Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke ò bi ebe Niile?

Chineke ò bi ebe Niile?

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Chineke ò bi ebe Niile?

▪ ỌTỤTỤ okpukpe na-ekwu na Chineke nọ ebe niile. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ́ Katikizim nke Okwukwe Nzukọ Katọlik kwuru na “Chukwu nọ ebe nile.” John Wesley, bụ́ onye bidoro Chọọchị Metọdist, kwukwara ihe yiri nke ahụ. N’okwuchukwu o dere ede nke isiokwu ya bụ “Otú Chukwu Si Nọrọ Ebe Niile,” ọ sịrị na “o nweghị ebe Chukwu na-anọghị, ma n’eluigwe ma n’ụwa ma n’ebe ọ bụla ọzọ.”

Gịnị ka Baịbụl kwuru? Chineke ọ̀ nọ ebe niile? Ò bi ebe niile n’eluigwe, biri n’ụwa, birikwa n’ime ụmụ mmadụ n’otu oge ahụ?

N’eziokwu, Baịbụl kwuru na Chineke bi otu ebe, ya bụ, n’eluigwe. Ọ gwara anyị na Eze Sọlọmọn kpegaara Chineke ekpere, sị: “Gị onwe gị, nọrọ n’eluigwe, bụ́ ebe obibi gị guzosiri ike, nụrụ.” (1 Ndị Eze 8:43) Mgbe Jizọs Kraịst na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere, ọ gwara ha na onye ha ga na-ekpegara ekpere bụ “Nna anyị nke bi n’eluigwe.” (Matiu 6:9) Baịbụl kwuru na mgbe Kraịst si n’ọnwụ bilie, “ọ banyere n’ime eluigwe, ka o wee pụta ugbu a n’ihu Chineke n’onwe ya.”—Ndị Hibru 9:24.

Amaokwu ndị a mere ka o doo anya na Jehova Chineke anọghị ebe niile, kama o bi naanị n’eluigwe. Ma, eluigwe Baịbụl na-ekwu okwu ya n’amaokwu ndị a abụghị eluigwe nkịtị. Eluigwe nkịtị enweghị ike ịba Onye kere eluigwe na ala. (1 Ndị Eze 8:27) Baịbụl gwara anyị na “Chineke bụ Mmụọ.” (Jọn 4:24) O bi n’eluigwe nke ụmụ mmadụ na-anaghị ahụ anya, bụ́ ebe ndị bụ́ mmụọ bi.—1 Ndị Kọrịnt 15:44.

Oleekwanụ maka amaokwu Baịbụl ndị yiri ka hà na-ekwu na Chineke nọ ebe niile? Dị ka ihe atụ, n’Abụ Ọma 139:7-10, Devid kwuru banyere Chineke, sị: “Olee ebe m pụrụ ịga wee gbanahụ mmụọ gị, oleekwa ebe m pụrụ ịgbaga wee pụọ n’ihu gị? Ọ bụrụ na mụ agbagoo n’eluigwe, ị ga-anọ n’ebe ahụ; ọ bụrụkwa na mụ agbasaa ihe ndina m na Shiol, lee! ị ga-anọ n’ebe ahụ. Ọ bụrụ na mụ epuo nku nke chi ọbụbọ, ka m wee biri n’oké osimiri kasị dị anya, aka gị ga na-edukwa m n’ebe ahụ.” Amaokwu ndị a hà na-egosi na Chineke nọ ebe niile, na o bi n’ebe niile ahụ a kpọrọ aha n’amaokwu ndị a?

Ị̀ hụrụ na ajụjụ mbụ Devid jụrụ bụ: “Olee ebe m pụrụ ịga wee gbanahụ mmụọ gị?” * Chineke nwere ike iji mmụọ nsọ ya hụ ihe ọ bụla ọ chọrọ ịhụ, jirikwa ya kpaa ike n’ebe ọ bụla ọ chọrọ n’agarughị ebe ahụ n’onwe ya ma ọ bụkwanụ gaa biri ebiri n’ebe ahụ. Dị ka ihe atụ: N’afọ ole na ole gara aga, ndị ọkà mmụta sayensị enyochaala ájá dị na planet a na-akpọ Maas, bụ́ ebe dị ọtụtụ nde kilomita ma e si n’ụwa anyị a gawa ya. Olee otú ha si nyochaa ájá ndị ahụ? Ha agaghị ebe ahụ n’onwe ha, kama ha zigara rọket, ya esi ebe ahụ na-ezitere ha foto otú ebe ahụ dị, hanwa anọrọ n’ụwa na-ahụ foto ndị ahụ.

Otú ahụ ka ọ dịkwa Jehova Chineke. Ọ dịghị mkpa na ọ ga-anọ ebe niile tupu ya amara ihe na-eme ebe ọ bụla n’eluigwe na n’ụwa. Okwu Chineke sịrị: “Ọ dịghịkwa ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’anya ya.” (Ndị Hibru 4:13) N’eziokwu, mmụọ nsọ Jehova, nke bụ́ ike ya nọ n’ọrụ, nwere ike iru ebe ọ bụla, mee ka Jehova nwee ike isi ‘n’ebe obibi ya dị nsọ bụ́ eluigwe’ na-ahụ ihe niile ma na-emezu ebumnobi ya.—Diuterọnọmi 26:15.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Okwu Hibru a sụgharịrị “mmụọ” n’amaokwu a pụtara ike Chineke nke nọ n’ọrụ, ya bụ, ike Chineke ji emezu uche ya.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 27]

IAC/RGO/David Malin Images