Azịza nke Ajụjụ Iri ndị Mmadụ Na-ajụkarị Banyere Mmekọahụ
Azịza nke Ajụjụ Iri ndị Mmadụ Na-ajụkarị Banyere Mmekọahụ
1 Ọ̀ bụ mmekọahụ bụ mmehie mbụ ahụ Adam na Iv mere n’ogige Iden?
▪ Azịza ya: Ọtụtụ ndị chere na mkpụrụ osisi ahụ a sịrị Adam na Iv erila bụ mmekọahụ. Ma, o nweghị ebe Baịbụl kwuru ụdị ihe ahụ.
Chebagodịrị ihe a echiche: Mgbe Chineke nyere Adam iwu ka ọ ghara iri “mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ,” e kebeghị Iv. (Jenesis 2:15-18) Ebe ọ bụ na Adam nọ naanị ya n’oge ahụ, o nweghị otú mkpụrụ osisi ahụ ga-esi bụrụ mmekọahụ. Ihe ọzọkwa bụ na iwu ahụ Chineke nyere Adam na Iv, nke bụ́ “mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa,” doro nnọọ anya. (Jenesis 1:28) Chineke nke hụrụ ụmụ mmadụ n’anya ọ̀ ga-agwa di na nwunye mbụ ahụ ka ha “jupụta ụwa,” bụ́ nke ha na-enweghị ike ime ma ọ bụrụ na ha enweghị mmekọahụ, ma mazie ha ikpe ọnwụ maka na ha mere ihe ọ gwara ha mee?—1 Jọn 4:8.
Ihe ọzọ anyị kwesịrị iburu n’uche bụ na Adam anọghị ya mgbe nwunye ya bụ́ Iv ‘ghọọrọ mkpụrụ osisi ahụ a sịrị ha erila rie. Mgbe e mechaziri, o nyetụrụ di ya mgbe ya na ya nọ, o wee rie.’—Jenesis 3:6.
Mgbe Adam na Iv nwere mmekọahụ ma mụọ ụmụ, Chineke abaraghị ha mba ọ bụla. (Jenesis 4:1, 2) O doro anya na mkpụrụ osisi ahụ Adam na Iv riri abụghị mmekọahụ, kama ọ bụ mkpụrụ osisi nkịtị.
2 Baịbụl ò kwuru na inwe mmekọahụ bụ ihe ọjọọ?
▪ Azịza ya: Akwụkwọ mbụ dị na Baịbụl kwuru na Chineke kere mmadụ “nwoke na nwaanyị.” Chineke kwuru na ihe niile o kere “dị nnọọ mma.” (Jenesis 1:27, 31) Chineke mechara jiri mmụọ nsọ ya mee ka otu onye so dee Baịbụl gwa ndị bụ́ di, sị: “[Ṅụrịa] ọṅụ n’ihi nwunye ị lụrụ n’okorobịa . . . Ka ara ya na-egbu gị dị ka mmanya n’oge niile.” (Ilu 5:18, 19) Ihe ndị a hà na-egosi na Baịbụl kwuru na inwe mmekọahụ bụ ihe ọjọọ?
Ihe ndị na-eme eme na-egosi na Chineke kere nwoke na nwaanyị otú ga-eme ka di na nwunye nweta obi ụtọ ma ha nwee mmekọahụ, ọ bụghị naanị ka ha mụta nwa. Di na nwunye na-esi n’inwe mmekọahụ egboro ibe ha agụụ mmekọahụ, sikwa otú ahụ gosi na ha hụrụ ibe ha n’anya.
3 Baịbụl ọ̀ kwadoro ka nwoke na nwaanyị biri mgbe ha na-alụbeghị?
▪ Azịza ya: Baịbụl kwuru hoo haa na “Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko . . . ikpe.” (Ndị Hibru 13:4) E nwere ọtụtụ ihe okwu Grik bụ́ por·neiʹa, nke bụ́ ịkwa iko n’asụsụ Igbo, pụtara. Otu n’ime ha bụ mmadụ na onye na-abụghị di ya ma ọ bụ nwunye ya inwe mmekọahụ n’ụdị ya ọ bụla. * N’ihi ya, ọ bụ ihe ọjọọ n’anya Chineke ma nwoke na nwaanyị na-alụbeghị alụ biri, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ha bu n’obi ịlụ ma e mechaa.
Ọ bụrụgodị na nwoke na nwaanyị hụrụ ibe ha n’anya nke ukwuu, Chineke chọrọ ka ha lụọ alụọ tupu ha enwewe mmekọahụ. Ọ bụ Chineke kere nwoke na nwaanyị ka ha nwee ike ịna-ahụ ibe ha n’anya. Ịhụnanya bụkwanụ àgwà bụ́ isi Chineke nwere. N’ihi ya, e nwere ezigbo ihe mere o ji kwuo na ọ bụ naanị ndị bụ́ di na nwunye ga na-enwe mmekọahụ. A ga-akọwa ihe mere o ji kwuo otú ahụ n’isiokwu na-esonụ.
4 Chineke ọ̀ kwadoro nwoke ịlụ ihe karịrị otu nwaanyị?
▪ Azịza ya: O nwere mgbe Chineke hapụrụ ụmụ nwoke ka ha na-alụ ihe karịrị otu nwaanyị. (Jenesis 4:19; 16:1-4; 29:18–30:24) Ma, ọ bụghị Chineke kwuru ka ha mewe otú ahụ. O nyere Adam naanị otu nwaanyị.
Chineke nyere Jizọs Kraịst ikike ka o mee ka ndị mmadụ mata ihe o bu n’obi mgbe o kere mmadụ, nke bụ́ na nwoke kwesịrị ịlụ naanị otu nwaanyị. (Jọn 8:28) Mgbe ndị mmadụ jụrụ Jizọs ajụjụ banyere alụmdi na nwunye, ọ zara, sị: “Onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwaanyị wee sị, ‘N’ihi ya, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́.’”—Matiu 19:4, 5.
1 Ndị Kọrịnt 7:2) Baịbụl kwukwara na ọ bụrụ na nwoke nke na-eje ozi n’ọgbakọ Ndị Kraịst lụrụ nwaanyị, ọ ga-abụrịrị “di nke otu nwunye.”—1 Timoti 3:2, 12.
Chineke mechara si n’ike mmụọ nsọ ya mee ka otu onye na-eso ụzọ Jizọs dee, sị: “Ka nwoke ọ bụla nwee nwunye nke ya, ka nwaanyị ọ bụla nweekwa di nke ya.” (5 Ọ̀ bụ ihe ọjọọ ma di na nwunye jiri ọgwụ ma ọ bụ ihe ọzọ gbochie afọ ime?
▪ Azịza ya: Jizọs enyeghị ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha mụọ ụmụ. Ọ dịghịkwa onye na-eso ụzọ Jizọs nke nyere ụdị iwu ahụ. O nwekwanụghị ebe Baịbụl kwuru na ọ bụ ihe ọjọọ ma di na nwunye mee ihe ụfọdụ iji gbochie afọ ime.
N’ihi ya, ọ bụ di na nwunye ka ọ dịịrị ikpebi ma hà ga-amụ ụmụ ma ọ bụ na ha agaghị amụ. Ọ bụkwa ha ga-ekpebi ụmụ ole ha ga-amụ, nakwa mgbe ha ga-amụ ha. Ọ bụrụ na di na nwunye ekpebie iji ọgwụ gbochie afọ ime, ọ bụ ha ka ọ dịịrị, ma ọ bụrụhaala na ọ bụghị ọgwụ nke nwere ike igbu nwa dị n’afọ. * O nweghị onye kwesịrị ikpe ha ikpe ma ha mee otú ahụ.—Ndị Rom 14:4, 10-13.
6 Ọ̀ dị njọ ite ime?
▪ Azịza ya: Ndụ bụ ihe dị nsọ n’anya Chineke. Chineke wedịịrị nwa e bu n’afọ otú o si were dimkpa. (Abụ Ọma 139:16) O kwuru na ọ bụrụ na mmadụ egbuo nwa e bu n’afọ, onye ahụ ga-aza ajụjụ maka ya. N’ihi ya, Chineke weere na onye gburu nwa e bu n’afọ egbuola ọchụ.—Ọpụpụ 20:13; 21:22, 23.
Ma, ọ bụrụ na nsogbu nke nwere ike ịta isi nwaanyị ma ọ bụ nwa ya adapụta mgbe nwaanyị na-amụ nwa, ọ bụ nwaanyị ahụ na di ya ka ọ dịịrị ikpebi ma à ga-azọwa isi nwaanyị ahụ ka ọ̀ bụ nke nwa ya. *
7 Baịbụl ọ̀ kwadoro ịgba alụkwaghịm?
▪ Azịza ya: Baịbụl kwuru na mmadụ nwere ike ịgba di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm. Ma, Jizọs kwuru na ọ bụ naanị otu ihe nwere ike ime ka mmadụ gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma e wezụga n’ihi ịkwa iko, wee lụọ nwunye ọzọ, na-akwa iko.”—Matiu 19:9.
Mmadụ iji aghụghọ gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm bụ ihe ọjọọ n’anya Chineke. Onye ọ bụla nke gbara di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm mgbe a na-enweghị ezigbo ihe kpatara ya, ga-aza Chineke ajụjụ, karịchaa, ma ọ bụrụ na ọ gbara ya alụkwaghịm ka o wee lụọ onye ọzọ.—Malakaị 2:13-16; Mak 10:9.
8 Chineke ọ̀ kwadoro nwoke idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị idina nwaanyị?
Ndị Rom 1:26, 27; Ndị Galeshia 5:19-21) Ọ bụ eziokwu na Baịbụl kwuru hoo haa na Chineke kpọrọ omume dị otú ahụ asị, Baịbụl kwukwara na “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.
▪ Azịza ya: Baịbụl kwuru hoo haa na ịkwa iko bụ ihe ọjọọ. Nwoke idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị idina nwaanyị sokwa na ya. (Ọ bụ eziokwu na ezigbo Ndị Kraịst maara na nwoke idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị idina nwaanyị bụ ihe ọjọọ, ha na-emere mmadụ niile ihe ọma. (Matiu 7:12) Chineke chọrọ ka anyị ‘na-asọpụrụ ụdị mmadụ niile.’ N’ihi ya, ezigbo Ndị Kraịst anaghị akpọ ụmụ nwoke na-edina ụmụ nwoke ma ọ bụ ụmụ nwaanyị na-edina ụmụ nwaanyị asị.—1 Pita 2:17.
9 Ọ̀ dị njọ iji ekwe ntị ma ọ bụ Ịntanet akparịta ihe ga-eme ka agụụ mmekọahụ gụwa mmadụ?
▪ Azịza ya: Ụfọdụ ndị na-eji ekwe ntị akparịta ihe ga-eme ka agụụ mmekọahụ gụwa ha ma ọ bụ ha ejiri ya na-egere okwu rụrụ arụ. Ndị ọzọ na-eji ekwe ntị ezigara ibe ha foto ndị gba ọtọ nakwa ozi ndị na-akọ banyere inwe mmekọahụ. Ndị ọzọkwa na-esi n’Ịntanet ezigara ibe ha ihe ndị rụrụ arụ.
O nweghị ebe Baịbụl kpọrọ ihe ndị a ndị mmadụ na-eme n’oge a aha. Ma, o kwuru, sị: “Ka a ghara ịkpọtụdị ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu aha n’etiti unu, dị nnọọ ka o kwesịrị ndị nsọ; ma ọ bụ omume ihere ma ọ bụ okwu nzuzu ma ọ bụ okwu njakịrị rụrụ arụ, bụ́ ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị.” (Ndị Efesọs 5:3, 4) Ihe ọjọọ ndị a a na-eji ekwe ntị ma ọ bụ Ịntanet eme na-eme ka ndị mmadụ lewe mmekọahụ anya otú na-adịghị mma, na-emekwa ka ndị mmadụ na-akwa iko. Ha na-emekwa ka ndị mmadụ chọwa ụzọ ndị ha ga-esi gboo agụụ mmekọahụ na-agụ ha kama ime ka ha na-ejide onwe ha.
10 Baịbụl ọ̀ kwadoro ka mmadụ jiri aka ya na-egbo onwe ya agụụ mmekọahụ?
▪ Azịza ya: O nweghị ebe Baịbụl kwuru kpọmkwem banyere mmadụ iji aka ya egbo onwe ya agụụ mmekọahụ. Ma, Baịbụl nyere Ndị Kraịst iwu, sị: “Meenụ ka akụkụ ahụ́ unu ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ [na-ekwesịghị ekwesị].”—Ndị Kọlọsi 3:5.
Mmadụ iji aka ya egbo onwe ya agụụ mmekọahụ na-eme ka onye ahụ lewe mmekọahụ anya otú na-adịghị mma, na-emekwa ka onye ahụ na-achọ naanị ọdịmma onwe ya. Baịbụl gwara anyị na Chineke nwere ike inye ndị na-agba mbọ ịkwụsị omume a “ike karịrị ike nkịtị” bụ́ nke ga-enyere ha aka ịkwụsị ya.—2 Ndị Kọrịnt 4:7; Ndị Filipaị 4:13.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 11 Por·neiʹa pụtakwara di ma ọ bụ nwunye ịgba n’èzí, nwoke idina nwoke ibe ya ma ọ bụ nwaanyị idina nwaanyị ibe ya, mmadụ idina anụmanụ, nakwa ihe ọ bụla ọzọ mmadụ ji ihe o ji bụrụ nwoke ma ọ bụ ihe o ji bụrụ nwaanyị mee, nke na-abụghị ihe mere Chineke ji kee ya.
^ par. 19 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere nwoke ịga ụlọ ọgwụ mee ihe ga-eme ka ọ ghara ịtụwali nwaanyị ime ma ọ bụ nwaanyị ịga ụlọ ọgwụ mee ihe ga-eme ka ọ ghara ịtụli ime, biko gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” n’Ụlọ Nche June 15, 1999, peeji nke 27-28.
^ par. 22 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ma ọ̀ dị mma ka nwaanyị tee ime ma ọ bụrụ na ọ tụụrụ ime mgbe e dinara ya n’ike, gụọ Teta! (Bekee) nke May 22, 1993, peeji nke 10-11. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.