Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ Iwu Na Ị Ga-atụ Ụtụ Isi?

Ọ̀ Bụ Iwu Na Ị Ga-atụ Ụtụ Isi?

Ọ̀ Bụ Iwu Na Ị Ga-atụ Ụtụ Isi?

ỌTỤTỤ ndị anaghị achọ ịtụ ụtụ isi. Ha weere na ụtụ isi ha na-atụ anaghị aba uru. Ha chere na a naghị eji ya emepụta ihe bara uru ma ọ bụ na a na-erikpọ ya erikpọ. Ma, e nwere ndị na-anaghị achọ ịtụ ụtụ isi maka na a na-eji ya eme ihe obi ha na-anabataghị. Ndị bi n’otu obodo kwuru na ha agakwaghị atụ ụtụ isi. Mgbe a jụrụ ha ihe mere ha ji kwuo otú ahụ, ha sịrị: “Ọ bụghị anyị ga na-eweta ego e ji azụta mgbọ e ji agbagbu ụmụ anyị.”

Ọ bụghị ha bụ ndị mbụ na-achọghị ịtụ ụtụ isi. Mgbe Mohandas K. Gandhi bụ́ onye ndú ndị Hindu dị ndụ, o kwuru ihe mere na obi ya anabataghị ịtụ ụtụ isi. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla nke nwere otú o si na-akwado mba ọ bụla ndị agha na-achị, onye ahụ esorola mba ahụ na-eme mmehie. Onye ọ bụla nke na-atụ ụtụ isi e ji egbo mkpa ndị e nwere ná mba ahụ, ma onye ahụ ọ̀ bụ okenye ma ọ bụ nwata, so na-eme mmehie.”

Otu ọkà mmụta nke dịrị ndụ n’oge gara aga, onye aha ya bụ Henry David Thoreau, kwukwara na ihe mere ya ji sị na ya agaghị atụ ụtụ isi e ji elekọta ndị agha bụ na akọnuche ya anabataghị ihe e ji ụtụ isi ahụ na-eme. Ọ jụrụ ajụjụ a: “Nwa amaala obodo ò kwesịrị ịhapụ ndị omeiwu ka ọ bụrụ ha ga-ekpebiri ya ihe ga-adị akọnuche ya mma? Gịnịzi mere onye ọ bụla ji nwee akọnuche nke ya?”

Okwu a gbasara Ndị Kraịst n’ihi na Baịbụl kwuru na Ndị Kraịst kwesịrị inwe akọnuche dị ọcha n’ihe niile. (2 Timoti 1:3) Ma, Baịbụl kwukwara na ndị ọchịchị nwere ikike ịnara ndị mmadụ ụtụ isi. Ọ sịrị: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị ọchịchị, n’ihi na ọ dịghị ọchịchị ọ bụla dị ma ọ́ bụghị Chineke debere ya; ọ bụ Chineke debere ọchịchị ndị dị adị n’ọnọdụ ha nọ n’okpuru ya. Ya mere, e nwere ihe dị mkpa mere unu ga-eji doo onwe unu n’okpuru ya, ọ bụghị naanị n’ihi ọnụma ahụ kamakwa n’ihi [akọnuche] unu. N’ihi na ọ bụ ya mere unu jikwa na-atụ ụtụ isi; n’ihi na ha bụ ndị ozi Chineke na-ejere ọha mmadụ ozi, ndị na-eje ozi dị otú a mgbe niile. Na-enyenụ mmadụ niile ihe ruuru ha, onye e kwesịrị ịtụrụ ụtụ isi, tụọrọnụ ya ụtụ isi.”—Ndị Rom 13:1, 5-7.

Ọ bụ nke a mere Ndị Kraịst oge mbụ ji tụọ ụtụ isi n’agbanyeghị na ụtụ isi a na-atụ mgbe ahụ na-alakarị n’isi ndị agha. Ndịàmà Jehova n’oge a na-atụkwa ụtụ isi. * Gịnị mere Onye Kraịst ga-eji na-atụ ụtụ isi mgbe e ji ụtụ isi ahụ na-eme ihe akọnuche ya na-anabataghị? Onye Kraịst ò kwesịrị ileghara akọnuche ya anya mgbe a chọrọ ka ọ tụọ ụtụ isi?

Ihe Gbasara Ịtụ Ụtụ Isi na Akọnuche Anyị

Ọ dị mma ịmara na ụfọdụ n’ime ego Ndị Kraịst oge mbụ tụrụ n’ụtụ isi lara n’isi ndị agha. Ọ bụkwa otu ihe a mere Gandhi na Thoreau ji kwuo na ha agaghị atụ ụtụ isi.

Ma, ị̀ hụrụ na ihe mere Ndị Kraịst ji mee ihe ahụ e kwuru ná Ndị Rom isi 13 abụghị naanị n’ihi na ha achọghị ka a taa ha ahụhụ, kamakwa ‘n’ihi akọnuche’ ha? (Ndị Rom 13:5) N’eziokwu, akọnuche Onye Kraịst kwesịrị ime ka ọ na-atụ ụtụ isi, ọ sọgodị ya ya bụrụ na e ji ya na-eme ihe yanwa na-akwadoghị. Ihe ga-enyere anyị aka ịmata ihe mere Onye Kraịst ga-eji eme ihe a akọnuche ya na-akwadoghị bụ ịghọta otu ihe dị mkpa banyere akọnuche anyị, nke bụ́ olu na-agwa anyị ma ihe anyị mere ọ̀ dị mma ka ọ̀ dị njọ.

Dị ka Thoreau kwuru, onye ọ bụla nwere akọnuche, ma nke a apụtaghị na akọnuche anyị na-agwa anyị eziokwu mgbe niile. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị Chineke mma, ihe akọnuche anyị na-agwa anyị ga-ekwekọrịrị n’iwu ya. Ebe ọ bụ na otú Chineke si ele ihe anya ma ọ bụ otú o si eche echiche karịrị nke anyị, ọtụtụ mgbe, ọ na-adị mkpa ka anyị gbanwee otú anyị si ele ihe anya ka o kwekọọ n’otú Chineke si ele ihe anya. (Abụ Ọma 19:7) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgbalị ghọta otú Chineke si ele ndị ọchịchị anya. Olee otú o si ele ha anya?

Cheta na Pọl onyeozi sịrị na ndị ọchịchị bụ “ndị ozi Chineke [ndị] na-ejere ọha mmadụ ozi.” (Ndị Rom 13:6) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? Ihe ọ pụtara bụ na ndị ọchịchị na-eme ka udo dị n’obodo, na-arụkwara ọhaneze ọrụ bara uru. Ndị ọchịchị ndị na-achịgbu ụmụ amaala ha achịgbu na-emedịrị ha ihe ụfọdụ dị mkpa, dị ka ịrụrụ ha ụlọ akwụkwọ, ụlọ ọgwụ, na inye ha ọkụ eletrik. Ọ bụ eziokwu na Chineke ma nnọọ ihe na-adịghị mma ndị ọchịchị na-eme, ọ hapụgodịrị ha ma nye anyị iwu ka anyị na-atụ ụtụ isi. Anyị kwesịrị ime nke a iji gosi na anyị ghọtara na ọ bụ Chineke hapụrụ ndị ọchịchị ka ha na-achị.

Ma, Chineke agaghị ahapụ ndị mmadụ ka ha na-achị ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-eji Alaeze ya nke ga-esi n’eluigwe chịa dochie ọchịchị ụmụ mmadụ ma kwụsị nsogbu niile ọchịchị ndị a kpatarala kemgbe ụwa. (Daniel 2:44; Matiu 6:10) Ka ọ dịgodị, Chineke achọghị ka Ndị Kraịst na-enupụrụ ndị ọchịchị isi ma ọ bụ jụ ịtụ ụtụ isi.

Ma, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ ka dị gị ka ịtụ ụtụ isi e ji elekọta ndị agha ọ̀ bụ ihe ọjọọ otú ahụ ọ dị Gandhi? Otú ahụ ọ na-abụ mmadụ chọọ ịhụ ihe nke ọma, ya agbagoro ebe dịtụ elu, otú ahụkwa ka ọ ga-adịrị anyị mfe ịgbanwe echiche anyị ka o kwekọọ n’echiche Chineke ma ọ bụrụ na anyị echee echiche ghọta na otú Chineke si ele ihe anya karịrị nnọọ otú anyị si ele ihe anya. Chineke si n’ọnụ Aịzaya onye amụma kwuo, sị: “Dị ka eluigwe dị elu karịa ụwa, otú ahụ ka ụzọ m dị elu karịa ụzọ unu, otú ahụkwa ka echiche m dị elu karịa echiche unu.”—Aịzaya 55:8, 9.

È Kwesịrị Irubere Ha Isi n’Ihe Niile?

Na Baịbụl kwuru na e kwesịrị ịtụrụ ndị ọchịchị ụtụ isi apụtaghị na ndị a na-achị achị ga-erubere ndị ọchịchị isi n’ihe niile. Jizọs kwuru na Chineke nyere ndị ọchịchị a ikike, ma ọ bụghị n’ihe niile. Mgbe a jụrụ Jizọs ma Chineke ọ̀ kwadoro ka a tụwara ọchịchị Rom nke na-achị n’oge ahụ ụtụ isi, ọ zara, sị: “Kwụọnụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.”—Mak 12:13-17.

Ọ bụ “Siza,” nke pụtara ndị ọchịchị, na-akpụ ma na-ebipụta ego, ọ bụkwa ha na-ekpebi ego ole ego ọ bụla e wepụtara ga-abụ. N’ihi ya, n’anya Chineke, ha nwere ikike isi n’ụtụ isi nara ndị mmadụ ego ahụ ha wepụtara. Ma, Jizọs gosiri na o nweghị ọchịchị kwesịrị ịnara ihe ndị bụ́ “ihe Chineke,” ya bụ, ndụ anyị na ofufe anyị. Mgbe ọ bụla ndị ọchịchị nyere iwu ka Ndị Kraịst mee ihe iwu Chineke na-akwadoghị, Ndị Kraịst “aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.

O nwere ike na-ewute Ndị Kraịst ma ha cheta ihe ndị ọchịchị ji ego ụfọdụ ha na-atụ n’ụtụ isi eme, ma ha ekwesịghị ịgbawa ndị ọchịchị mgba okpuru ma ọ bụ jụ ịtụ ụtụ isi iji mee ka ndị ọchịchị gbanwee ihe ha na-eme. Ọ bụrụ na Ndị Kraịst emee otú ahụ, ihe ọ pụtara bụ na obi esighị ha ike na Chineke ga-akwụsịli ahụhụ ndị mmadụ na-ata. Kama ime otú ahụ, ha ga-enwe ndidi ruo oge Chineke ga-esi n’aka Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, dozie nsogbu niile ụmụ mmadụ na-enwe. Jizọs kwuru banyere ọchịchị ya, sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.”—Jọn 18:36.

Uru Ndị Ị Ga-erite ma I Mee Ihe Baịbụl Kwuru

E nwere ọtụtụ uru ị ga-erite ma i mee ihe Baịbụl kwuru banyere ịtụ ụtụ isi. A gaghị ata gị ahụhụ a na-ata ndị na-anaghị atụ ụtụ isi, ị gaghịkwa na-atụ ụjọ na e nwere ike ijide gị. (Ndị Rom 13:3-5) Nke ka mkpa bụ na ị ga-enwe akọnuche dị ọcha n’ihu Chineke, ị ga-ewetakwara ya otuto ma ọ bụrụ na ị na-erube isi. Ọ bụ eziokwu na ịtụ ụtụ isi nwere ike ime ka ị na-emefu ego karịa ndị na-anaghị atụ ụtụ isi ma ọ bụ ndị na-anaghị atụ ego ole ha kwesịrị ịtụ, obi sie gị ike na Chineke ga-elekọta gị n’ihi na o kwere nkwa ilekọta ndị na-erubere ya isi. Devid bụ́ onye so dee Baịbụl kwuru, sị: “Ọ dị mgbe m bụ nwata, emewokwa m agadi, ma ahụbeghị m ka a hapụrụ onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume kpamkpam, ahụbeghịkwa m ụmụ ya ka ha na-arịọ nri.”—Abụ Ọma 37:25.

Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na gị aghọta ihe mere Baịbụl ji kwuo ka anyị na-atụ ụtụ isi ma na-eme ihe ahụ o kwuru, obi ga-eru gị ala. Chineke agaghị ajụ gị ajụjụ maka ihe niile ndị ọchịchị ji ego ị tụrụ n’ụtụ isi mee, otú ahụ ọ na-enweghị onye ga-ajụ gị ajụjụ maka ihe onye i bi n’ụlọ ya ji ụgwọ ụlọ ị kwụrụ ya mee. Tupu otu nwoke a na-akpọ Stelvio, bụ́ onye obodo ya dị n’ebe ndịda Yurop, amụta eziokwu dị na Baịbụl, ọ gbara mbọ ọtụtụ afọ ime ka ndị ọchịchị obodo ya gbanwee otú ha si na-achị. O mechara kwuo ihe mere o ji kwụsị mbọ ahụ ọ nọ na-agba. Ọ sịrị: “Abịara m ghọta na ụmụ mmadụ enweghị ike ime ka ihe ruoro onye ọ bụla otú o ruuru ibe ya, ha enweghịkwa ike iweta udo ma ọ bụ mee ka mmadụ niile dịrị n’otu. Ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme ka ihe dịrị onye ukwu na onye nta mma.”

Ọ bụrụ na i jiri obi gị niile ‘na-akwụ Chineke ihe Chineke’ otú Stelvio na-eme ugbu a, ị ga-ahụkwa mgbe Chineke ga-eweta ọchịchị ezi omume nke ga-achị ụwa niile, bụ́ nke ga-ewepụ nsogbu niile ọchịchị ụmụ mmadụ na-akpata.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụkwu ihe gosiri na Ndịàmà Jehova na-atụ ụtụ isi, gụọ Ụlọ Nche, November 1, 2002, peeji nke 13, paragraf nke 15, nakwa nke May 1, 1996, peeji nke 17, paragraf nke 7.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]

Ọ dị mkpa ka anyị gbanwee otú anyị si eche echiche ka o kwekọọ n’otú Chineke si eche echiche n’ihi na otú o si eche echiche karịrị nke anyị

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 23]

Ọ bụrụ na Ndị Kraịst na-atụ ụtụ isi ha, ha ga-enwe akọnuche dị ọcha n’ihu Chineke, gosikwa na obi siri ha ike na Chineke ga-egboro ha mkpa ha

[Foto dị na peeji nke 22]

“Kwụọnụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Copyright British Museum