Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere O Ji Dị Mkpa ka Anyị Na-eme Ihe Baịbụl Kwuru?

Gịnị Mere O Ji Dị Mkpa ka Anyị Na-eme Ihe Baịbụl Kwuru?

Gịnị Mere O Ji Dị Mkpa ka Anyị Na-eme Ihe Baịbụl Kwuru?

IHE Baịbụl kwuru banyere mmekọahụ ọ̀ bụ ihe mgbe ochie nakwa ihe na-anaghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́? Mba. Kama nke ahụ, ihe Baịbụl kwuru banyere mmekọahụ nwere ike inyere anyị aka izere ihe ndị a:

Ọrịa ndị a na-ebute ná mmekọahụ

Ime ọkwà

Nsogbu ndị na-abịa ma di na nwunye tisaa

Akọnuche anyị ịma anyị ikpe

Ihere ime anyị maka na ndị ọzọ ejirila anyị mere otú masịrị ha

Jehova Chineke, * bụ́ Onye kere anyị, chọrọ ka onyinye ndị o nyere anyị baara anyị uru. Chineke bụ “Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru.” (Aịzaya 48:17) Onye na-eme ihe Baịbụl kwuru banyere mmekọahụ na-erite uru ndị a:

Chineke ga-ahụ ya n’anya

Obi ga-eru ya ala

Udo ga-adị n’ezinụlọ ya

Ndị mmadụ ga na-akpọ ya aha ọma

A ga na-akwanyere ya ùgwù

Ma gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị naghị eme ihe Baịbụl kwuru? Ị̀ ga-agbanweli? Chineke ọ̀ ga-ama gị ikpe maka ihe ọjọọ ndị i mere n’oge gara aga?

Chebagodịrị ihe a echiche: N’ọgbakọ Ndị Kraịst e nwere n’oge gboo, e nwere ụfọdụ ndị bụbu ndị na-akwa iko na ndị na-edina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha. Ma, ha gbanwere ndụ ha, ọ bakwaara ha ezigbo uru. (1 Ndị Kọrịnt 6:9-11) Taa, ọtụtụ puku mmadụ n’ebe dị iche iche n’ụwa agbanweekwala ndụ ha. Ha akwụsịla omume rụrụ arụ ndị ha na-emebu, ibi ndụ otú Baịbụl kwuru abaakwarala ha uru. Dị ka ihe atụ, ka anyị lebagodị anya n’ihe mere Sarah, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya n’isiokwu nke mbụ.

‘Ahụ́ Ruru M Ala Ozugbo Ahụ’

Sarah chọpụtara na ndụ ọjọọ ọ na-ebi emeghị ka o nwee obi ụtọ ná ndụ ma ọ bụ ka ahụ́ ruo ya ala. Ọ sịrị: “Ọ bịara dịwa m ka akọnuche m ọ̀ nwụọla. Ihere onwe m mewere m, ụjọ nọkwa na-atụ m na m nwere ike ịtụta ime ma ọ bụ bute ọrịa ọjọọ. Ma, m ka kweere na Chineke dị, m makwaara na ndụ m na-ebi na-ewute ya. Onwe m na-asọ m oyi, nke a mekwara ka m na-anwụ n’echiche.”

Sarah mechara kpebie na ya ga-agbanwe ndụ ya. Ọ gakwuuru ndị mụrụ ya, ndị bụ́ Ndịàmà Jehova, ka ha nyere ya aka. Ọ gwakwara ụfọdụ ndị okenye nọ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ebe o bi ka ha nyere ya aka. Sarah kwuru, sị: “Otú ndị mụrụ m na ndị okenye ahụ si nabata m ma gosi na ha hụrụ m n’anya riri m ọnụ. Nke a mere ka ahụ́ ruo m ala ozugbo ahụ.”

Sarah nwere ụmụ abụọ ugbu a. Ọ sịrị: “Ana m akọrọ ụmụ m ụdị ndụ m biburu. Achọrọ m ka ha ghọta nsogbu ndị inupụrụ Chineke isi kpataara m. Ihe mere m ji akọrọ ha ihe ndị a bụ ka ha mara na e nwere ọtụtụ uru mmadụ na-erite ma o mee ihe Baịbụl kwuru banyere mmekọahụ. O doro m anya na ihe mere Chineke ji agwa anyị otú anyị kwesịrị isi na-ebi ndụ bụ na ọ chọghị ka anyị banye ná nsogbu.”

Ọ bụrụkwa na gịnwa erube isi na ndụmọdụ ndị Chineke nyere anyị, ị ga-erite ọtụtụ uru. Baịbụl kwere nkwa, sị: “Iwu Jehova ziri ezi, na-eme ka obi ṅụrịa ọṅụ; ihe Jehova nyere n’iwu dị ọcha, na-eme ka anya na-enwu gbaa. . . . Idebe ha na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu.”—Abụ Ọma 19:8, 11. *

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

^ par. 20 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ndụmọdụ bara uru ndị dị na Baịbụl, kpọtụrụ Ndịàmà Jehova bi n’ógbè gị. I nwekwara ike iji adres nke kwesịrị ekwesị n’ime adres ndị e depụtara na peeji nke 4 na magazin a detara anyị akwụkwọ ozi ma ọ bụ gị agaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

Ndị leghaara ihe Baịbụl kwuru anya na-emecha kpatara onwe ha obi ọjọọ

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

Ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru na-enwe akọnuche dị ọcha, na-ebikwa n’udo