Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Ò Nwere Ike Inwe Obi Ụtọ Ma Ọ Bụ Mwute?

Jehova Ò Nwere Ike Inwe Obi Ụtọ Ma Ọ Bụ Mwute?

Bịaruo Chineke nso

Jehova Ò Nwere Ike Inwe Obi Ụtọ Ma Ọ Bụ Mwute?

Ọ BỤRỤ na azịza ya bụ ee, ihe mmadụ ga-ajụzi bụ: Àgwà anyị ọ̀ na-emetụta Chineke? Ya bụ, àgwà anyị ò nwere ike ime ka obi tọọ Chineke ụtọ ma ọ bụ jọọ ya njọ? Ụfọdụ ndị ọkà mmụta e nwere n’oge ochie echeghị otú ahụ. Ha kwuru na ebe ọ bụ na o nweghị onye nwere ike ime ka Chineke mee ihe ọ na-achọghị ime, ihe ọ pụtara bụ na ihe anaghị emetụ Chineke n’obi. Ma, ihe Baịbụl na-ekwu dị iche. Ọ na-ekwu na Jehova dị obi ebere nakwa na o nwere nnọọ mmasị n’ihe anyị na-eme. Ka anyị leba anya n’ihe e kwuru n’Abụ Ọma 78:40, 41.

Abụ Ọma nke 78 kọrọ otú Chineke si meso ụmụ Izrel ihe. Mgbe Jehova napụtachara ha n’aka ndị Ijipt, bụ́ ndị ha na-agbara ohu, ọ gwara ha na ya chọrọ ka ha na ya dịrị n’ezigbo mma. Ọ gwara ha na ọ bụrụ na ha ga na-erubere ya isi, ha ga-aghọ ‘ihe onwunwe ya pụrụ iche,’ ọ ga-esikwa n’aka ha mezuo uche ya. Ndị Izrel kwetara, ha na ya wee gbaa ndụ. Ụmụ Izrel hà rubeere Chineke isi otú ha kwere nkwa na ha ga-eme?—Ọpụpụ 19:3-8.

Abụ ọma ahụ sịrị: “Lee ugboro ole ha nupụụrụ ya isi n’ala ịkpa!” (Amaokwu nke 40) Amaokwu nke na-eso ya ekwuo, sị: “Ha nwara Chineke ọnwụnwa ugboro ugboro.” (Amaokwu nke 41) Ị̀ hụrụ na onye dere abụ ọma a kwuru na ha nupụrụ isi ugboro ugboro? Nnupụisi ha malitere obere oge ha pụtachara n’Ijipt. Ha malitere ịtamu ntamu megide Chineke. O yiri ka hà na-ekwu na Chineke agaghị elekọtali ha. (Ọnụ Ọgụgụ 14:1-4) Otu akwụkwọ nke na-enyere ndị na-asụgharị Baịbụl aka kwuru na otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa okwu bụ́ “ha nupụụrụ ya isi” bụ ‘ha kpọchiiri Chineke obi ha’ ma ọ bụ na ‘ha sịrị Chineke “Mba.”’ N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova meere ndị ya ebere ma gbaghara ha mgbe ha gosiri na ha echegharịala. Ma e mechaakwa, ha alaghachi n’ụzọ ọjọọ ha. Otú ahụ ka ha mere ugboro ugboro.—Abụ Ọma 78:10-19, 38.

Olee otú obi na-adị Jehova mgbe ọ bụla ndị ya nupụụrụ ya isi? Amaokwu nke 40 sịrị na ‘ha kpasuru ya iwe.’ Otú Baịbụl ọzọ si sụgharịa ya bụ na ha “na-eme ya ihe mwute.” Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru, sị: “Ihe nke a pụtara bụ na otú ndị Hibru ahụ si mee omume wutere nnọọ Chineke otú ahụ omume nwa nnupụisi ma ọ bụ nwa isi ike si ewute ndị mụrụ ya.” Otú ahụ nwata isi ike si akpatara ndị mụrụ ya obi mgbawa, otú ahụkwa ka ụmụ Izrel, bụ́ ndị nnupụisi, si ‘mee ihe wutere Onye Nsọ Izrel.’—Amaokwu nke 41.

Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’abụ ọma a? Anyị na-amụta ihe na-eme ka obi tọọ anyị ụtọ, nke bụ́ na Jehova hụrụ nnọọ ndị na-efe ya n’anya. Ha megodị ihe ọjọọ, ọ naghị agbakụta ha azụ ngwa ngwa. Anyị na-amụtakwa na ihe na-emetụ Jehova n’obi, omume anyị nwekwara ike ime ka obi dị ya ụtọ ma ọ bụkwanụ jọọ ya njọ. Olee otú obi dị gị ịmụta nke a? Ò mere ka ime ihe ọma gụwa gị agụụ?

Kama ibi ndụ ọjọọ ma na-akpasu Jehova iwe, anyị kwesịrị ịna-eme ihe dị mma ma na-eme ya obi ụtọ. Ọ bụkwa ihe ọ gwara ndị na-efe ya ka ha na-eme. Ọ sịrị ha: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa.” (Ilu 27:11) O nweghị ihe anyị nwere ike inye Jehova nke karịrị ibi ndụ anyị otú ga-eme ya obi ụtọ.

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Julaị:

Abụ Ọma 60-86

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]

O nweghị ihe anyị nwere ike inye Jehova nke karịrị ibi ndụ anyị otú ga-eme ya obi ụtọ