Eziokwu Nwere Ike Ịgbanwe Ndụ Gị
Eziokwu Nwere Ike Ịgbanwe Ndụ Gị
O NWERE ike ịbụ na ị nụtụla otu n’ime ụgha ndị ahụ e kwuru okwu ha n’isiokwu ndị bu ụzọ, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na a kụzierela gị ya. Ma, ọ ka nwere ike ịna-esiri gị ike ịgbanwe ihe ndị i kweere, nke ka nke ma ọ bụrụ na ọ dịla anya i kweere ha.
O doro anya na o nweghị onye ọ na-adịrị mfe ịgbanwe ihe o kweere. Na chọọchị ụfọdụ, a na-agwadị ndị mmadụ na ha ekwesịghị ilebawa anya na Baịbụl iji mara ma ihe a na-akụziri ha ọ̀ bụkwa eziokwu. Chọọchị ndị ọzọ na-achọrọ ụzọ ha ga-esi egosi na nkụzi ụgha ha na-akụzi enweghị ihe o mere. Ha na-asị na Baịbụl bụ oké ọhịa, na a naghị epiocha ya epiocha, nakwa na e deghị ya ka mmadụ niile ghọta ya. Ma, o sighịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs ike ịghọta ihe Jizọs kụziiri ha, n’agbanyeghị na ọtụtụ n’ime ha bụ ndị nkịtị na ndị na-agụghị oké akwụkwọ.—Ọrụ 4:13.
O nwekwara ike ị gaghị achọ ịmụ Baịbụl iji mara ma ihe ndị i kweere hà bụkwa eziokwu n’ihi na ọ ga-adị ka ọ̀ bụ na okwukwe gị esighịzi ike. Ma ì chere na Chineke ga-ewe iwe na ị mụrụ Baịbụl, bụ́ Okwu ya o nyere ụmụ mmadụ, ka i wee mụta ihe ọ chọrọ ka i mee? Mbanụ, kama nke ahụ, Okwu ya na-agba gị ume ka i jiri aka gị nyochaa Akwụkwọ Nsọ. Baịbụl sịrị: “Chọpụta n’onwe unu ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.”—Ndị Rom 12:2.
Ihe mere o ji dị mkpa ka ị mata eziokwu banyere Chineke abụghị naanị ka ị mụta ihe ọhụrụ, kama ọ bụ n’ihi na o nwere ike ime ka ndụ gị ka mma. (Jọn 8:32) Deanne, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya n’isiokwu nke mbụ, emeela ka okwukwe ya sie ike n’Okwu Chineke. Ọ sịrị: “Ọ bụ mgbe m bidoro mụwa Akwụkwọ Nsọ ka m matara na ihe niile e dere na ya doro anya ma dị mfe nghọta. Ugbu a amatala m na Jehova bụ Nna m nke eluigwe, onye hụrụ m n’anya, ọ bụghị onye ihe gbasara m na-anaghị emetụ n’obi. Ndụ m enweela isi ugbu a.”
O nwere ike ịbụ na o nweela mgbe ị mụrụ Baịbụl, ma ya adị gị ka o nweghị ihe ị mụtara. Ọ bụrụ otú ahụ, ike agwụla gị. Ọ bụrụ na ihe a kụziiri gị banyere Chineke bụ ụgha, mbọ ị na-agba ịghọta Baịbụl ga-adị ka ịga ebe ị na-agatụbeghị mbụ, ya abụrụkwa na ụzọ onye ị jụrụ ajụjụ gosiri gị abụghị ụzọ e si aga ebe ahụ. I biligodị n’isi ụtụtụ gawa, ị ga-efugide ụzọ ruo mgbe ike ga-agwụ gị. Ọ bụrụ na ị chọrọ iru ebe ị na-aga, ihe ị ga-eme bụ ịgba mbọ mata nke bụ́ ụzọ e si aga ebe ahụ.
Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ịmata eziokwu banyere Chineke? Anyị na-agba gị ume ka ị kpọtụrụ Ndịàmà Jehova bi n’ógbè gị ma ọ bụ ka i jiri adres nke kwesịrị ekwesị n’ime adres ndị e depụtara na peeji nke 4 na magazin a detara anyị akwụkwọ ozi na ị chọrọ ka mmadụ bịa mụwara gị Baịbụl n’ụlọ gị n’efu.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]
“Chọpụta n’onwe unu ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.”—NDỊ ROM 12:2