Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jizọs Ebee Ka O Si Bịa?

Jizọs Ebee Ka O Si Bịa?

Jizọs Ebee Ka O Si Bịa?

“[Paịlet] wee banye ọzọ n’obí gọvanọ, sị Jizọs: ‘Ebee ka i si bịa?’ Ma Jizọs azaghị ya ihe ọ bụla.”—JỌN 19:9.

PỌNTỊỌS PAỊLET, onye Rom bụ́ gọvanọ, jụrụ ajụjụ ahụ mgbe a na-ekpe Jizọs ikpe ma ò kwesịrị ịdị ndụ. * Paịlet maara ebe Jizọs si n’Izrel. (Luk 23:6, 7) Ọ makwaara na Jizọs abụghị nnọọ mmadụ nkịtị. Ihe Paịlet na-ajụ ọ̀ bụ ma ọ̀ dịla ebe ọzọ Jizọs dịrị ndụ? Onye ọchịchị ahụ bụ́ onye ọgọ mmụọ ọ̀ dị nnọọ njikere ikwere eziokwu na ime ihe nke ahụ ga-achọ ya n’aka? Nke ọ bụla ọ bụ, Jizọs atụpụghịrị ya ọnụ, n’oge na-adịghịkwa anya, o doro anya na ihe bụ́ mkpa Paịlet bụ ọkwá ya, ọ bụghị eziokwu na ikpe ikpe ziri ezi.—Matiu 27:11-26.

Obi dị anyị ụtọ na ndị ji obi ha niile chọọ ịma ebe Jizọs si bịa nwere nnọọ ike ịchọpụta ya. Baịbụl kwuru hoo haa ebe Jizọs Kraịst si bịa. Ka anyị tụlee ihe e kwuru n’okpuru ebe a.

Ebe a mụrụ ya Mgbakọ ndị e mere n’oge a gosiri na a mụrụ Jizọs n’ebe na-adịchaghị mma n’anya n’obodo Judia a na-akpọ Betlehem ná mmalite oge mgbụsị akwụkwọ nke afọ a na-akpọzi 2 Tupu Oge Anyị. Iwu Siza Ọgọstọs nyere ka ndị ọ na-achị gaa deba aha ha n’akwụkwọ mere ka nne Jizọs bụ́ Meri, bụ́ onye “dịkwa ime ọmụmụ,” na di ya, bụ́ Josef, gaa Betlehem, bụ́ obodo Josef. Ebe di na nwunye ahụ na-enweghị ike inweta ụlọ n’ime obodo ahụ n’ihi ọtụtụ ndị bịara na ya, ha hiri n’ebe a na-akpa anụ, bụ́ ebe a nọ mụọ Jizọs ma nyiwe ya n’ihe a na-eji etinyere anụ ụlọ nri.—Luk 2:1-7.

Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, otu amụma dị na Baịbụl kwuru ebe a ga-amụ Jizọs, sị: “Gị onwe gị, Betlehem Efrata, obodo kachasị nta n’obodo ndị dị na Juda, ọ bụ n’ime gị ka onye ga-aghọ onye ọchịchị n’Izrel ga-esi pụta wee bịakwute m.” * (Maịka 5:2) O doro anya na Betlehem dị nnọọ obere ịgụnye ya n’obodo ndị dị na Juda. N’agbanyeghị nke ahụ, obere obodo a ga-enwe ihe ùgwù pụrụ iche. A ga-amụ Mesaya, ma ọ bụ Kraịst ahụ, e kwere ná nkwa na ya.—Matiu 2:3-6; Jọn 7:40-42.

Ebe ọ nọ too Mgbe ezinụlọ Jizọs nọtụchara obere oge n’Ijipt, ha kwafere Nazaret, bụ́ obodo dị n’ókèala Galili, ebe dịkwa ihe dị ka kilomita iri itoolu na isii site n’ebe ugwu Jeruselem. N’oge ahụ, Jizọs erubeghị afọ atọ. O toro n’ezinụlọ na-eyighị ka hà bara ọgaranya nke bi n’ebe a mara mma, bụ́ ebe e nwere ndị ọrụ ugbo, ndị ọzụzụ atụrụ na ndị ọkụ azụ̀.—Matiu 13:55, 56.

Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, Baịbụl buru amụma na Mesaya ahụ ga-abụ “onye Nazaret.” Matiu, bụ́ onye so dee Oziọma ndị dị na Baịbụl, kwuru na ezinụlọ Jizọs bịara biri na “Nazaret, ka e wee mezuo ihe e kwuru site n’ọnụ ndị amụma, sị: ‘A ga-akpọ ya onye Nazaret.’” (Matiu 2:19-23) Ọ dị ka okwu ahụ bụ́ onye Nazaret ò nwere ihe jikọrọ ya na okwu Hibru a sụgharịrị “ome.” Ọ ga-abụ na Matiu na-ekwu banyere amụma Aịzaya nke kpọrọ Mesaya ahụ “ome” nke si na Jesi, nke pụtara na Mesaya ahụ ga-abụ nwa nwa Jesi, bụ́ nna Eze Devid. (Aịzaya 11:1) Jizọs bụ n’ezie nwa nwa Jesi, nke si n’ezinụlọ Devid.—Matiu 1:6, 16; Luk 3:23, 31, 32.

Ebe o si bịa Baịbụl na-akụzi na ndụ Jizọs malitere ogologo oge tupu a mụọ ya n’ụlọ anụ ahụ dị na Betlehem. Amụma Maịka, bụ́ nke e dere n’elu, gara n’ihu ịkpọ Ya “onye malitere n’oge ochie, n’oge a na-amaghị ama gara aga.” (Maịka 5:2) Ebe Jizọs bụ Ọkpara Chineke, ọ bụ mmụọ n’eluigwe tupu a mụọ ya n’ụwa dị ka mmadụ. Jizọs n’onwe ya kwuru, sị: “Esi m n’eluigwe bịa.” (Jọn 6:38; 8:23) Olee otú nke ahụ ga-esi kwe omume?

Jehova Chineke ji mmụọ nsọ rụọ ọrụ ebube nke bụ́ ibufe ndụ Ọkpara ya bi n’eluigwe n’akpa nwa nke nwa agbọghọ Juu na-amaghị nwoke, bụ́ Meri, ka e wee nwee ike ịmụ ya dị ka mmadụ zuru okè. * Ọ dịịrị Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile mfe ịrụ ụdị ọrụ ebube ahụ. Dị ka mmụọ ozi nke kọwaara Meri ihe ndị a si kwuo ya, “n’ebe Chineke nọ, ọ dịghị okwu ọ bụla e kwupụtaworo nke ga-abụ ihe na-apụghị ime eme.”—Luk 1:30-35, 37.

Baịbụl agwaghị anyị naanị ebe Jizọs si bịa. Oziọma anọ dị na Baịbụl—Matiu, Mak, Luk, na Jọn—na-agwa anyị ọtụtụ ihe banyere otú o si bie ndụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ị chọọ ịmatakwu banyere njide e jidere Jizọs na ikpe e kpere ya, gụọ isiokwu bụ́ “Ikpe Kacha Njọ E Kpetụrụla,” nke dị na peeji nke 18-22 na magazin a.

^ par. 6 Ọ dị ka Efrata (ma ọ bụ Efrat) ọ̀ bụ aha mbụ a na-akpọ Betlehem.—Jenesis 35:19.

^ par. 10 Jehova bụ aha Baịbụl kpọrọ Chineke.