Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Gịnị mere e ji nwee ndị na-agbanwe ego n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem?

Obere oge tupu Jizọs anwụọ, o nwere ihe o mere banyere otu ihe ọjọọ a nọ na-eme n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Baịbụl kwuru, sị: “Jizọs wee . . . chụpụ ndị niile na-ere ma na-azụ ahịa n’ime ụlọ nsọ ahụ, o kpukwara tebụl nke ndị na-agbanwe ego na oche nke ndị na-ere nduru ihu. O wee sị ha: ‘E dere, sị, “A ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere,” ma unu na-eme ya ọgba nke ndị na-apụnara mmadụ ihe.’”—Matiu 21:12, 13.

N’oge ahụ, ndị Juu na ndị a tọghatara n’ofufe ndị Juu na-esi n’obodo dị iche iche abịa n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem, ha na-ejikwa ego e nwere n’obodo ndị ahụ abịa. Ma, ọ bụ naanị mkpụrụ ego drakma (ma ọ bụ didrakma ma ọ bụkwanụ tetradrakma) ka a chọrọ ka ha jiri tụọ ụtụ isi a na-atụ kwa afọ maka ụlọ nsọ, zụta anụmanụ ndị ha ga-eji achụ àjà, ọ bụkwa ya ka ha ga-eji nye onyinye ndị ọzọ. N’ihi nke a, ndị na-agbanwe ego na-agbanwere ndị mmadụ mkpụrụ ego ndị ha ji bịa ma nyezie ha nke ha chọrọ. Ma ha na-ana ha ego maka ịgbanwere ha ego ndị ahụ. Oge ememme dị iche iche ndị Juu na-eme ruwe, ndị ahụ na-agbanwe ego na-edebe tebụl ha n’ebe ndị Jentaịl na-anọ n’ụlọ nsọ ahụ.

O doro anya na ihe mere Jizọs ji kwuo na ndị ahụ na-agbanwe ego na-eme ụlọ nsọ ahụ “ọgba nke ndị na-apụnara mmadụ ihe” bụ na ha na-ana ndị mmadụ nnukwu ego iji gbanweere ha ego.

Gịnị mere e ji jiri osisi oliv kpọrọ ihe n’oge Baịbụl?

Osisi oliv na ubi vaịn so n’ihe ndị Chineke gwara ndị ya na ya ga-eji gọzie ha ma ha rubere ya isi. (Diuterọnọmi 6:10, 11) Ruokwa taa, ndị bi n’obodo ebe ndị e nwere osisi oliv anaghị eji ya egwuri egwu. Ọ bụrụgodị na a naghị elekọtacha ya anya, o nwere ike ịna-amị mkpụrụ nke ọma ruo ọtụtụ narị afọ. Osisi oliv torola eto nwedịrị ike ime nke ọma n’ala okwute, ọ naghịkwa anwụ ma ọ bụrụ na mmiri ezoghị ruo ogologo oge. E gbutugodị ya, ọ na-esi n’úkwù ya pupute ndị nke ọhụrụ.

N’oge Baịbụl, a naghị eji ụgbụgbọ osisi oliv na akwụkwọ ya egwuri egwu n’ihi na a na-eji ha agwọ ahụ́ ọkụ. A na-ejikwa esó na-esi ísì ọma, nke na-agbapụta n’alaka ya ndị karala aka, eme sent. Ma, isi ihe mere osisi oliv ji baa uru bụ na a na-eri ma mkpụrụ ya ma mmanụ ya eri. Ọkara ihe na-adị n’ime mkpụrụ oliv chara acha bụ mmanụ ma e wezụga mkpụrụ dị n’ime ya.

E nwere ike isi n’otu osisi oliv ahụ́ dị mma nweta galọn mmanụ iri na ise n’otu afọ. A na-ejikwa mmanụ oliv amụ ọkụ, na-eji ya eme ihe n’oge ememme dị iche iche, na-ete ya n’ahụ́ nakwa n’isi, na-etekwa ya n’ọnyá ma ọ bụ n’ebe mmadụ chihịara ahụ́.—Ọpụpụ 27:20; Levitikọs 2:1-7; 8:1-12; Rut 3:3; Luk 10:33, 34.