Di na Nwunye—Mụtanụ Ile Ihe Anya Otú Chineke Si Ele Ihe Anya
Ihe Ndị Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ N’ezinụlọ
Di na Nwunye—Mụtanụ Ile Ihe Anya Otú Chineke Si Ele Ihe Anya
Fred *: “Mgbe mụ na nwunye m, bụ́ Lea, lụrụ ọhụrụ, agwara m ya na anyị ga na-amụkọ Baịbụl ọnụ. M mere ihe niile m nwere ike ime ka obi ya dịrị n’ihe anyị na-amụ. Ma, ahụ́ anaghị eru ya ala ma anyị mụwa ihe. M jụọ ya ajụjụ, naanị ihe ọ na-aza bụ ee ma ọ bụ ee e. Ọ bụghị otú a ka m chere nwaanyị kwesịrị isi na-eme ma ya na di ya mụwa Baịbụl.”
Lea: “Adị m afọ iri na asatọ mgbe mụ na di m, bụ́ Fred, lụrụ. Anyị na-amụkọ Baịbụl ọnụ mgbe niile. Ma mgbe ọ bụla anyị na-amụ ihe, ihe Fred na-eme bụ ịgwa m ebe m na-anaghị emeta na ihe m kwesịrị ime ka m wee bụrụkwuo ezigbo nwaanyị. Ihe a ọ na-eme bịara na-ewe m ezigbo iwe!”
OLEE ihe i chere bụ́ nsogbu Fred na Lea? Ha abụọ bucha ihe ọma n’obi. Ha hụrụ Chineke n’anya. Ha abụọ makwaara na ọ dị mkpa ka ha na-amụkọ Baịbụl ọnụ. Ma kama nke a ga-enyere ha aka, o yiri ka ọ̀ na-achọzi ịkpatara ha nsogbu. Ha na-amụkọ Baịbụl ọnụ, ma ha anaghị ele ihe anya otú Chineke si ele ihe anya.
Gịnị ka mmadụ ile ihe anya otú Chineke si ele ihe anya pụtara? Gịnị mere o ji dị mkpa ka di na nwunye mụta ile ihe anya otú Chineke si ele ihe anya? Olee ihe ndị nwere ike ime ka o siere ha ike ịmụta ime otú ahụ, oleekwa ihe ga-enyere ha aka ka ha mụta ya.
Gịnị Ka Mmadụ Ile Ihe Anya Otú Chineke Si Ele Ihe Anya Pụtara?
Baịbụl gosiri na e nwere ụzọ dị iche iche ụmụ mmadụ si ele ihe anya. (Jud 18, 19) Dị ka ihe atụ, Pọl, bụ́ onye so dee Baịbụl, gosiri na onye na-ele ihe anya otú Chineke si ele ihe anya dị iche n’onye na-ele ihe anya otú mmadụ nkịtị si ele ya. Pọl kwuru na ndị na-ele ihe anya otú mmadụ nkịtị si ele ihe anya na-achọkarị naanị ọdịmma onwe ha. Ha na-eme ihe dị mma n’anya onwe ha kama ịgbalị ka ha na-eme ihe Chineke kwuru.—1 Ndị Kọrịnt 2:14; Ndị Galeshia 5:19, 20.
Ma ndị na-ele ihe anya otú Chineke si ele ihe anya ejighị ihe Chineke kwuru egwuri egwu. Ha na-ewere Jehova Chineke ka enyi ha, na-agbalịkwa ka ha na-akpa àgwà ka ya. (Ndị Efesọs 5:1) Ọ bụ nke a mere ha ji ahụ ndị ọzọ n’anya, na-emere ndị mmadụ ebere, na-emekwara ha ihe ọma. (Ọpụpụ 34:6) Ha na-erubekwara Chineke isi ọ sọgodị ya ya bụrụ na ọ dịrịghị ha mfe ime ya. (Abụ Ọma 15:1, 4) E nwere otu nwoke bi na Kanada nke aha ya bụ Darren. Nwoke a lụrụ nwaanyị kemgbe afọ iri atọ na ise. Ọ sịrị: “Echere m na onye na-ele ihe anya otú Chineke si ele ihe anya bụ onye na-echebara okwu ọnụ ya na omume ya echiche mgbe niile iji hụ na o meghị ihe ga-eme ka ya na Chineke ghara ịbụkwa enyi.” Nwunye ya, bụ́ Jane, kwukwara, sị: “Echere m na nwaanyị ọ bụla nke na-ele ihe anya otú Chineke si ele ihe anya bụ nwaanyị nke na-agbalịsi ike ka àgwà ọ na-akpa kwa ụbọchị gosi na o nwere mmụọ nsọ Chineke.”—Ndị Galeshia 5:22, 23.
Ma nke a apụtaghị na mmadụ ga-alụrịrị di ma ọ bụ nwunye tupu ya amalite ile ihe anya otú Chineke si ele ihe anya. Nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl kwuru na onye ọ bụla kwesịrị ịmụta banyere Chineke ma na-akpa àgwà ka ya.—Ọrụ 17:26, 27.
Gịnị Mere O Ji Kwesị Ekwesị Ka Di na Nwunye Na-eme Ihe Ha Na-amụta n’Okwu Chineke?
Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka di na nwunye gbaa mbọ mụta ile ihe anya otú Chineke si ele ihe anya? Ka anyị lebagodị anya n’ihe atụ a: E nwere mmadụ abụọ nwe otu ubi. Ha chọkwara ịkụ akwụkwọ nri n’ubi ha ahụ. Otu onye chọrọ ka a kụọ ya ná mbido afọ, ma onye nke ọzọ chere na ọ ka mma ịkụ ya ma afọ gamitụ. Otu onye chọrọ ka e tinye ya fatịlaịza, ma onye nke ọzọ kwuru na a gaghị eme ya eme. Otu onye chọrọ ịga na-arụ ọrụ n’ubi ahụ kwa ụbọchị, ma onye nke ọzọ chọrọ ịna-ele n’anya n’anya n’arụghị ọrụ ọ bụla. Ihe a kụrụ n’ubi ahụ nwere ike ito, ma ọ gaghị emecha nke ọma otú ọ gaara eme ma a sị na ha abụọ nwere otu olu ma gbakọọ aka rụọ ọrụ n’ubi ahụ.
Di na nwunye dị ka mmadụ abụọ ahụ. Ọ bụrụ na ọ bụ naanị otu onye na-eme ihe ọ na-amụta n’Okwu Chineke, ha nwere ike ịna-ebitụ n’udo. (1 Pita 3:1, 2) Ma, ihe ga-akara ha nnọọ mma ma ọ bụrụ na ha abụọ na-eme ihe Chineke kwuru ma na-agbalịsi ike inyere ibe ha aka n’ife Chineke! Sọlọmọn, bụ́ eze maara ihe, dere, sị: “Abụọ dị mma karịa otu.” N’ihi gịnị? “N’ihi na ha nwere ezi ụgwọ ọrụ maka ịrụsi ọrụ ike ha. N’ihi na ọ bụrụ na otu n’ime ha adaa, onye nke ọzọ pụrụ ikulite ibe ya.”—Ekliziastis 4:9, 10.
O nwere ike ịbụ na ọ na-agụ gị agụụ ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-eme ihe unu na-amụta n’Okwu Chineke. Ma, na ọ na-agụ gị agụụ abụghị ebe okwu biri. Ka anyị leba anya n’ihe abụọ nwere ike ime ka ime ihe unu na-amụta n’Okwu Chineke siere unu ike nakwa ihe ga-enyere unu aka ime ya.
NKE MBỤ: Anyị anaghị enwe ohere. Otu nwaanyị aha ya bụ Suzana, bụ́ onye lụrụ di ọhụrụ, sịrị: “Di m na-abịa n’ebe m na-arụ ọrụ eburu m ma ọ kụọ elekere asaa nke abalị. Anyị laruo, ọrụ niile dị n’ụlọ ana-eche anyị. Ọ naghị adịrị anyị mfe; ahụ́ anyị na-agwa anyị gaa zuo ike, ma obi anyị na-agwa anyị na anyị kwesịrị iwepụta oge mụọ Okwu Chineke.”
Ihe nwere ike inyere unu aka: Na-enyerenụ ibe unu aka, chọtakwanụ oge ga-adabara unu abụọ ịmụkọ Okwu Chineke ọnụ. Suzana kwukwara, sị: “Mụ na di m kpebiri na anyị ga na-eteta n’oge gụkọọ Baịbụl ọnụ ma kwurịta ihe anyị mụtara tupu anyị agawa ọrụ. Di m na-enyekwara m aka n’ọrụ ụlọ ka m nwee ike nwee ohere mụ na ya ga-eji na-anọrị.” Olee uru unu ga-erite ma unu mee nke a? Di Suzana, bụ́ Edwin, sịrị: “Achọpụtala m na mgbe ọ bụla mụ na nwunye m na-amụchi Okwu Chineke anya, ọ na-adịrị anyị mfe idozi nsogbu ndị na-abịara anyị, ọ na-emekwa ka anyị ghara ịna-echegbukarị onwe anyị.”
E wezụga iwepụta oge unu ga-eji na-akparịta ụka n’ụbọchị, ọ dịkwa mkpa ka unu na-ekpekọ ekpere ọnụ kwa ụbọchị. Olee otú nke a ga-esi enyere unu aka? Otu nwoke aha ya bụ Robert, bụ́ onye lụrụ nwaanyị kemgbe afọ iri na isii, sịrị: “Obere oge gara aga, mụ na nwunye m nwere ezigbo nghọtahie. Ma, anyị jisiri ike na-ekpekọ ekpere ọnụ n’abalị ọ bụla, na-akọrọ Chineke nsogbu anyị. Echere m na ọ bụ ekpere ahụ anyị na-ekpekọ ọnụ nyeere anyị aka idozi nsogbu anyị ma biwekwa n’udo.”
MEGODỊNỤ IHE A: N’abalị ọ bụla, na-ewepụtanụ nkeji ole na ole kwurịta ihe ọma ndị meere unu n’ụbọchị bụ́ ndị unu kwesịrị ikele Chineke maka ha. Na-ekwurịtakwanụ nsogbu ndị
unu nwere, nke ka nke, ndị nke unu chọrọ ka Chineke nyere unu aka na ha. Onye nke ọ bụla n’ime unu ekwesịghị iji oge ahụ ekwu ebe ibe ya na-anaghị emeta. Kama nke ahụ, mgbe unu na-ekpekọ ekpere ọnụ, naanị ihe unu ga-agwa Chineke bụ ihe ndị unu abụọ kwesịrị ịrụ ọrụ na ha. N’echi ya, gbalịanụ ka unu mee ihe ndị ahụ unu kpere n’ekpere.NKE ABỤỌ: Di m ma ọ bụ nwunye m ka m nwee isi akwụkwọ. Tony sịrị: “Ike ịnọ otu ebe na-agụ akwụkwọ anaghị adị m.” Nwunye ya, bụ́ Nneka, sịrị: “Ịgụ akwụkwọ na-atọgbu m atọgbu, ọ na-amasịkwa m ịkọrọ onye ọzọ ihe ndị m gụtara. Ọ na-adị m mgbe ụfọdụ ka ahụ́ anaghị eru di m ala ma mụ na ya kwuwe ihe ndị anyị mụtara na Baịbụl.”
Ihe nwere ike inyere unu aka: Na-enyere di gị ma ọ bụ nwunye gị aka, ọ bụghị ịtawa ya ụta ma ọ bụ gị na ya ịmawa aka. Jaa ya mma n’ebe ndị ọ na-eme nke ọma. Tony kwukwara, sị: “Ahụ́ anaghị erucha m ala mgbe ụfọdụ n’ihi otú o si enu nwunye m enu n’obi ka mụ na ya na-ekwurịta ihe ndị gbasara Baịbụl. Ná mbụ, anaghị m achọcha ka mụ na ya na-ekwurịta ihe ndị ahụ. Ma, Nneka nyeere m aka. Ugbu a, anyị na-ekwurịtakarịzi ihe ndị gbasara Baịbụl, achọpụtakwala m na o nweghị ihe kwesịrị ime ka ahụ́ ghara ịna-eru m ala. Mụ na ya ikwurịta ihe anyị mụtara na Baịbụl na-atọzi m ụtọ. Nke a emeela ka ahụ́ na-eru anyị ala, anyị ana-ebikwa n’udo.”
Ọtụtụ ndị di na nwunye achọpụtala na iwepụta oge kwa izu maka ịgụ na ịmụ Baịbụl emeela ka ha na-adịkwu ná mma. Ma burunụ nke a n’obi: Mgbe unu na-ekwurịta ihe unu gụtara n’Akwụkwọ Nsọ, onye nke ọ bụla kwuo otú ọ ga-esi eme ihe ọ mụtara, ọ bụghị otú onye nke ọzọ kwesịrị isi eme ya. (Ndị Galeshia 6:4) Ọ bụrụ na o nwere ihe na-esere unu, unu ekwurịtala ya n’oge ahụ unu na-amụ Baịbụl, kwuonụ ya n’oge ọzọ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?
Chebagodịrị nke a echiche: Ọ bụrụ na gị na ndị ezinụlọ gị na-eri nri, ọ̀ bụ mgbe ahụ ka ị ga-ehichawa ọnyá na-esi ísì? Mbanụ. Ọ ga-eme ka afọ machie onye ọ bụla. Jizọs ji ịmụ Okwu Chineke na ime ihe Chineke chọrọ tụnyere iri nri. (Matiu 4:4; Jọn 4:34) Ọ bụrụ na ị na-ekwu ihe na-akpasu di gị ma ọ bụ nwunye gị iwe mgbe ọ bụla unu mụwara Baịbụl, i nwere ike ime ka ọ ghara inwekwa mmasị n’ịmụ Baịbụl. Ọ bụ eziokwu na unu kwesịrị ikwurịta nsogbu ndị unu nwere. Ma, ọ ka mma ikwurịta ha mgbe kwesịrị ekwesị.—Ilu 10:19; 15:23.
MEGODỊ IHE A: Dee àgwà abụọ ma ọ bụ atọ di gị ma ọ bụ nwunye gị nwere bụ́ ndị kacha amasị gị. Mgbe ọzọ unu na-amụ Baịbụl, ya abụrụ na ihe unu na-amụ gbasara àgwà ndị ahụ, jaa ya mma, gwakwa ya na obi dị gị ụtọ na o nwere àgwà ndị ahụ.
Ị Ga-aghọrọ Mkpụrụ Ị Kụrụ
Ọ bụrụ na unu abụọ na-agbalị ime ihe unu na-amụta n’Okwu Chineke, unu ga na-ebi n’udo ma na-enwe obi ụtọ. N’eziokwu, Okwu Chineke kwuru hoo haa na “mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, ọ bụ ya ka ọ ga-aghọrọkwa.”—Ndị Galeshia 6:7.
Fred na Lea, bụ́ ndị e kwuru okwu ha ná mbido isiokwu a, mechara ghọta na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu. O ruola afọ iri anọ na ise ha lụrụ, ha achọpụtakwala na ọ bụrụ na di na nwunye ejisie ike na-eme ihe ha na-amụta n’Okwu Chineke, ọ na-abara ha uru. Fred sịrị: “M na-atabu nwunye m ụta na ọ bụ ya mere na anyị anaghị ekwurịta okwu nke ọma. Ma ka oge na-aga, achọpụtara m na mụnwa kwesịkwara ịgbalị ka anyị na-ekwurịta okwu nke ọma.” Lea sịrị: “Ihe nyeere anyị aka n’oge ahụ bụ na anyị abụọ hụrụ Jehova Chineke n’anya. Kemgbe anyị lụrụ, anyị na-amụchi Baịbụl anya, na-ekpekọkwa ekpere ọnụ. Ka m na-ahụ ka di m na-agbakwu mbọ na-eme ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl, ọ na-adịkwuru m mfe ịhụ ya n’anya.”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 Aha a a kpọrọ ha abụghị ezigbo aha ha.
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ . . .
▪ Olee mgbe ikpeazụ mụ na di m ma ọ bụ nwunye m kpekọrọ ekpere ọnụ?
▪ Olee ihe m nwere ike ime iji nyere di m ma ọ bụ nwunye m aka ịna-ekwu ihe dị ya n’obi ma anyị mụwa Baịbụl?