Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Dị Mkpa Ịmata Ihe O Kwuru?

Ọ̀ Dị Mkpa Ịmata Ihe O Kwuru?

Ọ̀ Dị Mkpa Ịmata Ihe O Kwuru?

“Ọ bụ mgbe m dị afọ iri ka mụ na ụmụ nwoke malitere ịkpa. Ná mbido, naanị ihe mụ na ha na-eme bụ ijide aka na isusu ọnụ. Ma ka oge na-aga, mụ na ha malitere imetụ ibe anyị aka n’ebe ndị na-adịghị mma. Mgbe m dị afọ iri na ise, ebidoro m ịrụ ọrụ, ụmụ nwoke ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ na-abịakwutekwa m ka mụ na ha nwee mmekọahụ. Ebe ọ bụ na achọghị m ka ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ were m ka onye ụjọ, esooro m ha na-eme ihe niile ha na-eme. Achọrọ m ka mụ na ha na-adị ná mma, nke a mere ka m kwawazie iko.”—SARAH, * ONYE ỌSTRELIA.

Ị̀ GA-EKWETA na Sarah si n’ezinụlọ ji ofufe Chineke kpọrọ ihe? Ndị mụrụ ya kụziiri ya ka ọ na-ebi ndụ otú Baịbụl kwuru. Ma, Sarah kpebiri ime otú masịrị ya.

Ọtụtụ ndị nwere ike ịsị na o nweghị ihe dị njọ n’otú ahụ Sarah kpebiri isi bie ndụ ya. Ndị dị otú ahụ na-eche na ihe Baịbụl kwuru banyere mmekọahụ abụghịzi maka oge anyị a. Ndị ọzọ na-ewere ya na o nweghị ihe dị njọ ma onye na-efe Chineke na-akwa iko.

Ò nwere ihe o mere ma ọ bụrụ na mmadụ amaghị ihe Baịbụl kwuru banyere mmekọahụ ma ọ bụkwanụ ma ọ bụrụ na mmadụ anaghị edebe iwu Baịbụl nyere banyere mmekọahụ? Baịbụl kwuru na ihe niile e dere na ya ‘si n’ike mmụọ nsọ Chineke, na ọ bakwara uru iji ya zie ihe.’ (2 Timoti 3:16) Ọ bụrụ na i kweere na ọ bụ Chineke kere mmadụ, kwerekwa na Baịbụl bụ Okwu ya, ị ga-ekweta na ọ bara uru ịmata ihe Baịbụl kwuru banyere mmekọahụ.

Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị amaghị ihe Baịbụl kwuru banyere mmekọahụ. Ndị ndú okpukpe, bụ́ ndị sị na ha kweere na Baịbụl, anaghị akụzi otu ihe n’okwu banyere mmekọahụ. N’eziokwu, okwu banyere mmekọahụ ekewaala ọtụtụ chọọchị ndị a ma ama.

Kama ikwere ihe ndị ọzọ na-ekwu banyere mmekọahụ, ọ́ gaghị adị mma ka i wepụta obere oge chọpụta ihe Baịbụl kwuru n’okwu a? Isiokwu na-esonụ ga-eleba anya n’ajụjụ iri a na-ajụkarị maka ihe Baịbụl kwuru banyere mmekọahụ. N’isiokwu ahụ, ị ga-ahụ otú Baịbụl si zaa ajụjụ ndị ahụ nke ọma. Isiokwu nke ga-eso nke ahụ ga-eleba anya n’ihe mere ị ga-eji saa anya na mmiri kpebie ihe ị ga-eme n’okwu a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Aha a abụghị ezigbo aha ya.