Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ò Nwetụla Mgbe Ọ Dị Gị Ka Ị̀ Bụ Onye A Jụrụ Ajụ?

Ò Nwetụla Mgbe Ọ Dị Gị Ka Ị̀ Bụ Onye A Jụrụ Ajụ?

Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Ò Nwetụla Mgbe Ọ Dị Gị Ka Ị̀ Bụ Onye A Jụrụ Ajụ?

ONYE a jụrụ ajụ bụ onye ndị ọzọ na-achọghị ka ha na ya na-emekọ ihe. O nwere ike ịbụ na otú akpụkpọ ahụ́ onye ahụ na-acha dị iche na nke ndị ọzọ, ma ọ bụ ya abụrụ na obodo ya, asụsụ ya ma ọ bụ otú o si eme ihe dị iche. Ò nwere mgbe ọ na-adị gị ka à jụrụ gị ajụ? *

Ka anyị gụọ akụkọ otu nwoke, bụ́ onye nwere mgbe ọ dị ya ka à jụrụ ya ajụ. Aha ya bụ Mefiboshet. Ka anyị mata onye ọ bụ na ihe mere o ji dị ya ka à jụrụ ya ajụ. Ọ bụrụ na o nwere mgbe ọ na-adị gị ka à jụrụ gị ajụ, e nwere ọtụtụ ihe ị ga-amụta n’aka Mefiboshet.

Mefiboshet bụ nwa Jọnatan, ezigbo enyi Devid. Tupu Jọnatan anwụọ n’agha, ọ gwara Devid, sị: ‘Nyere ụmụ m aka.’ Devid mechara ghọọ eze. Mgbe afọ ole na ole gafere, o chetara ihe ahụ Jọnatan gwara ya, Mefiboshet nọkwa ndụ mgbe ahụ. Mgbe Mefiboshet dị obere, ọ dara ada gbajie ụkwụ. Nke a mere na mgbe o toro, ọ na-esiri ya ezigbo ike ịga ije. Ị̀ hụla ihe mere o ji dị ya ka à jụrụ ya ajụ?

Devid chọrọ inyere nwa Jọnatan a aka. Devid chọtaara ya ụlọ n’akụkụ ụlọ nke ya na Jeruselem, gwakwa ya ka ọ bịa na-eso ya na ndị ezinụlọ ya na-eri nri. E nyekwara Mefiboshet otu nwoke aha ya bụ Zaịba, nyekwa ya ụmụ Zaịba na ndị odibo Zaịba, ka ha na-ejere ya ozi. N’eziokwu, Devid meere nwa Jọnatan ihe ọma! Ị̀ ma ihe mechara mee?

Devid nwere nsogbu n’ezinụlọ ya. Absalọm, bụ́ otu n’ime ụmụ Devid, chọrọ ịchụpụ Devid n’ọchịchị ka ọ ghọọ eze. Devid gbara ọsọ ndụ. O nwere ọtụtụ ndị so Devid gbapụ, Mefiboshet chọkwara iso ha. Ndị so Devid gbapụ maara na ọ bụ ya kwesịrị ịbụ eze. Ma ebe ọ bụ na ịga ije na-esiri Mefiboshet ike, o nweghị ike iso ha gbapụ.

Zaịba gaziri gwa Devid na ihe mere Mefiboshet esoghị Devid gbapụ bụ na ọ chọrọ ịbụ eze. Devid kwetara ihe a gwara ya, ma ọ maghị na ọ bụ ụgha! Ihe o meziri bụ ịgwa Zaịba ka o were ihe niile Mefiboshet nwe. Ka obere oge gara, Devid meriri Absalọm ma laghachi na Jeruselem. Mefiboshet bịaziri kọọrọ Devid ihe merenụ. Devid gwara Mefiboshet ka ya na Zaịba kee ihe niile Mefiboshet nwere. Gịnị ka i chere Mefiboshet mere?

Ọ gwaghị Devid na otú ahụ o si gwa ya ka ya na Zaịba kee ihe o nwere adịghị mma. Mefiboshet maara na ihe eze chọrọ bụ ka udo dị, ka o nwee ike na-achị nke ọma. N’ihi ya, ihe Mefiboshet kwuru bụ na Zaịba nwedịrị ike iwerecha ihe niile. Obi ụtọ ya bụ na Devid, bụ́ onye na-ejere Jehova ozi, alọghachila Jeruselem ma bụrụghachi eze.

Mefiboshet tara ahụhụ ná ndụ ya. Ọtụtụ mgbe ọ na-adị ya ka à jụrụ ya ajụ. Ma, Jehova hụrụ ya n’anya ma lekọta ya. Gịnị ka nke a na-akụziri anyị?— Ọ bụrụgodị na anyị na-eme ihe ọma, ụfọdụ ndị nwere ike ịghagide anyị ụgha. Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, maranụ na ọ kpọwo m asị tupu ya akpọọ unu asị.” Ndị mmadụ gbudịrị Jizọs! Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ọma, ezi Chineke bụ́ Jehova na Ọkpara ya bụ́ Jizọs, ga-ahụ anyị n’anya.

Gụọ ebe ndị a na Baịbụl gị

1 Samuel 20:15-17, 41, 42

2 Samuel 4:4; 9:1-10; 19:24-30

Jọn 15:18

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.