Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Alfonso de Zamora—Onye Chọrọ Ka A Sụgharịa Aha Chineke Otú O Kwesịrị

Alfonso de Zamora—Onye Chọrọ Ka A Sụgharịa Aha Chineke Otú O Kwesịrị

Alfonso de Zamora​—Onye Chọrọ Ka A Sụgharịa Aha Chineke Otú O Kwesịrị

N’AFỌ 1492, eze ndị Spen, bụ́ Ferdinand, na nwunye ya, bụ́ Isabella, nyere iwu, sị: ‘Anyị na-agwa ndị Juu niile, ma nwoke ma nwaanyị, ka ha si n’ebe niile anyị na-achị kwapụ tupu ngwụcha ọnwa Julaị afọ a. Ha kpọrọkwa ụmụ ha ndị nwoke na ndị nwaanyị, ndị odibo ha, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, na ndị niile ọzọ bụ́ ndị Juu ha na ha bi, ma onye ukwu ma onye nta, n’agbanyeghị afọ ole ha dị. Ha emekatakwala emekata lọghachi.’

N’okpuru ebe e dere iwu a, e dekwara na ọ bụrụ na ndị Juu ndị bi na Spen achọghị ịkwapụ, ihe ha ga-eme bụ ịkwụsị ikpe okpukpe ndị Juu. O nwere ike ịbụ na otu rabaị aha ya bụ Juan de Zamora chere na ọ kaara ya mma ịghọ onye Katọlik ka o nwee ike biriwe na Spen, bụ́ ebe ndị nna nna ya biri. Ebe Juan bụ onye Juu, ọ dị ka ò zigara nwa ya bụ́ Alfonso n’ụlọ akwụkwọ a ma ama dị na Zamora ka ọ gaa gụọ ihe gbasara asụsụ Hibru. Alfonso mechara mụtakwa asụsụ Latịn, Grik, na Arameik nke ọma. Mgbe ọ gụchara akwụkwọ, ọ malitere ịkụzi asụsụ Hibru na mahadum dị n’obodo Salamanka. Asụsụ niile ahụ ọ mụtara mechara baara ndị ọkà mmụta Baịbụl nọ n’ebe niile na Yurop uru.

N’afọ 1512, otu mahadum e mepere ọhụrụ n’obodo Alkala de Henares (bụ́ ebe a na-akpọbu Kọmplutum) bugoro Alfonso de Zamora n’ọkwá prọfesọ ka ọ kụziwere ha asụsụ Hibru. Ebe ọ bụ na Zamora bụ otu n’ime ndị kacha mara akwụkwọ n’oge ahụ, onye mepere mahadum ahụ, bụ́ kadinal Jiménez de Cisneros, kpọrọ ya ka ọ bịa nye aka n’otu nnukwu ọrụ, nke bụ́ ịsụgharị Baịbụl a kpọrọ Baịbụl Kọmplutum nke ga-enwe mpịakọta isii. N’ime Baịbụl ahụ, a ga-enwe asụsụ Hibru, Grik, Latịn, nakwa n’ụfọdụ ebe asụsụ Arameik. *

Otu ọkà mmụta Baịbụl nke aha ya bụ Mariano Revilla Rico kwuru banyere ịsụgharị Baịbụl ahụ, sị: “N’ime ndị Juu atọ so rụọ ọrụ ahụ Kadịnal [Cisneros] chọrọ ka a rụọ, onye a kacha anụ aha ya bụ Alfonso de Zamora. Ọ bụ ọkachamara n’ihe gbasara ụtọ asụsụ, bụrụkwa ọkà mmụta n’asụsụ Latịn, Grik, Hibru, Arameik, nakwa n’ihe gbasara iwu ndị Juu.” Ihe Zamora mụtara mere ka o kwenyesie ike na tupu mmadụ asụgharịa Baịbụl otú dị mma, onye ahụ ga-ama asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl nke ọma. O sodị ná ndị mbụ mere ka ndị mmadụ nwewe mmasị n’ịmụ asụsụ ndị e ji dee Baịbụl, bụ́ nke malitere ihe dị ka narị afọ ise gara aga.

Ma, oge ahụ Zamora dịrị ndụ bụ oge siri ike, ọ dịghịkwa mfe ime ka ndị mmadụ nwee mmasị ịmụ asụsụ ndị e ji dee Baịbụl n’ihi ihe na-eme na Spen n’oge ahụ. N’oge ahụ, chọọchị Katọlik anaghị eji anya ahụ ndị na-anaghị eme ihe ha kwuru, ha wekwaara Baịbụl chọọchị Katọlik sụgharịrị n’asụsụ Latịn n’oge ahụ ka naanị Baịbụl e kwesịrị ịgụ agụ. Aha Baịbụl ahụ bụ Vulgate. Ma tupu mgbe ahụ, ọtụtụ ndị ọkà mmụta bụ́ ndị Katọlik achọpụtala na e nwere ọtụtụ ihe a na-asụgharịtaghị na Baịbụl ahụ. N’ihe dị ka afọ 1513, Alfonso de Zamora na ndị ọzọ bidoro ịsụgharị Baịbụl a ga-asụgharị otú dị mma.

‘Ịsụgharị Baịbụl Ga-eme Ka A Zọpụta Ndị Mmadụ’

N’ime akwụkwọ ndị Zamora sụgharịrị, nke kacha baa uru bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru, nke ọtụtụ ndị na-akpọ Agba Ochie, bụ́ nke ọ sụgharịrị n’asụsụ Latịn. O nwere ike ịbụ na o bu n’obi ka e si na ya nweta ọtụtụ ihe a ga-eji sụgharịa Baịbụl ahụ a na-akpọ Baịbụl Kọmplutum. Otu n’ime akwụkwọ ndị ọ sụgharịrị dị n’ọ́bá akwụkwọ dị n’obodo El Eskorịal, nke dị nso n’obodo Madrid, nke dị na Spen. Akara a mapawara n’akwụkwọ ahụ bụ G-I-4. Akwụkwọ ahụ bụ akwụkwọ Jenesis nke e dere n’asụsụ Hibru ma sụgharịa ya n’asụsụ Latịn, e dee otu mkpụrụ okwu n’asụsụ Hibru, e deekwa ihe ọ pụtara n’asụsụ Latịn.

N’okwu mmeghe dị n’akwụkwọ ahụ, o kwuru, sị: “Ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ n’asụsụ dị iche iche bụ ihe ga-eme ka mba dị iche iche nweta nzọpụta. . . . Anyị hụrụ na . . . ọ dị oké mkpa ka ndị na-efe Chineke nwee Baịbụl a sụgharịrị nnọọ otú ọ dị n’asụsụ e ji dee Baịbụl, ya bụ, nke okwu Hibru ọ bụla dị na ya ga-enwe okwu Latịn ya na ya bụ otu.” Alfonso de Zamora ruru eru ịsụgharị Baịbụl n’asụsụ Latịn n’ihi na o doro anya na ọ ma nke a na-akọ n’asụsụ Hibru.

‘Mmụọ M Ahụghịkwa Ebe Izu Ike’

E nwere otu ihe mere Spen ji bụrụ ebe dị mma ndị ọkà mmụta ndị chọrọ ịsụgharị Baịbụl, dị ka Zamora, ga-anọ sụgharịa ya. N’oge ahụ, e nwere ọtụtụ ndị Juu na Spen. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia Britannica kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị Alakụba na ndị Juu bi na Spen n’oge ahụ, Spen bụ naanị mba dị n’ebe ọdịda anyanwụ Yurop n’oge ahụ, bụ́ ebe e nwere ndị agbụrụ dị iche iche na ndị na-ekpe okpukpe dị iche iche. Ọ bụkwa nke a mere Spen ji bụrụ mba mepere anya n’ihe banyere okpukpe, agụmakwụkwọ, ise ihe, na ide ihe karịa ọtụtụ mba ndị ọzọ n’oge ahụ.”

Ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ ndị Juu na Spen, e nwere ọtụtụ Baịbụl ndị e ji aka dee n’asụsụ Hibru. N’ọtụtụ ebe na Spen, ndị Juu bụ́ ndị odeakwụkwọ ji aka na-edepụta Baịbụl ndị ahụ ka ndị mmadụ nwee ike ịna-agụ ha n’ụlọ nzukọ ndị Juu. N’otu akwụkwọ otu nwoke bụ́ L. Goldschmidt dere, o kwuru na “ọ bụghị naanị akwụkwọ ise mbụ dị na Baịbụl, bụ́ ndị e dere n’asụsụ Spanish na Pọchugiiz, ka ndị ọkà mmụta ndị Juu kacha were na a sụgharịrị nke ọma, kama ha wekwaara na a sụgharịtara ndị nke ahụ e ji aka dee, bụ́ ndị e si na ha na-asụgharị Baịbụl n’asụsụ ndị ọzọ.”

N’agbanyeghị na Spen dị mma ịnọ sụgharịa Baịbụl, e bidoro megidewe ndị chọrọ ịsụgharị Baịbụl. N’afọ 1492, ndị Katọlik bụ́ ndị agha eze Spen, bụ́ Ferdinand, na nwunye ya, bụ́ Isabella, meriri ndị Arab fọdụrụ na Spen. Dị ka anyị kwuru na mbụ, ọ bụkwa n’afọ ahụ ka eze ahụ na nwunye ya nyere iwu ka ndị niile na-ekpe okpukpe ndị Juu kwapụ na Spen. Mgbe afọ iri gara, e nyekwara iwu ka ndị Alakụba niile bi na Spen kwapụ. Malitezie mgbe ahụ gawa, okpukpe Katọlik ghọziri okpukpe onye ọ bụla bi na Spen na-ekpe, o nweghịzi okpukpe ọzọ e kwere ka ndị mmadụ na-ekpe.

Olee otú nke a si metụta ndị na-asụgharị Baịbụl? Ka anyị weregodị Alfonso de Zamora maa atụ. Ọ bụ eziokwu na onye Juu a bụ́ ọkà mmụta aghọọla onye Katọlik, ndị isi na chọọchị Katọlik ekweghị ewepụ anya n’ebe ọ nọ n’ihi na ọ bụ onye Juu. Ụfọdụ ndị nọ na-akatọ Kadịnal Cisneros maka ịkpọrọ ndị Juu ghọrọ ndị Katọlik ka ha sụgharịa Baịbụl ahụ ọ chọrọ ka a sụgharịa. Ihe ndị a ha na-ekwu kpataara Zamora ọtụtụ nsogbu. N’otu ihe Zamora dere, bụ́ nke dị na Mahadum Madrid, ọ sịrị: ‘Ndị enyi m niile agbaarala m ọsọ, kpọọkwa m asị, ha aghọọla ndị iro m. Mmụọ m ahụkwaghị ebe izu ike, ahụghịkwa m ebe m ga-azọkwasị ụkwụ.’

Otu n’ime ndị bụ́ ndị iro ya bụ Juan Tavera, onye bụ́ achịbishọp nke Toledo, onye mechara ghọọ onyeisi ná ndị na-ekpe ndị na-anaghị eme ihe okpukpe Katọlik kwuru ikpe. Nsogbu Tavera nọ na-enye Zamora mere ka Zamora degara poopu e nwere mgbe ahụ akwụkwọ ozi ka o nyere ha aka. Ụfọdụ n’ime ihe o dere n’akwụkwọ ozi ahụ bụ: “Anyị na-arịọ gị, Onye Nsọ, ka i nyere anyị aka . . . ma zọpụta anyị n’aka onye iro anyị bụ́ . . . Don Juan Tavera. Kwa ụbọchị, ọ na-enye anyị nsogbu, ọ naghị ekwe anyị ṅụrụ mmiri tọgbọ iko. . . . Anyị ahụsiela anya n’aka ya n’ihi na o weere anyị ka anụ oriri. . . . Ọ bụrụ na i nyere anyị aka, ‘Yahweh ga na-echebe gị, ọ gaghịkwa ekwe ka ụkwụ gị kpọọ n’ihe ọ bụla.’ (Ilu 3:23)” *

Ihe Alfonso de Zamora Rụpụtara

N’agbanyeghị nsogbu ahụ a na-enye Zamora, ọ kwụsịghị ọrụ ya nke ga-abara ọtụtụ ndị na-amụ Baịbụl uru. Ọ bụ eziokwu na o nweghị Akwụkwọ Nsọ ọ sụgharịrị n’asụsụ ndị a na-asụ n’oge ya, ọ rụrụ ọrụ baara ndị ọzọ na-asụgharị Baịbụl ezigbo uru. Iji ghọta uru ihe ndị ọ rụrụ bara, anyị kwesịrị icheta na e nwere ụzọ ndị abụọ na-asụgharị Baịbụl. Ndị nke mbụ bụ ndị ma asụsụ ndị e ji dee Baịbụl, ya bụ, Hibru, Arameik, na Grik. Ha na-amụ Baịbụl ndị ahụ e ji aka dee ka ha nwee ike ịsụgharị ha ma dezigharịa ha. Ọ bụzi mgbe ahụ ka onye na-asụgharị Baịbụl n’asụsụ ndị ọzọ ga-eji ihe ndị ahụ a sụgharịrị bidozie ọrụ.

Alfonso de Zamora kacha rụọ ọrụ n’ịsụgharị na idezigharị asụsụ Hibru e mechara jiri sụgharịa ma bipụta Baịbụl Kọmplutum ahụ n’afọ 1522. (Otu akwụkwọ o dere banyere okwu Hibru na Latịn nakwa banyere ụtọ asụsụ Hibru sokwa nyere ndị na-asụgharị Baịbụl aka. Akwụkwọ a dịkwa n’ime Baịbụl ahụ.) Erasmus, bụ́ onye ya na Zamora dịkọrọ ndụ, rụkwara ụdị ọrụ a n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, bụ́ nke ọtụtụ ndị na-akpọ Agba Ọhụrụ. Ozugbo e wepụtara Baịbụl Kọmplutum ahụ bụ́ nke nwere asụsụ Hibru na asụsụ Grik e dezigharịrị edezigharị, ndị nsụgharị ndị ọzọ bidoro sụgharịwa Baịbụl n’asụsụ ndị mmadụ na-asụ. Mgbe William Tyndale sụgharịrị Baịbụl n’asụsụ Bekee, ọ bụ ya bụ onye mbụ ji asụsụ Hibru dị na Baịbụl Kọmplutum sụgharịa Baịbụl.

Otú Baịbụl si ju ebe niile taa gosiri na e kwesịrị ịja Zamora na ndị ọzọ mma, bụ́ ndị ji ndụ ha rụọ ọrụ ka anyị nwee ike ịghọtakwu Akwụkwọ Nsọ. Dị ka Zamora kwuru, ihe ga-eme ka a zọpụta ndị mmadụ bụ ma ha ghọta Okwu Chineke ma mee ihe e dere na ya. (Jọn 17:3) Ihe ga-emekwanụ ka nke a nwee isi bụ ịsụgharị Baịbụl n’asụsụ ndị mmadụ na-aghọta, n’ihi na ọ bụ naanị ya ga-eme ka ihe e kwuru na Baịbụl ruo ọtụtụ nde mmadụ n’obi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 A kọwakwuru otú Baịbụl Kọmplutum a si baa uru n’Ụlọ Nche April 15, 2004, peeji nke 28-31.

^ par. 15 Ọ dị mma ịmara na Zamora kpọrọ aha Chineke, ọ bụghị utu aha ya, n’akwụkwọ ozi ahụ o degaara poopu nke Rom. Mgbe a sụgharịrị akwụkwọ ozi ahụ n’asụsụ Spanish, otú e si dee aha Chineke na ya bụ “Yahweh.” O nweghị onye ma otú o si dee ya n’asụsụ Latịn o ji dee akwụkwọ ozi ahụ. Ị chọọ ịmata banyere akwụkwọ ndị Zamora sụgharịrị na otú o si sụgharịa aha Chineke, gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ịsụgharị Aha Chineke,” nke dị na peeji nke 19.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 19]

Ịsụgharị Aha Chineke

Ọ dị mma ịmara otú Alfonso de Zamora, bụ́ onye Hibru gụrụ akwụkwọ, si sụgharịa aha Chineke. Na foto dị ebe a, ị ga-ahụ ebe o dere aha Chineke “jehovah” n’akụkụ otu n’ime peeji nke akwụkwọ Jenesis, bụ́ nke ọ sụgharịrị n’asụsụ Hibru na Latịn.

O doro anya na Zamora kwetara na ọ bụ otú a ka e kwesịrị isi sụgharịa aha Chineke n’asụsụ Latịn. N’ihe dị ka narị afọ ise gara aga, mgbe a na-asụgharị Baịbụl n’asụsụ ụfọdụ e nwere na Yurop, ọtụtụ ndị ọzọ sụgharịrị Baịbụl dere aha Chineke “jehovah” ma ọ bụ otú yiri ya. Ụfọdụ n’ime ha bụ William Tyndale (onye sụgharịrị Baịbụl n’asụsụ Bekee n’afọ 1530), Sebastian Münster (n’asụsụ Latịn n’afọ 1534), Pierre-Robert Olivétan (n’asụsụ French n’afọ 1535), nakwa Casiodoro de Reina (n’asụsụ Spanish n’afọ 1569).

Zamora si otú a ghọọ otu n’ime ndị ọkà mmụta mbụ mere ka ndị mmadụ mata aha Chineke n’oge ya. Ọ bụ nkwenkwe ụgha ndị Juu, bụ́ nke kwuru na ọ dịghị mma ịkpọ aha Chineke, mere ka ndị mmadụ ghara ịma aha Chineke. Ọ bụkwa nkwenkwe ụgha a mere ka ụfọdụ ndị sụgharịrị Baịbụl, dị ka Jerome, bụ́ onye sụgharịrị Baịbụl a na-akpọ Vulgate n’asụsụ Latịn, were okwu bụ́ “Onyenwe anyị,” “Chineke” ma ọ bụ okwu ndị ọzọ dochie aha Chineke.

[Foto]

Ebe Zamora sụgharịrị mkpụrụ okwu hibru bụ́ aha chineke “jehova”

[Foto dị na peeji nke 18]

Iwu ahụ eze Spen na nwunye ya tiri n’afọ 1492

[Foto]

Decree: Courtesy of the Archivo Histórico Provincial, Ávila, Spain

[Foto dị na peeji nke 18]

Mahadum Alkala de Henares

[Foto dị na peeji nke 21]

Ime ihu akwụkwọ ahụ Zamora sụgharịrị