Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee otú e si enweta ego ndị e ji egbo mkpa ndị e nwere n’ụlọ nsọ Jehova dị na Jeruselem?

Ebe e si enweta ego e ji egbo mkpa ndị e nwere n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem bụ n’ụtụ ndị mmadụ na-atụ, karịchaa ụtụ otu ụzọ n’ụzọ iri nke iwu ji onye Izrel ọ bụla ịtụ. Ma, e nwekwara ụtụ ndị ọzọ a na-atụ maka ụlọ nsọ ahụ. Dị ka ihe atụ, n’oge a na-arụ ụlọikwuu Jehova, Jehova nyere Mozis iwu ka ọ nata onye Izrel ọ bụla e debara aha ya n’akwụkwọ ọkara shekel ọlaọcha nke bụ́ “onyinye a na-enye Jehova.”—Ọpụpụ 30:12-16.

O yiri ka ọ̀ bụ otú ahụ ka ndị Juu si bidozie ịtụ ọkara shekel ọlaọcha kwa afọ maka ụlọ nsọ. Ọ bụ ụtụ a ka Jizọs gwara Pita ka o were otu mkpụrụ ego o nwetara n’ọnụ azụ̀ gaa tụọ.—Matiu 17:24-27.

Afọ ole na ole gara aga na Jeruselem, a hụrụ ụdị mkpụrụ ego ọlaọcha abụọ ndị e ji atụ ụtụ maka ụlọ nsọ. A hụrụ otu n’ọwa mmiri a rụrụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga. A kpụkwara mkpụrụ ego shekel a na Taya n’afọ 22 O.A. (Oge Anyị). N’ihu mkpụrụ ego a, e sere isi Melkat, ma ọ bụ Bel, bụ́ chi ọtụtụ ndị bi na Taya na-efe. N’azụ ya, e sekwara ugo nke beere n’ihu ụgbọ mmiri. Ebe a hụrụ mkpụrụ ego nke ọzọ bụ n’ihe ndị e kpopụtasịrị n’ebe ụlọ nsọ ahụ dịbu. A kpụkwara ya mgbe ndị Juu malitere inupụrụ ndị Rom isi, ya bụ, n’agbata afọ 66 O.A. na afọ 67 O.A. E sere otu iko na alaka osisi nke mkpụrụ pọmigranet atọ na-amịpụta na ya ná mkpụrụ ego a, deekwa “Ọkara Shekel” na “Jeruselem Dị Nsọ” na ya. Ọka mmụta bụ́ Gabriel Barkay kwuru na ‘e nwere ihe ndị gosiri na ọkụ gbara mkpụrụ ego ahụ, ọ ga-abụkwa mgbe a gbara ụlọ nsọ ahụ a rụgharịrị arụgharị ọkụ n’afọ 70 O.A. ka ọkụ ahụ gbara ya.’

Olee otú ihe dị iche iche Nebukadneza, bụ́ eze Babịlọn, rụrụ maruru ná mma ma buruo n’ibu?

Na Baịbụl, akwụkwọ Daniel sịrị na Nebukadneza kwuru, sị: “Nke a ọ́ bụghị Babịlọn Ukwu ahụ, nke mụ onwe m ji nnukwu ike m wuo ka ọ bụrụ ebe obibi eze nakwa iji mee ka ebube m dị ukwuu?” (Daniel 4:30) Obodo ahụ ọ̀ bụ nnukwu obodo n’eziokwu?

Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru na Nebukadneza rụrụ ọtụtụ ụlọ arụsị, obí eze, mgbidi, nweekwa ubi ndị magburu onwe ha. Ụlọ arụsị kachanụ ọ rụrụ n’etiti obodo Babịlọn nwere ụlọ nche nke ịdị elu ya nwere ike ịkarị mita iri asaa. Ma, akwụkwọ bụ́ Babylon—City of Wonders kwuru na “n’ime ihe niile [Nebukadneza] rụrụ, ndị nke a kacha mara amara bụ Okporo Ámá E Si Agafe n’Oge Ememme nakwa Ọnụ Ụzọ Ámá Ishta. Okporo ámá ahụ si n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ishta gafere, a tụkwara ọdụm ndị yiri ka hà na-aga ije n’ahụ́ mgbidi ya niile. Akwụkwọ ahụ kwukwara banyere ọnụ ụzọ ámá ahụ, bụ́ ọnụ ụzọ ámá kachanụ e nwere na Babịlọn, sị: “E ji brik ndị na-acha anụnụ anụnụ ma na-egbuke egbuke chọọ ahụ́ ọnụ ụzọ ámá ahụ mma, tụọkwa ọtụtụ oké ehi na dragọn ndị yiri ka hà na-aga ije na ya. Onye ọbịa ọ bụla nke hụrụ ihe ndị a agaghị echefu ha echefu.”

N’ihe dị ka afọ 1913, ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie gwupụtara ọtụtụ ihe ndị e ji rụọ Okporo Ámá E Si Agafe n’Oge Ememme nakwa Ọnụ Ụzọ Ámá Ishta. Ha ji ihe ndị ahụ ha gwupụtara rụgharịa okporo ámá ahụ na ọnụ ụzọ ámá ahụ n’ebe a na-egosi ihe ndị mgbe ochie nke dị n’obodo Belin, ná mba Jamanị.

[Foto dị na peeji nke 12]

Otú a ka mkpụrụ ego ndị ahụ na-aha

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Ndị nke dị n’elu: Clara Emit, Courtesy of Israel Antiquities Authority; ndị nke dị n’ala: Zev Radovan

[Foto dị na peeji nke 12]

Ọnụ Ụzọ Ámá Ishta nke ahụ a rụgharịrị arụgharị