Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È Nwere Onye Na-akpata Ihe Ọjọọ Niile Na-emenụ?

È Nwere Onye Na-akpata Ihe Ọjọọ Niile Na-emenụ?

È Nwere Onye Na-akpata Ihe Ọjọọ Niile Na-emenụ?

“MỤ NA Ekwensu kwere n’aka.” Ihe a ka onyeisi ndị agha nke Òtù Mba Ụwa zigara Rụwanda kwuru. O kwuru ya mgbe ọ na-akọ ihe mere ha na-enweghị ike ịkwụsị ọgụ a lụrụ na Rụwanda n’afọ 1994, bụ́ mgbe a chọrọ igbukpọ otu agbụrụ ná mba ahụ. Onye ọzọ nke hụrụ njinji jiri n’oge ahụ kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na ọ ka nwere onye sị na Setan adịghị, ya bịa ka m gosi ya otu n’ime ili ebe e liri ọtụtụ mmadụ na Rụwanda.” Ajụjụ bụzi, Ọ̀ bụ Ekwensu na-akpata ihe ọjọọ ndị dị otú ahụ?

Ọtụtụ ndị ekweghị na ọ bụ Ekwensu na-eme ka ndị mmadụ na-arụ arụrụala dị iche iche ha na-arụ. Ọtụtụ n’ime ha chere na ime ihe ọjọọ dị ụmụ mmadụ n’ọbara, na ọ bụkwa ya mere ha ji akpa arụ. Ndị ọzọ na-ekwu na e nwere ndị ọgaranya na ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ụwa, bụ́ ndị nọ n’òtù nzuzo. Ha sịrị na kemgbe ọtụtụ afọ, ndị ọgaranya ahụ na-atụ ihe ndị mmadụ na-eme, nakwa na ha na-eme nke a ka ha wee chịwa ụwa. Ma, e nwekwara ndị na-asị na ọ bụ ndị ọchịchị nke mba dị iche iche na-akpata ahụhụ na nsogbu niile dị n’ụwa.

Olee ihe gịnwa chere? Gịnị mere ihe ọjọọ, mpụ, arụrụala, na ahụhụ ji ju ebe niile n’ụwa n’agbanyeghị mgbalị ndị a na-eme ịkwụsị ha? Gịnị mere o ji yie ka ndị mmadụ hà kpọchiri ntị na-eme ihe ọjọọ ndị na-emebiri ha ihe n’agbanyeghị na a na-adọ ha aka ná ntị mgbe niile? È nwere onye mere ha ji eme ihe ọjọọ niile a? Ọ̀ bụ onye n’eziokwu na-achị ụwa? Azịza ya nwere ike iju gị anya.