Ebreham Nwoke Dị Umeala N’obi
Ebreham Nwoke Dị Umeala N’obi
N’ehihie otu ụbọchị, Ebreham nọ n’ụlọikwuu ya na-ezuru ike. Mgbe o lepụrụ anya, ọ hụrụ ụmụ nwoke atọ bụ́ ndị ọbịa n’obodo ahụ. * Ọ gbapụrụ ozugbo gaa kpọọ ha, gwa ha ka ha bịa n’ụlọ ya zurutụ ike ka ya chọọrọ ha ọjị. Ọ gwara ha na ọ ga-ewetara ha “achịcha,” ma ọ gaziri kwadebere ha nnukwu oriri. O meere ha achịcha, gbuoro ha nwa oké ehi, nyekwa ha mmiri ara ehi, na bọta. Ihe a Ebreham mere gosiri na ọ na-emesapụ aka, ma anyị ga-ahụkwa na o gosiri na ọ dị nnọọ umeala n’obi.—Jenesis 18:1-8.
GỊNỊ BỤ ỊDỊ UMEALA N’OBI? Ọ bụrụ na mmadụ dị umeala n’obi, ihe ọ pụtara bụ na onye ahụ adịghị mpako, ọ bụghịkwa onye na-akpa nganga. Onye dị umeala n’obi na-ekweta na e nwere ihe ndị ọzọ ji kara ya. (Ndị Filipaị 2:3) Ọ bụrụ na ndị ọzọ atụọrọ ya aro, ọ na-anabata ya, ọ na-ejikwa obi ya niile ejere ndị ọzọ ozi.
OLEE OTÚ EBREHAM SI GOSI NA YA DỊ UMEALA N’OBI? Ebreham ji obi ụtọ jeere ndị ọzọ ozi. Dị ka anyị kọrọ ná mmalite, mgbe Ebreham hụrụ ndị ọbịa atọ ahụ, ọ gbapụrụ ozugbo gaa kpọọ ha ma gbagharịwa ka o lee ha ọbịa. Sera nwunye ya siwere ihe ha ga-eri ozugbo. Ma ị̀ chọpụtara na ọ bụ Ebreham rụrụ ọrụ kachanụ? Ọ bụ Ebreham gbapụrụ gaa kpọọ ndị ọbịa ahụ, ọ bụ ya sịrị ha bata ka ọ chọrọ ha ọjị, ọ bụ ya gara weta anụ e gbuuru ha, ọ bụkwa ya buteere ndị ọbịa ahụ ihe oriri niile ahụ. Kama ịgwa ndị odibo ya ka ha mee ihe ndị ahụ, nwoke a dị umeala n’obi mere ihe ndị ahụ n’onwe ya. O wereghị onwe ya na ya akarịala ịrụ ọrụ ndị ahụ.
Ebreham gere nwunye ya ntị mgbe ọ tụụrụ ya aro. Ọ bụ naanị mkparịta ụka ole na ole Ebreham na Sera kparịtara ka a kọrọ na Baịbụl. N’agbanyeghị nke ahụ, Baịbụl kọrọ ugboro abụọ na Ebreham gere Sera ntị ma Jenesis 16:2; 21:8-14) N’otu n’ime ugboro abụọ ahụ, ihe Sera kwuru “wutere nnọọ Ebreham.” Ma mgbe Jehova gwara Ebreham na ihe Sera kwuru dị mma, Ebreham nabatara ihe ahụ Sera kwuru ma mee ya n’ihi na ọ bụ nwoke dị umeala n’obi.
mee ihe o kwuru. (GỊNỊ KA ANYỊ NA-AMỤTA N’AKA YA? Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi n’eziokwu, anyị ga-eji obi ụtọ na-ejere ndị ọzọ ozi. Anyị ga na-enwe obi ụtọ na anyị na-eme ihe niile anyị nwere ike ime ka ihe dịrị ndị ọzọ mfe.
Ihe anyị na-eme mgbe ndị ọzọ tụụrụ anyị aro nwekwara ike igosi ma ànyị dị umeala n’obi ka ọ̀ bụ na anyị adịghị. Kama ịjụ ihe ndị ọzọ kwuru naanị maka na ọ bụghị anyịnwa kwuru ya, ọ ka mma ịnabata ihe ndị ọzọ kwuru. (Ilu 15:22) Ime otú ahụ na-abara anyị niile uru, ma ọ ga-akacha abara ndị nwere ndị nọ ha n’okpuru uru. Otu nwoke nke aha ya bụ John, onye nwere ndị nọ ya n’okpuru n’ebe ọ na-arụ ọrụ, kwuru, sị: “Achọpụtala m na onye bụ́ ezigbo onyeisi ọrụ kwesịrị ime ka ọ dịrị ndị nọ n’okpuru ya mfe ikwu ihe ha chere.” O kwukwara, sị: “Ọ bụ ịdị umeala n’obi ga-eme ka onye bụ́ onyeisi ọrụ kweta na ndị nọ ya n’okpuru nwere ike ịka ya mara otú ka mma e nwere ike isi rụọ ihe ụfọdụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị onye macha ihe niile, ọ sọgodị onye ahụ ya bụrụ onyeisi ọrụ.”
Ọ bụrụ na anyị na-ejere ndị ọzọ ozi ma na-ege ndị ọzọ ntị otú ahụ Ebreham mere, Jehova ga-ahụ anyị n’anya, n’ihi na Baịbụl kwuru, sị: “Chineke na-emegide ndị mpako, ma ọ na-egosi ndị dị umeala n’obi obiọma na-erughịrị mmadụ.”—1 Pita 5:5.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 2 O nwere ike ịbụ na n’oge ahụ, Ebreham amaghị na ndị ọbịa ahụ bụ ndị mmụọ ozi Chineke.—Ndị Hibru 13:2.