Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ụmụ Si Agbanwe Ndụ Di na Nwunye

Otú Ụmụ Si Agbanwe Ndụ Di na Nwunye

Ihe Ndị Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ n’Ezinụlọ

Otú Ụmụ Si Agbanwe Ndụ Di na Nwunye

Charles: * “Obi tọgburu mụ na Mary atọgbu mgbe anyị mụrụ nwa mbụ anyị. Ma n’ime ọnwa ole na ole a mụchara ya, ehighị m ụra nke ọma. Anyị hazichara nnọọ otú anyị ga-esi na-elekọta ya, ma o nweghị nke nwere isi.”

Mary: “Mgbe m mụrụ nwa, ndụ m gbanwere. O yiziri ka o nweghị ihe ọzọ m na-arụ ma ọ́ bụghị inye nwa m nri, ịwa ya ákwà, na ịgụgụ ya. Ime ihe ndị a adịrịghị m mfe. O were m ọtụtụ ọnwa tupu mụ na Charles emekọrịtawa ihe otú anyị si emebu.”

ỌTỤTỤ ndị ga-ekweta na ịmụ ụmụ so n’ihe ndị kacha enye obi ụtọ ná ndụ. Baịbụl kwuru na ụmụ bụ “ụgwọ ọrụ” si n’aka Chineke. (Abụ Ọma 127:3) Di na nwunye ndị mụrụ nwa mbụ ha, dị ka Charles na Mary, makwaara na ụmụ batahaala, ndụ di na nwunye na-agbanwe otú ha na-atụghị anya ya. Dị ka ihe atụ, nwaanyị mụrụ nwa mbụ ya nwere ike itinye uche ya niile n’ebe nwa ya nọ, o nwekwara ike iju ya anya na ebe obi ya na-adị mgbe niile bụ n’igboro nwa ọhụrụ ahụ mkpa ya ọ bụla. Ma, o nwere ike iju di ya anya na naanị ihe nwunye ya na-echezi bụ nwa ọhụrụ ahụ. O nwekwara ike ịna-ewute ya na nwunye ya anazighị elebara ya anya.

N’eziokwu, di na nwunye nwere ike ibido inwe nsogbu ma ha mụọ nwa mbụ ha. Nsogbu ndị dị n’ịzụ nwa nwere ike ime ka ihe na-enyebu otu onye n’ime ha nsogbu n’obi bidokwa nyewe ya nsogbu. O nwekwara ike ịbọlite nsogbu ndị ha na-enwebu ma mee ka ha ka njọ.

Olee otú di na nwunye mụrụ nwa mbụ ha nwere ike isi rụọ ọrụ dị n’ilekọta nwa ọhụrụ ahụ n’ime ọnwa ole na ole a mụchara ya, bụ́ mgbe ọ kacha mkpa ka ha lekọta nwa ahụ? Gịnị ka di na nwunye nwere ike ime ka ha nọgide na-adị ná mma? Olee otú ha nwere ike isi dozie nghọtahie ha nwere banyere otú ha ga-esi zụọ nwa ha? Ka anyị leba anya na nke ọ bụla n’ime ihe ndị a ma tụlee otú ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl nwere ike isi nyere di na nwunye aka idozi ha.

NSOGBU NKE 1: O nweghịzi ihe ọzọ nwaanyị na-eche ma ọ́ bụghị nwa ya.

Nwa a mụrụ ọhụrụ na-ewekọrọ oge niile nne ya nwere, uche nne ya na-adịkwa n’ebe ọ nọ. Obi nwere ike na-atọgbu nwaanyị ahụ atọgbu na ya na-elekọta nwa ọhụrụ ya. Ka nke a na-eme, di ya nwere ike ịna-eche na nwunye ya na-eleghara ya anya. Manuel, bụ́ onye bi na Brazil, kwuru, sị: “Ihe kacha siere m ike idi bụ na nwunye m leghaara m anya ma tinyezie obi ya niile n’ebe nwa ọhụrụ anyị nọ. Mgbe anyị na-amụbeghị nwa, anyị ejighị ibe anyị egwuri egwu, ma ozugbo anyị mụrụ nwa, naanị onye nwunye m mazi bụ nwa anyị.” Olee otú i nwere ike isi merie nsogbu a?

Otú unu ga-esi merie ya: Nweerenụ ibe unu ndidi. Baịbụl kwuru, sị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. . . . ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya, ọ dịghị abụ nke a kpasuru iwe.” (1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5) Mgbe di na nwunye mụrụ nwa ọhụrụ, olee ihe ha abụọ nwere ike ime iji gosi na ha na-eme ihe a Baịbụl kwuru?

Di nke maara ihe ga-egosi na ọ hụrụ nwunye ya n’anya ma ọ bụrụ na ọ gụọ ihe ndị ga-akọwara ya mgbanwe ịmụ nwa na-akpata n’ahụ́ nwaanyị nakwa otú ịmụ nwa si agbanwe otú nwaanyị si eche echiche. Nke a ga-eme ka ọ ghọta ihe mere o ji abụ obi dịtụ nwunye ya mma, obi ajọtụ ya njọ. * Adam, bụ́ nwoke bi na Frans nke nwere nwa nwaanyị dị ọnwa iri na otu, kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ọ na-esiri m ike ịma ihe m ga-eme n’ihi na ọ na-abụ obi dịtụ nwunye m mma, obere oge obi ajọwa ya njọ. Ma, m na-agbalị icheta na ọ bụghị m ka ọ na-ewesa iwe. Kama, ihe na-akpata ya bụ nsogbu ndị ya na ịmụ nwa ọhụrụ so.”

Ò nwere mgbe nwunye gị na-anaghị eji mgbalị ịna-eme iji nyere ya aka akpọrọ ihe? Ya bụrụ otú ahụ, ewela iwe ọsọ ọsọ. (Ekliziastis 7:9) Kama nke ahụ, nwee ndidi ma na-ebute ọdịmma ya ụzọ, ọ ga-emekwa ka ị ghara iwe iwe.—Ilu 14:29.

Nwaanyị maara ihe ga-agbalịkwa ịna-agba di ya ume maka aka ọ na-enyere ya. Nwaanyị ahụ kwesịrị ime ka di ya soro na-elekọta nwa ahụ, jiri ndidi na-akụziri ya otú e si awa nwata ákwà ma ọ bụ otú esi akwadoro ya nri, n’agbanyeghị na nke a nwere ike na-eme di ya aka ekpe aka ekpe ná mmalite.

Otu nne dị afọ iri abụọ na isii nke aha ya bụ Ellen, ghọtara na ya kwesịrị ịgbanwe otú ya si emeso di ya. Ọ sịrị: “M gbalịrị kwụsịlata otú m si eme ka ọ̀ bụ naanị m nwe nwa anyị. M na-agbalị ka m ghara ịna-agwakarị di m na o metachaghị ihe m gwara ya mee mgbe ọ na-elekọta nwa anyị.”

MEGODỊ IHE A: Nwunye, ọ bụrụ na di gị emeghị ihe ụfọdụ mgbe ọ na-elekọta nwa unu otú ị gaara eme ya, gbalịa ka ị ghara ịkatọ ya ma ọ bụ megharịa ihe ahụ. Jaa ya mma ná ndị o metara, ọ ga-eme ka obi sie ya ike, ọ ga-agbakwa ya ume inyere gị aka n’oge ọzọ. Di, kwụsịlata ihe ndị na-adịghị oké mkpa ị na-eme ka i wee nwee ohere buru ibu ị ga-eji nyere nwunye gị aka, karịchaa n’oge ahụ ọ mụrụ nwa ọhụrụ.

NSOGBU NKE 2: Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị anaghị emekọrịta ihe otú unu na-emebu.

Ọ na-esiri ọtụtụ di na nwunye mụrụ nwa mbụ ha ike imekọrịta ihe otú ha na-emebu n’ihi na ịmụ anya abalị na nsogbu ndị ọzọ na-adapụtanụ na-akpatara ha ike ọgwụgwụ. Otu onye Frans ji ụmụaka abụọ nke aha ya bụ Vivianne kwuru, sị: “Ná mmalite, m tinyere uche m niile n’ilekọta ụmụ anyị nke na ọ fọrọ obere ka m chefuo na m ka bụkwa nwunye mmadụ.”

Di nwekwara ike ichefu na ime nwunye ya buru aghasaala nwunye ya ahụ́, gbanweekwa otú obi na-adị ya. Nwa ọhụrụ unu nwere ike iwekọrọ oge unu jibu anọrị ma ọ bụ na-enwe mmekọahụ. Oleezi otú di na nwunuye nwere ike isi hụ na nwa ọhụrụ ha ha hụrụ n’anya, bụ́ onye na-agaghị elekọtali onwe ya, ekewaghị ha abụọ?

Otú unu ga-esi merie ya: Mee ka nwunye gị ma ọ bụ di gị mara na ị ka hụrụ ya n’anya. Baịbụl kwuru banyere alụmdi na nwunye, sị: “Nwoke [ga-ahapụ] nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha ga-aghọkwa otu anụ ahụ́.” * (Jenesis 2:24) Jehova Chineke bu n’obi na ụmụaka ga-emecha hapụ ndị mụrụ ha. Ma, Chineke chọrọ ka di na nwunye bụrụ otu anụ ahụ́ n’oge niile ha dị ndụ. (Matiu 19:3-9) Olee otú ịghọta nke a ga-esi nyere di na nwunye mụrụ nwa ọhụrụ aka ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ?

Vivianne, bụ́ onye e kwuburu ihe o kwuru, sịrị: “M chebaara ihe Jenesis 2:24 kwuru echiche, o nyekwaara m aka ịghọta na mụ na di m bụ ‘otu anụ ahụ́,’ ọ bụghị mụ na nwa m. Ahụrụ m na ọ dị mkpa ka m mee ka mụ na di m dikwuo ná mma.” Theresa, bụ́ onye nwa ya dị afọ abụọ, sịrị: “Mgbe ọ dịwara m ka anaghị m enwe efe ka mụ na di m nọrịa, m na-agbalị ozugbo ka mụ na ya nọrịa, ọ bụrụgodị obere oge kwa ụbọchị.”

Ọ bụrụ na ị bụ di, gịnị ka i nwere ike ime ka gị na nwunye gị dikwuo ná mma? Gwa nwunye gị na ị hụrụ ya n’anya. Ekwula ya naanị n’ọnụ, mee ihe ndị ga-egosi na ị hụrụ ya n’anya. Ọ bụrụ na o nwere ihe na-enye nwunye gị nsogbu n’obi, gbalịsie ike mee ka obi ruo ya ala. Sarah, bụ́ nne dị afọ iri atọ, sịrị: “Nwaanyị na-achọ ka di ya gosi ya na ọ ka hụrụ ya n’anya ma jiri ya kpọrọ ihe, n’agbanyeghị na ahụ́ ya adịkwaghị otú ọ dị tupu ya atụrụ ime.” Alan, bụ́ nwoke bi na Jamini nke mụrụ ụmụ nwoke abụọ, chọpụtara na ọ dị mkpa ka di mee ka obi na-eru nwunye ya ala. Ọ sịrị: “M na-agbalị mgbe niile ime ka obi ruo nwunye m ala mgbe obi na-adịghị ya mma.”

O doro anya na mgbe nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ, ya na di ya agaghị na-enwe mmekọahụ otú ha na-enwebu. N’ihi ya, ha abụọ kwesịrị ikwurịta ihe ha ga-eme banyere ya. Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na di na nwunye agaghị enwe mmekọahụ, ha kwesịrị ‘ikwekọrịta’ tupu ha ekpebie ime otú ahụ. (1 Ndị Kọrint 7:1-5) Nke a pụtara na ha ga-akpa ya akpa. Omenala unu ma ọ bụ otú e si zụọ gị nwere ike ime ka o siere gị ike ịgwa di gị ma ọ bụ nwunye gị okwu banyere mmekọahụ. Ma, ọ dị mkpa ka di na nwunye kparịta ụdị ihe a, karịchaa mgbe ha mụrụ nwa mbụ ha. Mgbe unu na-ekwurịta ya, burunụ ọdịmma ibe unu n’obi, kwuonụ otú ọ dị unu n’obi ma nweerenụ ibe unu ndidi. (1 Ndị Kọrịnt 10:24) Nke a ga-eme ka unu ghara ịna-ese okwu, meekwa ka unu hụkwuo ibe unu n’anya.—1 Pita 3:7, 8.

Otú ọzọ di na nwunye ga-esi mee ka ha hụkwuo ibe ha n’anya bụ onye nke ọ bụla igosi na obi dị ya ụtọ n’ihe onye nke ọzọ na-eme. Di nke maara ihe ga-aghọta na e nwere ọtụtụ ọrụ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ na-arụ bụ́ nke ndị ọzọ na-anaghị ahụ. Vivianne kwuru, sị: “Chi jie, ọ na-adịkarị m ka ọ dịghị ezigbo ihe m rụrụ n’ụbọchị, n’agbanyeghị na ezughị m ike ka m nọ na-elekọta nwa m!” Nwaanyị maara ihe ga-agbalị ka ọ ghara iwere na ihe ndị di ya nyeere ya aka mee n’ụlọ enweghị ihe ha bụ, n’agbanyeghị na yanwa rụrụ ọtụtụ ọrụ n’ụbọchị.—Ilu 17:17.

MEGODỊ IHE A: Nne nwa, gbalịa ka ị na-ehitụ ụra mgbe nwa gị na-ehi ụra. I mee nke a, ị ga-enwetatụkwu ume ị ga-eji lebara di gị anya. Di, gbalịa ka ị na-ebili n’abalị nye nwa unu nri ma ọ bụ wagharịa ya ákwà ka nwunye gị nwee ike izu ike. Na-egosi nwunye gị mgbe niile na ị ka hụrụ ya n’anya. I nwere ike ide ya n’akwụkwọ debe ya n’ebe ọ ga-ahụ ya, ma ọ bụ dee ya n’ekwe ntị zigara ya, ma ọ bụ kpọọ ya na fon gwa ya ya. Na-ewepụtanụ oge unu ga-eji na-akparịta ụka ihu na ihu. Na-ekwurịtanụ banyere ibe unu, ọ bụghị naanị banyere nwa unu. Mee ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị bụrụ ezigbo enyi, ọ ga-enyere unu aka imeri nsogbu ha na ịzụ ụmụ so.

NSOGBU NKE 3: Unu enweghị otu olu n’otú unu ga-esi azụ nwa unu.

Di na nwunye nwere ike ịchọpụta na otú e si zụlite ha na-eme ka otú ha ga-esi zụọ nwa ha na-esere ha okwu. Otu nne, bụ́ onye Japan, nke aha ya bụ Asami na di ya, bụ́ Katsuro, nwere nsogbu a. Asami sịrị: “M chere na Katsuro na-azụtọ nwa anyị nwaanyị azụtọ, ebe yanwa chere na m ji aka ike na-azụ ya.” Olee ihe unu ga-eme ka otú unu si azụ nwa unu ghara isere unu okwu?

Otú unu ga-esi merie ya: Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kpaa ya akpa, na-akwadokwanụ ibe unu. Eze Sọlọmọn bụ́ onye maara ihe dere, sị: “Site n’ịdị mpako, naanị ihe mmadụ na-akpata bụ ọgụ, ma ndị na-agba izu na-enwe amamihe.” (Ilu 13:10) Ị̀ ma otú di gị ma ọ bụ nwunye gị chọrọ ka unu si zụọ ụmụ unu? Ọ bụrụ na unu echere ruo mgbe unu mụrụ nwa tupu unu akpaa otú unu chọrọ isi zụọ nwa unu, o nwere ike ime ka unu sesawa ibe unu okwu.

Dị ka ihe atụ, n’ajụjụ ndị na-esonụ, olee ndị nke unu kwekọrịtarala ihe unu ga-eme na ha: “Olee otú anyị ga-esi akụziri nwa anyị otú ọ ga-esi na-eri ihe na otú ọ ga-esi na-ehi ụra? Ànyị kwesịrị ikuru ya mgbe ọ bụla o bewere ákwá n’abalị? Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na nwa anyị anyụghị nsị n’ebe a gwara ya ka ọ na-anyụ ya?” O doro anya na ihe unu kpebiri ime ga-adị iche n’ihe di na nwunye ndị ọzọ ga-ekpebi. Ethan, bụ́ nna nke mụrụ ụmụ abụọ, kwuru, sị: “Unu kwesịrị ịkpa ihe ndị a akpa ka unu nwee ike inwe otu olu. Ime otú ahụ ga-eme ka unu jikọọ aka na-egboro nwa unu mkpa ya.”

MEGODỊ IHE A: Chee echiche banyere otú ndị mụrụ gị si zụọ gị. Chọpụta otú ha si zụọ gị bụ́ otú ị ga-achọ isi zụọ nwa gị. Chọpụtakwa otú ha si zụọ gị bụ́ otú ị na-agaghị achọ isi zụọ nwa gị, ma ọ bụrụ na e nwere. Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwurịta ihe ị chọpụtara.

Nwa Nwere Ike Ime Ka Di na Nwunye Nwekwuo Àgwà Ọma

Otú ahụ ọ na-ewe oge na ndidi tupu aka esie onye na-amụ ịgba ígwè ike, otú ahụ ka ọ ga-ewe unu oge ịmụta ịzụ nwa. Ma, unu ga-emecha mụta ya.

Ihe ndị ga-eme mgbe unu na-azụ nwa unu ga-egosi ma ùnu hụrụ ibe unu n’anya, ọ ga-agbanwekwa otú unu si emekọrịta ihe. Ịzụ nwa ga-emekwa ka unu nwee ohere ịmụta àgwà ndị magburu onwe ha. Ọ bụrụ na i jiri ezi ndụmọdụ Baịbụl nyere zụọ nwa gị, ọ ga-adị gị otú ọ dị otu nna aha ya bụ Kenneth. Ọ sịrị: “Ịzụ ụmụ emeela ka mụ na nwunye m bụrụkwuo ezigbo mmadụ. Anyị anaghịzi achọkarị ọdịmma onwe anyị, anyị ahụkwuola ibe anyị n’anya ma na-aghọtakwu ibe anyị.” Mgbanwe ndị a na-abara nnọọ di na nwunye uru.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 11 Obi na-ajọ ọtụtụ ndị nne njọ n’ime izu ole na ole ha mụchara nwa. Isi anaghị akpakọchakwa ụfọdụ ndị ọnụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ebe a kọrọ otú e si amata nsogbu a na ihe e kwesịrị ime banyere ya, gụọ isiokwu bụ́, “I Won My Battle With Postpartum Depression,” na Teta! (Bekee) July 22, 2002, nakwa isiokwu bụ́, “Understanding Postpartum Depression,” na Teta! (Bekee) June 8, 2003. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ha. I nwekwara ike ịgụ isiokwu ndị a n’asụsụ Bekee n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet bụ́ www.watchtower.org.

^ par. 19 Otu akwụkwọ otu ọkà mmụta dere kwuru na okwu Hibru a sụgharịrị “rapara” na Jenesis 2:24 nwere ike ‘ịpụta ịnọgidesi ike n’akụkụ onye ị hụrụ n’anya n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ.’

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ . . .

▪ N’ime izu gara aga, gịnị ka m mere iji gosi di m ma ọ bụ nwunye m na obi dị m ụtọ maka ihe ọ na-eme n’ezinụlọ anyị?

▪ Olee mgbe ikpeazụ mụ na di m ma ọ bụ nwunye m wepụtara oge si n’ala ala obi anyị kwurịta okwu na-agbasaghị ịzụ nwa?