Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịrụ Ọrụ Dịịrị Anyị n’Ebe Chineke Nọ

Ịrụ Ọrụ Dịịrị Anyị n’Ebe Chineke Nọ

Bịaruo Chineke Nso

Ịrụ Ọrụ Dịịrị Anyị n’Ebe Chineke Nọ

Ò NWETỤLA mgbe ị jụrụ onwe gị, sị: ‘Gịnị mere anyị ji dịrị ndụ?’ Jehova kere ụmụ mmadụ otú ha ga-enwe ike ịjụ ụdị ajụjụ a nakwa otú ọ ga-agụ ha agụụ ịmata azịza ya. Obi dị anyị ụtọ na Chineke, bụ́ onye hụrụ anyị n’anya, egosila anyị ebe anyị ga-aga nweta azịza ya. Anyị ga-enweta ya n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. Legodị ihe Eze Sọlọmọn kwuru n’Ekliziastis 12:13.

Ihe ndị mere ná ndụ Sọlọmọn mere ka ọ dịrị ya mfe ikwu ihe ga-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ ná ndụ nakwa ihe ga-eme ka ndụ mmadụ nwee isi. Sọlọmọn nwere amamihe pụrụ iche, nwee akụnụba dị ukwuu, bụrụkwa eze. N’ihi ya, ọ dịịrị ya mfe ileba nnọọ anya n’ihe ụmụ mmadụ na-achọsi ike ná ndụ, dị ka akụnụba na ịbụ ndị a ma ama. (Ekliziastis 2:4-9; 4:4) O mechara si n’ike mmụọ nsọ kwuo ihe ọ chọpụtara. Ọ sịrị: “Ihe bụ́ nkwubi okwu bụ: Tụọ egwu ezi Chineke, debekwa ihe o nyere n’iwu. N’ihi na ọ bụ ya bụ ọrụ dum dịịrị mmadụ.” Ihe a Sọlọmọn kwuru bụ ihe kacha mma na ihe kacha baa uru mmadụ nwere ike ime ná ndụ.

“Tụọ egwu ezi Chineke.” E kwuwe okwu ịtụ egwu Chineke, ụfọdụ ndị nwere ike iche na ihe a na-ekwu bụ ịtụ Chineke ụjọ. Ma, ịtụ egwu Chineke abụghị ihe e ji ụjọ eme. E nwere ike iji ịtụ egwu Chineke tụnyere egwu nwatakịrị na-atụ ka ọ ghara ime ihe ga-ewute papa ya, ọ bụghị ụdị ụjọ odibo na-atụ nna ya ukwu maka na ọ ma na nna ya ukwu ga-emesi ya ike ma o mejọọ ya. Otu akwụkwọ kwuru na ịtụ egwu Chineke bụ “ùgwù ndị na-efe Chineke na-akwanyere Chineke n’ihi na ha hụrụ Ya n’anya, na-asọpụrụkwa Ya maka na Ọ dị ike ma dị ukwuu.” Ịtụ egwu Chineke na-eme ka anyị na-eme uche ya n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya ma mara na yanwa hụkwara anyị n’anya. Mmadụ anaghị atụ egwu Chineke naanị n’ime obi ya, omume ya kwesịrị igosi na ọ na-atụ egwu Chineke n’eziokwu. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

‘Debe ihe o nyere n’iwu.’ Ịtụ egwu Chineke na-eme ka anyị na-erubere ya isi. N’eziokwu, anyị kwesịrị irubere Jehova isi. Ọ bụ ya kere anyị, ọ makwa otú kacha mma anyị ga-esi na-ebi ndụ otú ahụ onye mepụtara ihe maara otú kacha mma a ga-esi jiri ihe ahụ o mepụtara na-arụ ọrụ. Ihe ọzọ bụ na Jehova na-echere anyị echiche ọma. Ọ chọrọ ka anyị nwee obi ụtọ, iwu ndị o nyere anyị bụkwa maka ọdịmma anyị. (Aịzaya 48:17) Jọn onyeozi si otú a kwuo ya: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu; ma ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.” (1 Jọn 5:3) Ọ bụrụ na anyị na-erubere Chineke isi, anyị na-egosi na anyị hụrụ ya n’anya, iwu ndị o nyere anyị na-egosikwa na yanwa hụrụ anyị n’anya.

“Ọ bụ ya bụ ọrụ dum dịịrị mmadụ.” Ihe a Sọlọmọn kwuru gosiri otu ihe dị mkpa mere anyị ji kwesị ịna-atụ egwu Chineke ma na-erubere ya isi. Ịtụ egwu Chineke na irubere ya isi bụ ọrụ dịịrị anyị, ya bụ, ọ bụ ihe anyị kwesịrị ime. Ọ bụ Jehova kere anyị, n’ihi ya, ọ bụ ya nyere anyị ndụ. (Abụ Ọma 36:9) Ọ bụkwa ya mere anyị ji kwesị ịna-erubere ya isi. Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ otú ọ chọrọ, anyị na-arụ ọrụ dịịrị anyị.

Gịnịzi ka a ga-asị na ọ bụ ya mere anyị ji dịrị ndụ? N’igbu ya ná nkenke, ihe mere anyị ji dịrị ndụ bụ ka anyị na-eme uche Chineke. Ọ bụ naanị ya ga-eme ka ndụ gị nwee isi. Ọ́ gaghị adị mma ka ị matakwuo uche Jehova nakwa otú i nwere ike isi na-ebi ndụ otú ọ chọrọ? Ndịàmà Jehova ga-enwe mmasị inyere gị aka ka i mee nke a.

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Nọvemba:

Ilu 22-31; Ekliziastis 1-12Abụ Sọlọmọn 1-8