwu na ụkpụrụ ndị Hibru, megidekwa ikpe ziri ezi.” Otu prọfesọ na-akụzi banyere iwu kwuru, sị: “E nwere nnọọ ọtụtụ ihe e mejọrọ n’ikpe ahụ nke na e nwere ike ikwu na ọ bụ ikpe arụrụala.”

Aka Jizọs dị ọcha. Ma, ọ maara na ọ dị mkpa ka ya nwụọ iji zọpụta ụmụ mmadụ na-erube isi. (Matiu 20:28) Ọ hụrụ ikpe ziri ezi n’anya nke ukwuu nke na o kwere ka e kpee ya ikpe na-ezighị ezi kacha njọ e kpetụrụla. O mere ya maka anyị bụ́ ndị mmehie. Anyị ekwesịtụghị ichefu nke a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ dị mwute na chọọchị dị iche iche nke Krisendọm ejirila ihe ndị Oziọma ndị ahụ kọrọ banyere ọnwụ Jizọs mee ka a kpọọ ndị Juu asị, ma nke ahụ abụtụghị ihe ndị dere ha bu n’obi dee ha, ebe ọ bụkwanụ na ha onwe ha bụ ndị Juu.

^ par. 11 Ikwulu Chineke bụ ikwu ihe ga-eweda aha Chineke ala ma ọ bụ ịzọrọ ikike ruuru naanị Chineke. Ndị na-ebo Jizọs ebubo ekwughị ihe gosiri na o mere nke ọ bụla n’ime ihe abụọ ahụ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]

 Iwu Ndị Juu na Narị Afọ Ndị Mbụ

Iwu ndị Juu e nyere n’ọnụ, bụ́ ndị e mechara dee edee na narị afọ ndị mbụ nke Oge Anyị, bụ́ nke e chekwaranụ na ọ malitere n’oge dị nnọọ anya, nwere ụkpụrụ ndị a:

▪ Mgbe a na-ekpe ikpe ọnwụ, a ga-ebu ụzọ gee ihe ndị na-ekwu ka a hapụ onye e boro ebubo nwere ikwu

▪ Ndị ikpe ga-eme ihe niile ha nwere ike ime iji zọọ onye ahụ

▪ Ndị ikpe nwere ike ikwu ihe ga-akwado onye e boro ebubo ma ha enweghị ike ikwugide ya

▪ A na-adọ ndị akaebe aka ná ntị na ọrụ ha abụghị obere ọrụ

▪ A na-ajụ ndị akaebe ajụjụ n’otu n’otu, ọ bụghị n’ihu ndị akaebe ndị ọzọ

▪ Akaebe ndị a gbara ga-ekwekọrịrị n’ihe ndị dị mkpa, ya bụ, n’ụbọchị ihe mere, n’ebe ọ nọ mee, oge ihe ahụ mere n’ụbọchị, na ihe ndị ọzọ

▪ Ọ ga-abụrịrị n’ehihie ka a ga-ekpe ikpe ọnwụ, kpebiekwa ya n’ehihie

▪ E nweghị ike ikpe ikpe ọnwụ n’ụbọchị ga-abọta Ụbọchị Izu Ike ma ọ bụ ụbọchị ememme

▪ E nwere ike ịmalite ikpe ọnwụ ma kpebie ya n’otu ụbọchị ahụ ma ọ bụrụ na e kpebiri ịtọhapụ onye ahụ e boro ebubo; ọ bụrụ na e kpebiri igbu ya, naanị mgbe e nwere ike ikpebi ikpe ahụ bụ n’echi ya, bụ́ mgbe a ga-ekwupụta ihe e kpebiri, mezuokwa ya

▪ A ga-enwerịrị ndị ikpe iri abụọ na atọ, ma ọ dịkarịa ala, ga-ekpe ikpe ọnwụ

▪ Mgbe a na-achọ ikpebi ikpe ahụ, a na-enye onyeikpe nke ọ bụla ohere ikwu ma à ga-ahapụ onye ahụ ka à ga-egbu ya, malite n’onye nke a tọchara; ndị odeakwụkwọ na-edetu ihe ndị sịrị ka a hapụ onye ahụ kwuru na ihe ndị sịrị ka e gbuo ya kwuru

▪ A na-ekpebi na ikpe amaghị onye a na-ekpe ikpe mgbe ndị sịrị na ikpe amaghị ya ji otu onye karịa ndị sịrị na ikpe mara ya, ma, a ga-ama mmadụ ikpe naanị mgbe ndị sịrị na ikpe mara ya ji mmadụ abụọ karịa ndị sịrị na ikpe amaghị ya; ọ bụrụ na ndị sịrị na ikpe mara mmadụ ji otu onye karịa ndị sị na ikpe amaghị ya mgbe e mechara ntụliaka, a ga na-etinyekwu ndị ọkàikpe abụọ ruo mgbe e nwetara mkpebi ziri ezi

▪ A gaghị anabata ikpe ọnwụ e kpere mmadụ ma ọ bụrụ na e nwedịghị otu onyeikpe kwuru ka a hapụ onye ahụ; a na-eche na ndị ikpe niile ikwekọrịta ka e gbuo mmadụ “na-egosi na ha gbara onye ahụ mgba okpuru”

Ihe Ndị E Mejọrọ n’Ikpe Jizọs

▪ Ndị ikpe ahụ egeghị ndị akaebe chọrọ ka a hapụ Jizọs ntị

▪ Ọ dịghị onye ọ bụla nwara ikwuchitere Jizọs n’ime ndị ikpe ahụ; ha bụ ndị iro ya

▪ Ndị nchụàjà nọ na-achọ ndị akaebe ụgha iji maa Jizọs ikpe

▪ E kpere ikpe ahụ na nzuzo n’abalị

▪ Ikpe ahụ malitere ma bie n’otu ụbọchị, n’abalị bọtara ụbọchị ememme

▪ Ọ dịghị ebubo e boro Jizọs tupu e jide ya

▪ A tụleghị ma ihe ahụ Jizọs kwuru nke bụ́ na ya bụ Mesaya, bụ́ nke a sịrị na ọ bụ “ikwulu Chineke,” ọ̀ bụ eziokwu

▪ A gbanwere ihe e boro Jizọs ebubo ya mgbe e ruru n’ihu Paịlet

▪ Ebubo ndị e boro ya bụ ụgha

▪ Paịlet kwuru na ọ dịghị ihe ọjọọ ya hụrụ Jizọs mere, n’agbanyeghị ya, o nyere iwu ka e gbuo ya

[Igbe dị na peeji nke 22]

Ọbara Onye A Mara Ikpe Ọnwụ Na-adị n’Isi Ndị Akaebe

Mgbe a na-ekpe mmadụ ikpe ọnwụ, ụlọikpe ndị Juu na-enye ndị bịara ịgba akaebe ịdọ aka ná ntị na-esonụ iji gosi ha otú ndụ si dị oké ọnụ ahịa tupu ha agbaa akaebe ha:

“Ikekwe, ị chọrọ ịgba akaebe n’ihi ihe i chere, ihe ị nụrụ, ma ọ bụ ihe otu onye akaebe gwara ibe ya; ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ị nọ na-eche, sị, ‘Anyị tụkwasịrị onye gwara anyị ya obi.’ Ma ọ bụ, o nwere ike ịbụ na ị maghị na anyị ga-emecha gbaa gị ajụjụ iji chọpụta ma ihe ndị i kwuru hà bụ eziokwu. I kwesịrị iburu n’obi na iwu ndị na-achị ikpe ala dị iche n’iwu ndị na-achị ikpe ọnwụ. N’ikpe ala, mmadụ nwere ike ịkwụ ụgwọ iji gbara isi ya. N’ikpe ọnwụ, ọbara [onye e boro ebubo] na ọbara ndị niile ọ gaara amụ [bụ́ ndị a mara ikpe ọnwụ n’enweghị ihe ha mere] ga-adị n’isi [onye gbara akaebe ụgha] ruo mgbe ebighị ebi.”—Talmud Ndị Babịlọn, Sanhedrin, 37a.

Ọ bụrụ na a maa onye e boro ebubo ikpe ọnwụ, ọ bụ ndị ahụ gbagidere ya akaebe ga-egbu ya.—Levitikọs 24:14; Diuterọnọmi 17:6, 7.