Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Gịnị mere o ji bụrụ nnụnụ kwel ka Chineke nyere ndị Izrel ka ha rie n’ala ịkpa?

Mgbe ndị Izrel si n’Ijipt pụta, Chineke nyere ha nnụnụ kwel ugboro abụọ ka ha rie.—Ọpụpụ 16:13; Ọnụ Ọgụgụ 11:31.

Kwel bụ obere nnụnụ nke na-eru ihe dị ka sentimita iri na asatọ n’ogologo, ọ naghị ebukwa oké ibu. Ọ bụ ná mba ndị dị n’ebe ọdịda anyanwụ Eshia nakwa na Yurop ka ụmụ nnụnụ a na-anọ eyi àkwá ma bụọ ha. N’oge oké oyi, ha na-efega mba ndị dị n’ebe ugwu Afrịka nakwa Arebia. Ha fegawa n’ebe ndị ahụ, ha na-aga n’ìgwè n’ìgwè fefee Oké Osimiri Mediterenian, si ya fefee ala Saịnaị nke banyere na mmiri.

Otu akwụkwọ nke na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru na nnụnụ kwel “na-efesi nnọọ ike, ọ na-abụkwa ifufe fewe, ha esoro ya ka o buga ha ebe ha na-aga; ma ọ bụrụ na ifufe efegawa ebe ọzọ, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ike gwụrụ ha, ha niile nwere ike ịda n’ala, ike agaghị adịkwa ha ifeli.” Ha nwere ike ịnọ n’ala ebe ahụ otu ụbọchị ma ọ bụ ụbọchị abụọ tupu ha efeliekwa. N’oge ahụ ha nọ n’ala, ọ na-adịziri ndị mmadụ mfe ijide ha. N’ihe dị ka afọ 1920, ndị Ijipt na-esi mba ha ebuga nnụnụ kwel ruru nde atọ ná mba ndị ọzọ kwa afọ.

Ugboro abụọ ahụ ndị Izrel riri nnụnụ kwel bụcha n’oge opupu ihe ubi. Ọ bụ eziokwu na kwel na-efefekarị n’ógbè Saịnaị n’oge opupu ihe ubi, ọ bụ Jehova mere ka ‘oké ifufe fewe’ nke mere nnụnụ ndị ahụ ji febata n’ebe ụmụ Izrel mara ụlọikwuu.—Ọnụ Ọgụgụ 11:31.

Gịnị bụ “ememme nraranye” ahụ e kwuru okwu ya na Jọn 10:22?

Ememme atọ Chineke gwara ndị Juu ka ha na-eme bụ Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko, bụ́ nke a na-eme n’ọnwa Mach ma ọ bụ Eprel, na Ememme Pentikọst, bụ́ nke a na-eme n’ọnwa Mee, nakwa Ememme Ịchịkọbata Ihe, bụ́ nke a na-eme n’oge mgbụsị akwụkwọ. Ma, a na-eme ememme ahụ a kpọrọ aha na Jọn 10:22 ‘n’oge oyi,’ a na-ejikwa ya echeta nke ugboro abụọ a raara ụlọ nsọ dị na Jeruselem nye Jehova, bụ́ nke e mere n’afọ 165 Tupu Oge Anyị. A na-eme ememme a ụbọchị asatọ. Ọ na-amalite n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Kislev, n’oge dị nso n’oge oyi mgbe chi na-eji ngwa ngwa. Gịnị mere e ji bido ime ememme a?

N’afọ 168 Tupu Oge Anyị, eze Siria, bụ́ onye si n’ezinụlọ Seleucus, nke aha ya bụ Antiochus nke Anọ (Epiphanes), kpebiri na ya ga-akwụsị okpukpe ndị Juu na omenala ha niile. N’ihi ya, ọ rụrụ ebe a ga na-achụrụ arụsị àjà n’elu ebe ịchụàjà dị n’ụlọ nsọ Jehova nke dị na Jeruselem. Ọ chụụrụ chi ndị Gris bụ́ Zus àjà n’elu ya.

Ihe ahụ o mere mere ka ndị Juu buso ọchịchị ya agha. Otu nwoke bụ́ onyeisi ndị Juu, nke aha ya bụ́ Judas Maccabaeus, napụtara Jeruselem n’aka ndị eze Siria bụ́ ndị si n’ezinụlọ Seleucus, ma kụtuo ebe ịchụàjà ahụ a nọ n’elu ya chụọrọ arụsị àjà ma rụọ nke ọhụrụ. Ụbọchị mere ya afọ atọ a chụụrụ arụsị àjà n’ebe ịchụàjà ahụ, Judas raara ụlọ nsọ ahụ e mere ka ọ dị ọcha nye Jehova. Kemgbe ahụ, ndị Juu na-eme “ememme nraranye” a (nke a na-akpọ chanuk·kahʹ n’asụsụ Hibru) n’ọnwa Disemba afọ ọ bụla. Taa ihe a na-akpọ ememme ahụ bụ Hanuka.

[Foto dị na peeji nke 14]

Ebe e sere Judas Maccabaeus, Lyon, 1553

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 14]

O si n’akwụkwọ bụ́ Wood’s Bible Animals. 1876