Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ihe e kwuru banyere Pita, nke bụ́ na ọ nọrọ na nke onye na-esiji akpụkpọ anụ tupu a gwa ya ka ọ gaa na nke Kọnịliọs, ò nwere ihe ọ na-akọwara anyị banyere onyeozi a?

Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwuru na Pita “nọgidere na Jọpa ruo ọtụtụ ụbọchị ya na otu onye bụ́ Saịmọn, onye na-esiji akpụkpọ anụ,” onye “ụlọ ya dị n’akụkụ oké osimiri.” (Ọrụ 9:43; 10:6) Ndị Juu weere ọrụ isiji akpụkpọ anụ ka ọrụ na-adịghị ọcha, ha na-eledakwa onye na-arụ ya anya. Akwụkwọ okpukpe ndị Juu kwuru na a na-ele ndị na-esiji akpụkpọ anụ anya ọjọọ karịa otú e si ele ndị oburu nsị. Ọrụ Saịmọn mere ka ọ na-emetụ ozu ụmụ anụmanụ aka mgbe niile. Ihe ọ pụtara bụ na ndị Juu na-ewere ya mgbe niile ka onye na-adịghị ọcha. (Levitikọs 5:2; 11:39) Akwụkwọ ndị kọrọ banyere ụdị ọrụ a kwuru na ọ ga-abụ na Saịmọn na-eji mmiri si n’osimiri arụ ọrụ ya, nakwa na ọ ga-abụ na ụlọ ọrụ ya dị anya n’ebe ndị mmadụ bi n’ihi na isiji akpụkpọ anụ bụ “ọrụ na-esi ísì.”

N’agbanyeghị ihe ndị a, o doro anya na Pita gara nọrọ na nke Saịmọn. Nke a gosiri na o nwere ike ịbụ na Pita amụtala na ọ dịghị mma ka ya na-ele ndị mmadụ anya ọjọọ otú ndị Juu si ele ndị ha weere ka ndị na-adịghị ọcha, ebe ọ bụ na Jizọs emeghị otú ahụ.—Matiu 9:11; Luk 7:36-50.

Gịnị ka ihe Jizọs kwuru nke bụ́ “ọ bụ gị kwuru ya” pụtara?

Mgbe Keyafas, bụ́ nnukwu onye nchụàjà, nyere Jizọs iwu ka o kwuo n’ihu ọha ma ọ̀ bụ ya bụ Kraịst, Ọkpara Chineke, Jizọs gwara ya, sị: “Ọ bụ gị kwuru ya.” (Matiu 26:63, 64) Gịnị ka ihe a Jizọs kwuru pụtara?

Ihe Jizọs kwuru apụtaghị na ọ chọghị ịza Keyafas ajụjụ ọ jụrụ ya. Ọ ga-abụ na okwu ahụ bụ́ “ọ bụ gị kwuru ya” bụ otú ndị Juu si ekwu na ihe mmadụ kwuru bụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ okpukpe ndị Juu, bụ́ nke a chịkọtara ihe niile e dere na ya n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ asaa gara aga, kọrọ akụkọ banyere otu nwoke nke a jụrụ ma otu rabaị ọ̀ nwụọla, ya asị: “Ọ bụ gị kwuru ya.” A ghọtara na ihe ahụ o kwuru pụtara na onye ahụ anwụọla n’eziokwu.

Jizọs maara na nnukwu onye nchụàjà ahụ nwere ikike inye ya iwu ka ọ gwa ya eziokwu. Ọ makwaara na ọ bụrụ na ya agbachi nkịtị, ọ ga-adịzi ka Jizọs ekwetaghị na ya bụ Kraịst. N’ihi ya, mgbe Jizọs zara ya, sị: “Ọ bụ gị kwuru ya,” Jizọs na-agwa nnukwu onye nchụàjà ahụ na ya bụ Kraịst. N’akwụkwọ Mak dere bụ́ ebe ọzọ e dere akụkọ ahụ, mgbe Keyafas jụrụ Jizọs ma ọ̀ bụ ya bụ Mesaya ahụ, Jizọs ji obi ike zaa ya, sị: “Ọ bụ m.”—Mak 14:62; gụọkwa Matiu 26:25 na Mak 15:2.

[Foto dị na peeji nke 18]

Ebe a na-esiji akpụkpọ anụ n’obodo Fez, nke dị na Moroko