Olee Otú Mmadụ Ga-esi Amụta Ikonye Akpa Ya Ebe Aka Ya Ga-eru?
Olee Otú Mmadụ Ga-esi Amụta Ikonye Akpa Ya Ebe Aka Ya Ga-eru?
“EBE aka ruru onye mkpụmkpụ ka ọ na-ekowe akpa ya.” Ihe ilu Igbo a pụtara bụ na mmadụ ekwesịghị ịna-emefu ego karịa ka ọ na-akpata.
Ọ bụ eziokwu na ihe ilu a na-ekwu esighị ike nghọta, ma ime ya eme na irite uru dị na ya siri ike. Ndị mmadụ agaghị na-abanye n’ụgwọ ma ọ bụrụ na ha na-eme ihe ilu a kwuru. Olee otú mmadụ nwere ike isi na-eme ya eme? Ebee ka anyị nwere ike isi nweta ndụmọdụ ndị ga-enyere anyị aka ime ya? Baịbụl nwere ọtụtụ ihe ọ ga-agwa anyị n’okwu a. Ka anyị lebatụgodị anya na ha.
Ndụmọdụ Baịbụl Ndị Ga-enyere Anyị Aka
E nwere ọtụtụ ihe e kwuru na Baịbụl bụ́ ndị ga-enyere gị aka ka ị ghara ịna-emefusị ego gị. Anyị ga-eleba anya n’ole na ole n’ime ha. Lee ma ị̀ ga-ahụ ihe ndị ga-enyere gị aka ịna-ekowe akpa gị ebe aka gị ga-eru.
Na-ahazi otú i si emefu ego gị. Ọ bụrụ na ị chọghị ịna-emefusị ego gị, ọ dị mkpa na ị ga-ama ego ole ị na-akpata na otú i si emefu ya. Baịbụl sịrị: “Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru, ma onye ọ bụla ọ na-adị ngwa ngwa aghaghị ịdaba n’ụkọ.” (Ilu 21:5) Ihe ụfọdụ ndị na-eme bụ itinye ego ha chọrọ imefu n’envelopu dị iche iche. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike itinye ego nri, ego ụlọ, ego ụgwọ akwụkwọ na ego ihe ndị ọzọ n’envelopu ndị ahụ ma si na ha na-ewere ego mgbe ọ bụla ọ dị mkpa. Ma ị̀ na-eji envelopu etinye ego gị ma ò nwere ụzọ ọzọ isi eme ya, ihe dị mkpa bụ ịmara ebe ego ị na-akpata na-aga nakwa ịhụ na ị na-ebu ụzọ emefu ego gị n’ihe ndị dị mkpa.
Enwela anyaụfụ. Ọ na-agụ mba ndị na-emepe emepe agụụ inwe ihe mba ndị mepere emepe nwere. Otú ahụ ka ọ na-adịkwa ọtụtụ ndị. Ha na-achọ inwe ihe ndị agbata obi ha nwere. Nke a nwere ike itinye mmadụ ná nsogbu. O nwere ike ịbụ na ndị agbata obi ha bitere ego zụọ ihe ahụ. Ọ̀ ga-adị mma ka i soro ndị agbata obi gị daa iberibe ma banye n’ụgwọ? Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Onye anyaụfụ na-achụsosi ihe dị oké ọnụ ahịa ike, ma ọ maghị na ya ga-anọ n’ụkọ.”—Ilu 28:22.
Achọla ihe ukwu. Jehova gwara Barọk bụ́ odeakwụkwọ Jeremaya ka ọ ghara ‘ịchọrọ onwe ya ihe ukwu.’ (Jeremaya 45:5) Otu ilu Igbo kwukwara na ‘ọchọ ihe ukwu ga-anyara agba enyí.’ Ozi si n’aka otu ụlọ akụ̀ dị n’Eshia kwuru na ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu onye n’ime mmadụ atọ ọ bụla bi ná mba Filipinz nakwa ihe karịrị ọkara ndị bi n’India anaghị akpata ihe ga-ezuru ha n’ụbọchị. Ọ bụrụ na mmadụ na-akpata obere ego, ọ ka mma ka ọ na-emefu ego ya n’ihe ndị dị mkpa. Ihe a Jehova gwara Barọk ga-enyekwara ndị bi ná mba ndị bara ọgaranya aka ka ha ghara ịbanye n’ụgwọ.
Ka ihe i nwere ju gị afọ. Ndụmọdụ a yiri nke ahụ e nyeburu, nke bụ́ achọla ihe ukwu. Baịbụl dụrụ anyị ọdụ na 1 Timoti 6:8, sị: “Ebe anyị nwere ihe oriri na uwe, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.” Ụfọdụ n’ime ndị kacha enwe obi ụtọ n’ụwa bụ ndị ogbenye; ma obere ihe ha nwere juru ha afọ. Ihe ndị ha nwere abụghị naanị ihe ndị e ji ego azụta. Ihe ọzọ mere afọ ji ju ha bụ na ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha hụrụ ha n’anya.—Ilu 15:17.
Zere iji ụgwọ. Baịbụl kwuru nnọọ eziokwu mgbe ọ sịrị: “Ọ bụ ọgaranya na-achị ndị dara ogbenye, onye gbaziiri ihe bụkwa ohu onye gbazinyere ya ihe”! (Ilu 22:7) Ọ bụ ezie na o nwere mgbe nsogbu ụfọdụ nwere ike ime ka mmadụ gaa biri ego, ndị na-ebikarị ego iji zụọ ihe ọ bụla ha hụrụ ga na-etinyekarị onwe ha ná nsogbu. Ndị na-abanyekarị ná nsogbu a bụ ndị na-azụ ihe n’aka. Eric, bụ́ onye bi na Filipinz, sịrị: ‘M hụhaala onye ga-eresị m ihe n’aka, m na-azụ ihe karịa mgbe m ji ego n’aka. Mgbe m ga-akwụzi ụgwọ m ji, ego anaghị afọ m n’aka.’ Ọ dị mma ka mmadụ lezie anya mgbe ọ chọrọ ịzụ ihe n’aka!—2 Ndị Eze 4:1; Matiu 18:25.
Buru ụzọ kpakọta ego tupu ị zụọ ihe. Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị nwere ike iche na oge agafeela mgbe mmadụ na-ebu ụzọ akpakọta ego tupu ya azụwa ihe, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ otu n’ime ụzọ kacha mma mmadụ ga-esi zere ịbanye n’ụgwọ. Ime otú ahụ na-eme ka ọtụtụ ndị ghara iji ụgwọ ma zere ọtụtụ nsogbu ya na iji ụgwọ so, dị ka ịkwụ nnukwu ọmụrụ nwa a na-atụkwasịrị onye zụrụ ihe n’aka. Na Baịbụl, e kwuru na ndanda ‘maara ihe’ n’ihi na ọ na-eji ‘oge owuwe ihe ubi achịkọta ihe ọ ga-eri’ n’ọdịnihu.—Ilu 6:6-8; 30:24, 25.
Mụta Ihe n’Aka Ndị Ọzọ
Ndụmọdụ Baịbụl ndị a anyị tụlere nwere ike ịtọ ụtọ ọgụgụ, ma ajụjụ bụ: Ọ̀ na-enyere ndị mmadụ aka ịmụta ikowe akpa ha ebe aka ha ga-eru? Ka anyị leba anya ná ndụ ụfọdụ ndị, bụ́ ndị merela ihe a Baịbụl kwuru, ma hụ otú o si nyere ha aka igbo mkpa ego ndị ha nwere.
Diosdado, bụ́ nwoke mụrụ ụmụ anọ, kwuru na ụkọ ego e nwere n’ọtụtụ mba na nso nso a emeela ka o siere ya ike igboro ezinụlọ ya mkpa ha. Ma, ọ chọpụtala na mmadụ ibu ụzọ hazie otú ọ ga-esi emefu ego ya bara uru. O kwuru, sị: “Ana m ebu ụzọ ahazi ebe ego ọ bụla m kpatara ga-abanye. Ana m eji akwụkwọ edetu ihe ọ bụla m mefuru.”
Danilo na-emekwa otu ihe ahụ. Obere ahịa ya na nwunye ya na-azụ dara. Ma ha na-enwe ike akpa afọ ezinụlọ ha n’ihi na ha na-ahazi otú ha si emefu ego ha. Ọ sịrị: “Anyị ma ego ole na-abata anyị n’aka n’ọnwa ọ bụla, marakwa ihe ndị anyị ga-akwụrịrị ụgwọ ha n’ọnwa ọ bụla. Anyị na-eburu nke a n’uche kparịta ego ole anyị ga-emefu n’ihe ndị ọzọ.”Ụfọdụ ndị achọpụtala na iwetulata aka n’ụfọdụ ihe ndị na-eri ego ha na-eme ka ha ghara imefu ego karịa ka ha kpebiri imefu. Myrna, bụ́ nwaanyị di ya nwụrụ, nke na-azụ ụmụ ya atọ, sịrị: “Mụ na ụmụ m na-ejizi ụkwụ aga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst kama ịbanye ụgbọala.” Myrna akụzierela ụmụ ya na ọ dịghị mma ibi ndụ okomoko. Ọ sịrị: “Ana m agbalị ime ihe e dere na 1 Timoti 6:8-10, bụ́ ebe sịrị na ọ dị mkpa ka afọ ju mmadụ n’ihe o nwere, ka ụmụ m nwee ike ịmụta ya.”
Gerald, onye nwere ụmụ abụọ, emeekwala otu ihe ahụ. Ọ sịrị: “Mgbe anyị na-amụ Baịbụl n’ezinụlọ anyị, anyị na-agụ akụkọ ụmụnna ndị ji ofufe Jehova kpọrọ ihe kama ịchọwa akụnụba. Akụkọ ndị ahụ na-abara ụmụ anyị uru n’ihi na o meela ka ha ghara ịna-asị anyị zụtara ha ihe ọ bụla ha hụrụ.”
Janet bụ nwa agbọghọ na-alụbeghị di. O bi na Filipinz, ọ na-ekwusakwa ozi ọma oge niile. Ọ dịbeghị anya a kwụsịrị ya ọrụ n’ebe ọ na-arụ ọrụ, ma ọ na-agbalịsi ike na-ekowe akpa ya ebe aka ya ga-eru. Ọ sịrị: “Ihe na-enyere m aka ime nke a bụ na m na-ahazi ihe m na-eji ego m eme nke ọma. Kama ịga ebe a na-ere ihe oké ọnụ, ana m achọta ebe a na-ere ihe ọnụ ala. Gịnị mere m ga-eji kwụọ nnukwu ego maka ihe m maara na m nwere ike ịzụta ọnụ ala? Anaghịkwa m azụ ihe m na-akwadoghị akwado ịzụ.” Janet achọpụtala na ọ bara ezigbo uru ibu ụzọ akpakọta ego tupu ya azụọ ihe. Ọ sịrị: “Ego fọdụ m n’aka, ya dịgodị obere, anaghị m emefu ya ozugbo, m na-edebe ya maka adịghị ama ama.”
A bịa n’ịzụ ihe n’aka, Eric, bụ́ onye anyị kwuburu okwu ya, sịrị: “Akwụsịla m ịzụ ihe n’aka ọ gwụkwala ma ọ̀ dị oké mkpa.”
I Nwere Ike Ikowe Akpa Gị Ebe Aka Gị Ga-eru
Ọ bụ eziokwu na ihe bụ́ isi Baịbụl na-akụzi bụ otú anyị na Chineke ga-esi na-adị ná mma, ọtụtụ ndị achọpụtala na ọ na-enyekwa ndụmọdụ ndị ga-abara anyị uru n’okwu ego. (Ilu 2:6; Matiu 6:25-34) Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị a Baịbụl kwuru bụ́ ndị a kọwara n’isiokwu a, ma na-agbalịkwa ịmụta ihe n’aka ndị riterela uru n’ime ihe ndị a Baịbụl kwuru, ị ga-amụta ikowe akpa gị ebe aka gị ga-eru. I mee nke a, ị gaghị abanye ná nsogbu na oké echiche ọtụtụ ndị na-abanye taa.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]
‘Anyị na-akparịta ego ole anyị ga-emefu’
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]
‘Anyị na-ejizi ụkwụ aga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst kama ịbanye ụgbọala’
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]
‘Anaghị m azụ ihe m na-akwadoghị akwado ịzụ’