Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Oge Ịhụ Mmadụ n’Anya na Oge Ịkpọ Mmadụ Asị

“Oge Ịhụ Mmadụ n’Anya na Oge Ịkpọ Mmadụ Asị

“Oge Ịhụ Mmadụ n’Anya na Oge Ịkpọ Mmadụ Asị

N’OBODO ụfọdụ, ndị mmadụ na-ede okwu bụ́ “Chineke bụ ịhụnanya” ma mapawa ya n’ụlọ ha. N’eziokwu, okwu a kọwara nnọọ ụdị onye Chineke bụ.

Ma, ọtụtụ ndị amaghị na okwu ahụ si na Baịbụl. Ọ bụ Jọn onyeozi dere ya. O dere, sị: “Onye na-enweghị ịhụnanya amaghị Chineke, n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Jọn dekwara na Chineke hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Ọ sịrị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.

N’ihi ihe ahụ Baịbụl kwuru, ụfọdụ ndị nwere ike iche na ihe ọ sọkwara anyị mee, Chineke enweghị ihe ọ ga-eme anyị. Otú ọtụtụ ndị si ebi ndụ na-egosi na ha na-eche na Chineke agaghị ajụ ha ajụjụ maka ihe ọ bụla ha mere. Ma, nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu? Chineke ọ̀ hụrụ ma ndị ọma ma ndị ọjọọ n’anya? Ò nwere mgbe Chineke na-akpọ mmadụ ma ọ bụ ihe ụfọdụ asị?

Ịhụnanya Chineke na Ihe Ọ Kpọrọ Asị

Eze Sọlọmọn, bụ́ onye maara ihe, kwuru, sị: “E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla, ihe ọ bụla a na-eme n’okpuru eluigwe nwekwara oge . . . oge ịhụ mmadụ n’anya na oge ịkpọ mmadụ asị.” (Ekliziastis 3:1, 8) Ihe e kwuru ebe a na-egosi na n’agbanyeghị na Chineke hụrụ ụmụ mmadụ n’anya ma na-emere ha ebere, o nwere oge ọ na-akpọ mmadụ asị.

Ma, gịnị ka ‘ịkpọasị’ Baịbụl kwuru okwu ya pụtara? Otu akwụkwọ kwuru, sị: “N’Akwụkwọ Nsọ, okwu ahụ bụ́ ‘ịkpọasị’ nwere ihe dị iche iche ọ pụtara. O nwere ike ịpụta mmadụ iburu onye ọzọ iwe ma ọ bụ ihe ọjọọ n’obi. Ụdị ịkpọasị a nwere ike ime ka mmadụ chọwa otú ọ ga-esi mee onye ọ kpọrọ asị ihe ọjọọ.” Ọ bụ otú a ka ọtụtụ ndị ga-esi akọwa ihe ịkpọasị pụtara, ọ bụkwa ụdị ịkpọasị a na-akpata ọtụtụ nsogbu ndị e nwere n’ụwa taa. Ma, akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na e nwere ihe na-adịghị mmadụ mma, e nwere ike ikwu na onye ahụ kpọrọ ihe ahụ asị, n’agbanyeghị na o nweghị ihe ọjọọ onye ahụ bu n’obi ime.”

Ọ bụ ụdị ịkpọasị nke abụọ a ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a. Ajụjụ bụzi, Chineke ò nwere ike ịkpọ mmadụ ma ọ bụ ihe ụfọdụ ụdị asị a? Legodị ihe e kwuru n’Ilu 6:16-19. Ebe ahụ sịrị: “E nwere ihe isii Jehova kpọrọ asị; ee, ihe asaa bụụrụ mkpụrụ obi ya ihe arụ: anya dị elu, ire na-agha ụgha, na aka na-awụfu ọbara nke na-emeghị ihe ọjọọ, obi nke na-echepụta ihe ọjọọ, ụkwụ nke na-eme ngwa ịgbaga n’ihe ọjọọ, onye akaebe ụgha nke na-ekupụ okwu ụgha dị ka ume, na onye ọ bụla nke na-ezisa esemokwu n’etiti ụmụnne.”

Ebe a na-egosi na e nwere omume ndị Chineke kpọrọ asị. Ma, nke ahụ apụtaghị na ọ kpọrọ onye na-eme ụdị omume ndị ahụ asị. Ọ maara na ezughị okè, ebe mmadụ bi, aka e ji zụọ mmadụ, na ihe ndị ọzọ nwere ike ime ka mmadụ mee omume ọjọọ. (Jenesis 8:21; Ndị Rom 5:12) Onye dere akwụkwọ Ilu mere ihe atụ gosiri na Jehova anaghị akpọ onye mere ihe ọjọọ asị. Ọ sịrị: “Onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-abara mba, ọbụna dị ka nna si abara nwa ya nke ihe ya dị ya mma mba.” (Ilu 3:12) Ọ bụrụ na nwatakịrị na-akpa àgwà ọjọọ, nna ya na-akpọ àgwà ọjọọ ahụ asị, ma ọ ka ga-ahụ nwa ahụ n’anya, ọ ga na-adọkwa ya aka ná ntị iji nyere ya aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ahụ. Ebe Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, ọ na-emekwa ka nna ahụ ma ọ bụrụ na onye ahụ na-eme ihe ọjọọ chọrọ ichegharị.

Mgbe Ịkpọasị Dị Mma

Ma, gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ maara iwu Chineke ma jụ ime ya? Chineke agaghị ahụ onye ahụ n’anya. Ọ bụrụ na onye ahụ kpachaara anya na-eme ihe ndị Jehova kpọrọ asị, Jehova ga-akpọ onye ahụ asị. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru, sị: “Jehova na-enyocha ma onye ezi omume ma onye ajọ omume, mkpụrụ obi ya kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.” (Abụ Ọma 11:5) Chineke agaghị agbaghara onye mmehie na-achọghị ichegharị. Pọl onyeozi mere ka nke a doo anya n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru, sị: “Ọ bụrụ na anyị elezie anya na-eme mmehie mgbe anyị nwetasịrị ezi ihe ọmụma nke eziokwu ahụ, ọ dịkwaghị àjà ọ bụla fọrọ a ga-achụ maka mmehie, kama e nwere nnọọ ikpe dị egwu nke a na-atụ anya ya, na ekworo na-enwu ka ọkụ nke ga-erepịa ndị mmegide.” (Ndị Hibru 10:26, 27) Gịnị mere Chineke, bụ́ onye hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, ga-eji eme otú ahụ?

Ọ bụrụ na mmadụ akpachara anya na-eme mmehie jọgburu onwe ya, ihe ọjọọ ahụ nwere ike ịba onye ahụ n’ụmị nke na onye ahụ agaghị ahapụli ihe ọjọọ ahụ. O nwere ike onye ahụ agaghị enwekwa mmekwata. Baịbụl kwuru na ụdị onye a yiri agụ owuru nke na-enweghị ike ịgbanwe àgwà ọ tụrụ. (Jeremaya 13:23) Ebe ọ bụ na onye ahụ emekataghị chegharịa, Baịbụl kwuru na ọ bụ “onye ikpe mmehie mara ruo mgbe ebighị ebi,” nke pụtara na a gaghị agbaghara ya agbaghara.—Mak 3:29.

Ikpe mmehie ebighị ebi a mara Adam na Iv na Judas Iskarịọt. Ebe ọ bụ na Adam na Iv zuru okè, ghọtakwa iwu Chineke nyere ha nke ọma, o doro anya na ha kpachaara anya mee mmehie, ha agaghị asị na ha amaghị ụma. Ihe Chineke mechara gwa ha gosiri na nchegharị adịkwaraghị ha. (Jenesis 3:16-24) Ọ bụ eziokwu na Judas ezughị okè, ma ya na Ọkpara Chineke kpachiri anya, n’agbanyeghị nke ahụ, ọ raara Jizọs nye n’aka ndị ọjọọ. Jizọs kpọrọ ya “nwa mbibi.” (Jọn 17:12) Baịbụl gosikwara na Ekwensu bụ onye mmehie nke na-enweghị mmekwata, naanị ihe a ga-eme ya bụ igbu ya egbu. (1 Jọn 3:8; Mkpughe 12:12) Ndị a niile metere ihe Chineke ji kpọọ ha asị.

Ma ọ dị mma ịmara na ọ bụghị onye ọ bụla mere mmehie ka mmehie ya na-enweghị mgbaghara. Jehova na-enwere ụmụ mmadụ ndidi, ọ naghịkwa amasị ya ịma ndị na-amaghị ụma mee mmehie ikpe ọnwụ. (Ezikiel 33:11) Ọ na-agwa ndị mmehie ka ha chegharịa, ka o wee gbaghara ha. Baịbụl sịrị: “Ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ya, ka onye ọjọọ kwụsị iche echiche ọjọọ ya. Ya laghachikwuru Jehova, bụ́ onye ga-emere ya ebere, ya laghachikwuru Chineke anyị, n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụzọ dị ukwuu.”—Aịzaya 55:7.

Mgbe Ịhụnanya Kwesịrị Ekwesị na Mgbe Ịkpọasị Kwesịrị Ekwesị

Ebe ọ bụ na ezigbo Ndị Kraịst na-eme ka Chineke, ha kwesịrị ịghọta oge bụ́ “oge ịhụ mmadụ n’anya” na “oge ịkpọ mmadụ asị.” Obi nwanne ma ọ bụ obi nwa nwere ike ime ka anyị meere mmadụ ebere ma ọ bụ hụ onye ahụ n’anya mgbe anyị na-ekwesịghị ime otú ahụ. Ma ihe Jud, bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, kwuru ga-enyere anyị aka ịghọta mgbe anyị kwesịrị imere mmadụ ebere na ihe anyị kwesịrị ịkpọ asị. Jud sịrị: “Na-emerenụ ndị ọzọ ebere, jirinụ egwu na-eme otú ahụ. Kpọọkwanụ uwe ime nke anụ ahụ́ tetọrọ asị.” (Jud 22, 23) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpọ ihe ọjọọ mmadụ na-eme asị, ọ bụghị onye na-eme ihe ọjọọ ahụ.

E nyekwara Ndị Kraịst iwu ka ha na-ahụ ndị iro ha n’anya ma na-emere ha ihe ọma. Jizọs sịrị: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu.” (Matiu 5:44) Ọ bụ nke a mere Ndịàmà Jehova ji aga na nke ndị agbata obi ha mgbe niile, na-ekwusara ha ozi ọma Alaeze Chineke, n’agbanyeghị na ụfọdụ anaghị ege ha ntị. (Matiu 24:14) Ndịàmà Jehova na-ele ndị mmadụ anya otú Chineke si ele ha, n’ihi ya, ha na-ewere onye ọ bụla ha hụrụ ka onye nwere ike ichegharị, Jehova agbaghara ya. Ọ bụrụ na ndị mmadụ ekweghị ege ha ntị, ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na a na-akpagbu ha, ha na-eme ihe Pọl onyeozi kwuru. Ọ sịrị: “Na-agọzinụ ndị na-akpagbu unu; na-agọzinụ ndị mmadụ, unu abụkwala ha ọnụ . . . Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ.” (Ndị Rom 12:14, 17) Ha na-echeta na ọ bụ Jehova na-ekpebi onye ọ ga-ahụ n’anya na onye ọ ga-akpọ asị. Ọ bụ ya ga-ekpebi onye ga-adị ndụ na onye na-agaghị adị ndụ.—Ndị Hibru 10:30.

N’eziokwu, “Chineke bụ ịhụnanya.” Anyị kwesịkwara igosi na obi dị anyị ụtọ na Chineke hụrụ ụmụ mmadụ n’anya ma gbalịa ike anyị niile ịmata ihe bụ́ uche ya ma na-eme ya. Ndịàmà Jehova ndị bi n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ isi na Baịbụl gị nyere gị aka ka ị mụta ihe bụ́ uche Chineke ma na-eme ya. Ọ bụrụ na i mee nke a, Chineke agaghị akpọ gị asị, kama ọ ga-ahụ gị n’anya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 23]

“E nwere ihe isii Jehova kpọrọ asị; ee, ihe asaa bụụrụ mkpụrụ obi ya ihe arụ: anya dị elu, ire na-agha ụgha, na aka na-awụfu ọbara nke na-emeghị ihe ọjọọ, obi nke na-echepụta ihe ọjọọ, ụkwụ nke na-eme ngwa ịgbaga n’ihe ọjọọ, onye akaebe ụgha nke na-ekupụ okwu ụgha dị ka ume, na onye ọ bụla nke na-ezisa esemokwu n’etiti ụmụnne.”—ILU 6:16-19

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 24]

“Ọ bụrụ na anyị elezie anya na-eme mmehie mgbe anyị nwetasịrị ezi ihe ọmụma nke eziokwu ahụ, ọ dịkwaghị àjà ọ bụla fọrọ a ga-achụ maka mmehie, kama e nwere nnọọ ikpe dị egwu nke a na-atụ anya ya.” —NDỊ HIBRU 10:26, 27

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 25]

“Ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ya, ka onye ọjọọ kwụsị iche echiche ọjọọ ya. Ya laghachikwuru Jehova, bụ́ onye ga-emere ya ebere, . . . ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụzọ dị ukwuu.”—AỊZAYA 55:7

[Foto dị na peeji nke 24]

Nna nke hụrụ nwa ya n’anya na-adọ nwa ya aka ná ntị ka o wee nyere ya aka

[Foto dị na peeji nke 25]

Ịhụnanya Chineke na ebere ya abaarala ọtụtụ ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ uru