Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

OTU nwa agbọghọ a kụziiri Baịbụl mgbe ọ bụ nwata hapụrụ ihe a kụziiri ya kpawa àgwà ọjọọ. Gịnị mere o ji bidokwa ife Chineke? Gụọ ihe o kwuru.

“Ndụ M Enweela Isi Ugbu A.”—LISA ANDRÉ

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1986

ABỤ M ONYE: LỌKSEMBỌG

NDỤ M BIRI: ABỤ M NWA NNUPỤISI

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Etoro m na Betrange bụ́ otu obere obodo dị nso na Lọksembọg. Obodo a na-adị ọcha, e nwekebeghị ndị na-eme ihe ike na ya, ọtụtụ ndị bi na ya bakwara ọgaranya. Anyị dị ụmụ ise n’ezinụlọ anyị, abụkwa m nke ikpeazụ. Ndị mụrụ m bụ Ndịàmà Jehova, ha gbalịsikwara ike kụziere mụ na ụmụnne m iwu Chineke.

Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na atọ, enwewere m obi abụọ ma ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi hà bụkwa eziokwu. Ná mbido, o nweghị ihe m mere maka obi abụọ ahụ m na-enwe, okwukwe m ejirizie nwayọọ nwayọọ na-anyụ ka ọkụ. Ndị mụrụ m gbalịrị ike ha niile ka ha mee ka m mewe ihe Chineke chọrọ, ma ekweghị m. Ana m ezoro ezoro na-eso ụmụaka isi ike. Achọrọ m ịdị ka ha ka m nwee ike ịna-eme ihe ọ bụla masịrị m. Anyị na-agakarị oriri na nkwari, na-akwa iko aghara aghara, na-aṅụ ọgwụ ike, na-aṅụkwa oké mmanya. N’oge ahụ, obi na-atọ m ụtọ n’ihi na ọ dị m ka ọ̀ bụ ndị ahụ mụ na ha na-akpa ma otú e si ekpori ndụ.

Ma nke bụ́ eziokwu bụ na anaghị m enwe ezigbo obi ụtọ. Ụdị ndụ mụ na ndị enyi m ahụ na-ebi enweghị isi; o nweghị ihe ha na-eji akpọrọ ihe. Ma ihe ọjọọ ndị juru n’ụwa, dị ka otú e si na-emegbu ndị mmadụ, nọ na-echu m ụra. Ka oge na-aga, ike ụwa gwụrụ m.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Mgbe m dị afọ iri na asaa, o nwere otu ụbọchị obi nọ na-ajọ m ezigbo njọ. Mama m hụrụ na obi adịghị m mma, ya agwa m ka m jisie ike malitekwa mụwa Baịbụl. Ọ gbara m ume ka m leba anya n’ihe Baịbụl na-akụzi ma kpebizie n’onwe m ma m̀ ga-ebi ndụ otú Baịbụl kwuru ma ọ bụ na m gaghị ebi. Ụka a mụ na mama m kparịtara gbanwere ndụ m. Ekwetara m ka nwanne m nwaanyị, bụ́ Caroline, na di ya bụ́ Akif mụwara m Baịbụl. Di nwanne m nwaanyị a aghọọla dimkpa tupu ya aghọọ Onyeàmà Jehova. Ebe ọ bụ na m na-achọ onye m ga-akọrọ obi m, ama m na ọ ga-adịrị m mfe ịkọrọ ya di nwanne m nwaanyị ahụ n’ihi ụdị ndụ o biri tupu ya aghọọ Onyeàmà Jehova.

Ama m na ụdị ndụ m na-ebi abụghị ụdị ndụ Onyeàmà Jehova kwesịrị ibi, ma echeburu m na otú m si ebi ndụ m enweghị onye ọ gbasara. Ma mgbe m mụwara Baịbụl, achọpụtara m na àgwà m na-ewute Jehova. (Abụ Ọma 78:40, 41; Ilu 27:11) Achọpụtakwara m na ọ na-ewute ndị ọzọ.

Ka m na-amụkwu Baịbụl, abịara m chọpụta na e nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji kwere na Baịbụl bụ Okwu Chineke. Dị ka ihe atụ, ahụrụ m ọtụtụ amụma ndị e buru na Baịbụl bụ́ ndị mechara mezuo nnọọ otú ahụ e si buo ha. Ihe ndị a m na-amụta nyeere m aka ịghọta na ihe ndị a na-akụziri m bụ eziokwu.

Mgbe m mụrụ Baịbụl ihe dị ka otu afọ, mụ na ndị mụrụ m gara leta nwanne m nwoke nke na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Jamanị. Otú nwanne m nwoke si enwe obi ụtọ masịrị m. Ọ bụ ụdị obi ụtọ a ka m chọwara otú m ga-esi na-enwe ya kemgbe! Obi tọkwara m ụtọ mgbe m hụrụ Ndịàmà Jehova ndị ọzọ na-arụ ọrụ n’ebe ahụ. Ha dị nnọọ iche ná ndị mụ na ha na-akpabu, bụ́ ndị na-anaghị akwụwa aka ọtọ, ndị mkpa ha bụ naanị ịchọ ihe ha ga-eji na-eme onwe ha obi ụtọ. Obere oge anyị si ebe ahụ lọta, eji m obi m niile kpegara Jehova ekpere ma gwa ya na m ga-eji ndụ m niile jeere ya ozi. Mgbe m dị afọ iri na itoolu, e mere m baptizim iji gosi na enyefeela m Jehova ndụ m niile.

URU NDỊ M RITERELA: Ndụ m enweela isi ugbu a. Obi na-atọ m ụtọ ịkụziri ndị ọzọ Baịbụl, si otú ahụ na-enyere ha aka ịmụta banyere Jehova na ihe ndị o kwere nkwa ime n’ọdịnihu. Mgbanwe a m mere bakwaara ndị ezinụlọ anyị uru, ha anaghịzi anwụ n’echiche maka m.

Ama m ihe ọjọọ ndị m mere n’oge gara aga, ma ana m agbalị ka m ghara ịna-eche banyere ha. Kama nke ahụ, ana m echeta na Jehova na-agbaghara ndị mere ihe ọjọọ mmehie ha, na-echetakwa na ọ hụrụ m n’anya. Ekwenyesiri m ike n’ihe ahụ e kwuru n’Ilu 10:22, bụ́ ebe sịrị: “Ọ bụ ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghịkwa atụkwasị ihe mgbu na ya.”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]

“Anyị na-agakarị oriri na nkwari, na-akwa iko aghara aghara, na-aṅụ ọgwụ ike, na-aṅụkwa oké mmanya”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]

“Ama m ihe ọjọọ ndị m mere n’oge gara aga, ma ana m agbalị ka m ghara ịna-eche banyere ha”