Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Amụma nke 4. Ndị Mmadụ Agaghị Ahụ Ibe Ha N’anya

Amụma nke 4. Ndị Mmadụ Agaghị Ahụ Ibe Ha N’anya

Amụma nke 4. Ndị Mmadụ Agaghị Ahụ Ibe Ha N’anya

“Ndị mmadụ . . . agaghị ahụ ndị ezinụlọ ha n’anya.”—2 TIMOTI 3:1-3, nsụgharị bụ́ God’s Word Bible

● Chris na-arụrụ otu òtù nọ na Briten ọrụ, bụ́ nke na-enyere ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha na-eti ihe aka. Chris kwuru, sị: “M na-echeta otu nwaanyị nke bịakwutere m otu ụbọchị, otú e si tikasịa ya ahụ́ mere ka m ghara ịmatazi onye ọ bụ. Ụmụ nwaanyị ndị ọzọ na-abịa n’ụlọ ọrụ anyị na-anọ ná mwute nke na ha anaghị enwe ike iwelite ihu elu.”

GỊNỊ KA IHE NDỊ NA-EME EME NA-EGOSI? N’otu mba dị n’Afrịka, ihe dị ka otu nwaanyị n’ime ụmụ nwaanyị atọ ọ bụla enweela mgbe e metọrọ ya n’oge ọ bụ nwata. Otu nnyocha e mere ná mba ahụ gosiri na otu nwoke n’ime ụmụ nwoke atọ ọ bụla kwuru na o nweghị ihe dị njọ ma nwoke tie nwunye ya ihe. Ma, ọ bụghị naanị ụmụ nwoke na-eti ụmụ nwaanyị ihe. Dị ka ihe atụ, na Kanada, ihe dị ka ụmụ nwoke atọ n’ime ụmụ nwoke iri ọ bụla ka ndị nwunye ha na-eti ihe.

GỊNỊ KA NDỊ NA-EKWEGHỊ NÁ MMEZU AMỤMA A NA-EKWUKARỊ? Ọ bụghị taa ka nwoke iti nwunye ya ihe ma ọ bụ nwaanyị iti di ya ihe malitere. Ọ bụ naanị na ndị mmadụ amatakwuola banyere nsogbu a n’oge a karịa ka ọ dị n’oge ndị gara aga.

IHE AHỤ HA KWURU Ò RIJURU AFỌ? N’eziokwu, ndị mmadụ amatakwuola banyere nsogbu a n’oge ndị a. Ma, ndị mmadụ ịmatakwu nsogbu a ò meela ka ọ kwụsịlata? Mbanụ! Ndị na-ahụghị ndị ezinụlọ ha n’anya na-ebukwu ibu.

GỊNỊ KA I CHERE? Ihe e kwuru na 2 Timoti 3:1-3 ọ̀ na-emezu? Ọ́ bụghị eziokwu na e nwere ọtụtụ ndị na-ahụghị ndị ezinụlọ ha n’anya?

Amụma nke ise i ji anya gị na-ahụ ka ọ na-emezu metụtara ụwa anyị a. Ka anyị tụlee ihe Baịbụl kwuru banyere ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]

“E kwuola na mmadụ iti di ya ma ọ bụ nwunye ya ihe bụ otu n’ime ihe ọjọọ ndị mmadụ kacha ezo ezo. Tupu nwaanyị agaa kọọrọ ndị uwe ojii na di ya na-eti ya ihe, ọ ga-abụ na di ya etielaya ihe ihe dị ka ugboro iri atọ na ise.”—OTU NWAANYỊ BỤ́ ỌNỤ NA-EKWUCHITERE ÒTÙ NỌ NA BRITEN NKE NA-ENYERE NDỊ DI HA MA Ọ BỤ NWUNYE HA NA-ETI IHE AKA.