Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nkasi Obi Maka Ndị Obi Ha Tiwara Etiwa

Nkasi Obi Maka Ndị Obi Ha Tiwara Etiwa

Bịaruo Chineke nso

Nkasi Obi Maka Ndị Obi Ha Tiwara Etiwa

OTU nwaanyị Onye Kraịst nke darala mbà n’obi ọtụtụ mgbe ná ndụ ya, sịrị: ‘Jehova emekataghị hụ m n’anya.’ Nwaanyị a kwenyesiri ike na Jehova anọghị ya nso. Ọ̀ bụ eziokwu na Jehova anọghị ndị na-efe ya, bụ́ ndị dara mbà n’obi, nso? Ihe ọbụ abụ bụ́ Devid si n’ike mmụọ nsọ dee n’Abụ Ọma 34:18 zara ajụjụ a otú na-akasi obi.

Devid maara otú nsogbu ụwa nwere ike isi mee ka obi jọọ onye ji obi ya niile na-efe Jehova njọ. Mgbe Devid bụ okorobịa, ọ nọ na-agba ọsọ ndụ n’ihi Eze Sọl, bụ́ onye na-enwere ya anyaụfụ, nke fooro ntutu taa na ọ ga-egbu ya. Devid gbagara ebe o chere na Sọl agaghị achọrọ ya bịa, ya bụ, obodo Gat, nke dị n’ala ndị Filistia, bụ́ ndị iro Izrel. Ma, mgbe ndị obodo ahụ matara onye Devid bụ, o mere ka onye ara ma si n’obodo ahụ gbapụ. Devid kwuru na ọ bụ Chineke napụtara ya. Ọ bụkwa ihe ndị a merenụ mere o ji dee Abụ Ọma 34.

O nwere ndị ahụhụ ha nọ na ya taa mere ka ha nọrọ ná mwute ma ọ bụ ka ha na-eche na o nweghị ihe Chineke ji ha kpọrọ. Devid ò kwetara na Chineke agbakụtala ndị dị otú ahụ azụ? Devid dere, sị: “Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.” (Amaokwu nke 18) Ka anyị hụ otú okwu ndị ahụ si akasi anyị obi ma na-eme ka anyị nwee olileanya.

‘Jehova nọ nsọ.’ Otu akwụkwọ kwuru na otú a ka “e nwere ike isi kwuo na Onyenwe anyị na-ahụ ihe na-emenụ, dịkwa njikere inyere ndị ya aka na ịzọpụta ha.” Ịmata na Jehova na-ahụ ihe na-eme ndị ya na-eme ka obi sie anyị ike. Jehova na-ahụ nsogbu na-abịara ndị ya ‘n’oge a dị oké egwu,’ ọ makwaara otú obi dị ha.—2 Timoti 3:1; Ọrụ 17:27.

“Ndị obi ha tiwara etiwa.” N’obodo ụfọdụ, mgbe onye mmadụ chọrọ ịlụ hapụrụ ya, a na-ekwu na ‘e tiwaala onye ahụ obi.’ Ma, otu ọkà mmụta kwuru na ihe a ọbụ abụ ahụ na-ekwu bụ “ihe ọ bụla nwere ike ịkpatara mmadụ obi ọjọọ na mwute.” N’eziokwu, nsogbu ndị na-agbawa obi nwekwara ike ịbịara ndị ji obi ha niile na-efe Chineke.

“Ndị e gburu mmụọ ha.” Ndị nsogbu ụwa kparala aka ọjọọ nwere ike ịda mbà n’obi nke na mgbe ụfọdụ ọ ga-adị ha ka olileanya adịkwaghị. Otu akwụkwọ e dere maka ndị na-asụgharị Baịbụl kwuru na otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa okwu ahụ bụ “ndị na-enwekwaghị olileanya.”

Gịnị ka Jehova na-eme ma ndị “obi ha tiwara etiwa” na ndị “e gburu mmụọ ha” kpọkuo ya ka o nyere ha aka? Ọ̀ na-agbakụta ha azụ, were ha na o nweghị ihe ha bụ? Mbanụ! Jehova nọ ndị na-efe ya nso, bụ́ ndị na-akpọku ya ka o nyere ha aka, dị nnọọ ka ezigbo nna nke na-ekuru nwa ya na-ebe ákwá ma gụgụọ ya. Jehova dị njikere ịgụgụ ndị obi ha tiwara etiwa na ndị e gburu mmụọ ha. O nwere ike inye ha amamihe na ike ha ga-eji die nsogbu ọ bụla bịaara ha.—2 Kọrịnt 4:7; Jems 1:5.

Í cheghị na ọ ga-adị mma ka ị chọpụta otú ị ga-esi abịaru Jehova nso? Chineke a bụ́ onye ọmịiko kwere nkwa, sị: “Mụ na onye e gburu mmụọ ya na onye mmụọ ya dị ala bikwa, iji mee ka a tụtee mmụọ nke ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha, meekwa ka obi nke ndị e gburu mmụọ ha nwee ume.”—Aịzaya 57:15.

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Jun:

Abụ Ọma 26-59