Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Anyị Gara Ikwusa Ozi Ọma n’Ebe Bụ́ Snoo Snoo

Mgbe Anyị Gara Ikwusa Ozi Ọma n’Ebe Bụ́ Snoo Snoo

Akwụkwọ Ozi Si Nọọwee

Mgbe Anyị Gara Ikwusa Ozi Ọma n’Ebe Bụ́ Snoo Snoo

OTU ụbọchị n’oge oyi, anyị si na windo lepụ anya n’isi ụtụtụ ka anyị mara otú ihu eluigwe dị. Obi dị anyị ụtọ na ihu eluigwe gbachapụrụ agbachapụ. Anyị na-aga ikwusa ozi ọma na Finmaksvida, bụ́ otu obodo dị n’ebe ugwu mba Nọọwee, bụ́ otu n’ime ebe ndị kacha ajụ oyi n’ụwa. Anyị ga-anọ abalị atọ n’ebe ahụ.

Na Nọọwee, oge oyi na-adị egwu. N’ihi ya, ụjọ nọ na-atụ anyị ma ànyị ga-anọlikwa n’obodo ahụ dị n’elu ugwu. Ma, obi dị anyị ụtọ na anyị na Ndịàmà Jehova atọ, bụ́ ndị bi n’ebe ahụ, so aga. Ha ma otú ebe ahụ dị, ha agwakwala anyị ihe ndị anyị ga-eme.

Okporo ụzọ e nwere n’obodo ahụ dị ole na ole, n’ihi ya, ihe kacha mma e ji agaru n’ụlọ ndị dị n’ime ime obodo bụ obere ụgbọala na-agba n’elu snoo. Anyị kwanyere ngwongwo anyị nakwa mmanụ ụgbọala n’obere ụgbọala ahụ nakwa n’ihe ọzọ ụgbọala ahụ na-adọkpụ. I lepụ anya n’ihu, ebe niile bụ snoo snoo. Anwụ na-achanụ mere ka snoo ahụ na-egbuke egbuke. Ebe niile mara nnọọ mma!

E nwere anụmanụ ndị dị ka atụ́, ùrúrù, nkịta ọhịa, na anụ ndị ọzọ na Finmaksvida, nweekwa anụ ọhịa bea ole na ole. Ma, ihe bụ́ mkpa anyị bụ ikwusara ndị bi n’obodo a ozi ọma. Ọ na-agụ anyị agụụ ịhụ ndị Sami bi n’ebe ahụ, ndị ọrụ ha bụ ịzụ atụ́, ma, ụfọdụ n’ime ha na-arụ ọrụ n’ebe ndị ọbịa na-ebi n’obodo ahụ.

N’ihu otu ụlọ ebe ndị ọbịa na-ebi, anyị hụrụ ọtụtụ ndị na-eto eto bụ́ ndị ha na ụmụ akwụkwọ ibe ha ji ihe e ji agba ọsọ na snoo na-agba ọsọ. Ha kwụsịrị jụọ anyị ihe anyị bịara ime. Anyị gwara ha. Mgbe anyị na-apụ, otu onye n’ime ha sịrị anyị, ‘Jisienụ ike n’ozi ọma unu na-ekwusa.’ Mgbe anyị banyeghachiri n’ụgbọala anyị, anyị gbafere nnukwu ọdọ mmiri ndị kpụkọrọ akpụkọ n’ihi oyi, gbafeekwa ebe ndị mmadụ na-ebighị. Ka anyị na-aga, anyị nọ na-eche ma ànyị ga-ahụkwa ìgwè atụ́.

Mgbe anyị rutere n’otu obere ụlọ, otu nwoke nọ ebe ahụ kelere anyị nke ọma. O so ná ndị bi ebi n’ebe ahụ. Mgbe ọ hụrụ na o nwere ihe gbajiri n’ihe ahụ ụgbọala anyị na-adọkpụ, ọ gwara anyị ka ya meziere anyị ya. Ọ tụsaara nnọọ ahụ́ na-edozi ya, ndị mmadụ anaghị eji ọkụ ọkụ eme ihe n’ebe a. Otú a o si na-eme mekwara ka ahụ́ ruo anyị ala. Mgbe o mezichara ya, anyị kelere ya ma jiri Baịbụl kọwaara ya ihe mere Chineke ji kwe ka ahụhụ dịrị. O gere anyị ntị nke ọma. Tupu anyị alawa, ọ naara anyị akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nakwa Ụlọ Nche na Teta! Ọ mụmụrụ ọnụ ọchị, sị anyị, “Unu emeela bịa leta m.”

Anyị gakwara ebe ndị ọzọ. Ma mgbe anyị na-amala ihe na-emenụ, chi ejiwela, anyị agawazie ebe anyị ga-ehi. Ka anyị na-aga, anyị hụrụ otu nkịta ọhịa. Otú ala ebe ahụ si enwu gbaa mere ka ajị dị ya n’ahụ́ nke na-acha uhie uhie maa mma ile anya. Nkịta ọhịa ahụ kwụsịrị, lee anyị anya, gawakwa ebe ọ na-aga. Snoo bidoziri dawa, mee ka anyị ghara ịhụchakwa ebe anyị na-aga. Ma obi ruru anyị ala mgbe anyị mechara ruo ebe anyị ga-ehi. Anyị menwuru ọkụ, ebe niile ejirikwa nwayọọ nwayọọ kporo ọkụ. Ọ bụ eziokwu na ike gwụchara anyị n’ihi ihe anyị gbagharịrị n’ụbọchị ahụ, obi dị anyị nnọọ ụtọ.

Tupu anyị amara ihe na-emenụ, chi efoola. Anyị kwanyeghachiri ngwongwo anyị n’ụgbọala anyị, gawazie n’ebe ndịda ugwu ahụ. Anyị si n’akụkụ otu ọwa mmiri gara ruo n’otu ụlọ ọzọ ebe ndị ọbịa na-ebi. Anyị hụrụ otu nwa okorobịa n’ebe ahụ ma zie ya ozi ọma. O gosiziri anyị ụzọ kacha mfe anyị ga-esi laghachi ebe anyị na-ehi.

Ụbọchị anyị ga-ala ruziri. Anyị gara otu ebe ndị mmadụ na-aga elepụ anya nke dị na Stabọsdalin, ma hụ otú ala ebe ahụ si maa mma, hụkwa ugwu ndị mara mma snoo kpuchiri, bụ́ ndị na-egbuke egbuke ka anwụ na-acha. Ọ dịghị anya, anyị ahụ ìgwè atụ́. Ha nọ na-ata ihe ndị yiri ero ndị nsoo kpuchiri, bụ́ ndị ha ji ụkwụ ha na-abọpụta. Anyị lepụrụ anya hụ otu onye Sami ka ọ nọ n’obere ụgbọala ya. Ọ nọ na-elekọta ìgwè atụ́ ya. Nkịta ya nọkwa nso na-enyere ya aka. Nkịta ahụ lere anya n’ebe anyị nọ, mewekwa ihe ọ na-eme. Anyị ziri nwoke ahụ ozi ọma, o gekwara anyị ntị.

Ka anyị na-ala, anyị nọ na-echeta ndị niile anyị hụrụ n’ebe ahụ, bụ́ ebe anyị gbara narị kilomita atọ tupu anyị eruo. Obi dị anyị ụtọ na anyị gara zie ozi ọma n’ebe ahụ bụ́ snoo snoo.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 15]

© Norway Post