Ha Ekweghị Ka Ókèala Kewaa Ha
Ha Ekweghị Ka Ókèala Kewaa Ha
E nwere ọtụtụ ihe na-ekewa ndị mmadụ taa. Ma Ndịàmà Jehova anaghị ekwe ka ihe ọ bụla kewaa ha na ụmụnna ha. Ha na-echeta na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu niile bụ ụmụnna.” (Matiu 23:8) Ihe mere n’ebe Ndịàmà Jehova na-anọ amụ ihe na Pọchụgal nakwa n’ebe ha na-anọ amụ ihe na Spen gosiri na ha na-echeta ihe ahụ Jizọs kwuru.
N’EBE ugwu mba Pọchụgal, e nwere otu obodo a na-akpọ Valensa do Min-yo. A rụrụ obodo ahụ n’oge agha ma jiri mgbidi gbaa ya gburugburu. Ọ bụrụ na mmadụ anọrọ n’ebe ndị agha na-anọ alụ agha ná mgbidi ahụ, ọ ga-ahụ Osimiri Min-yo nke kewara mba Spen na mba Pọchụgal. Ị gafee osimiri ahụ, ị ga-ahụ otu obodo dị na Spen nke a na-akpọ Tui, bụ́ ebe e nwere nnukwu ụlọ ụka nke yiri ebe ndị agha na-anọ eche nche. A rụrụ mgbidi ndị ahụ dị n’obodo Tui na n’obodo Valensa n’ihe dị ka narị afọ anọ gara aga, mgbe ndị Spen na Pọchụgal na-alụ agha.
Ebe ọ bụ na Spen na Pọchụgal so n’Òtù Jikọtara Mba Ndị Dị na Yurop, a kụtusịrị ebe ndị a na-anọ eche nche n’ókè mba abụọ ahụ n’afọ 1995, kwụsịkwa ịgwa ụmụ amaala mba abụọ ahụ ka ha na-egosi akwụkwọ ikike tupu ha abanye ná mba ndị ahụ. Ma ihe ga-eme ka ndị mmadụ dịrị n’udo abụghị naanị ịkụtusị ebe ndị ahụ. Ndị mmadụ ga-akwụsịrịrị ịkpọ ibe ha asị ma ọ bụrụ na ha chọrọ ibi n’udo. N’obodo Valensa, e nwere obere ọmarịcha ụlọ nke na-egosi na ndị mmadụ nwere ike ịkwụsị ịkpọ ibe ha asị. Ụlọ ahụ bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova. Ndịàmà Jehova bi na Pọchụgal nakwa ndị nke si Spen na-anọ na ya amụ Baịbụl.
N’afọ 2001, Ndịàmà Jehova bi n’obodo Tui malitere ịchọ ebe ọzọ ha ga-anọ na-amụ Baịbụl. Ha chọpụtara na ha kwesịrị ịkwapụ n’ebe ha na-anọbu, ha enweghịkwanụ ego ha ga-eji rụta ụlọ nke ha ma ọ bụdị ego ha ga-eji nweta ebe ọzọ ha ga na-akwụ ụgwọ ya. Ihe kpatara ya bụ na Ndịàmà Jehova ahụ bi na Tui adịghị ọtụtụ. Ihe ha meziri bụ ịrịọ Ndịàmà Jehova ibe ha bi na Valensa, nke dị na Pọchụgal, na ha chọrọ ịbịa na-amụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, bụ́ nke na-adịghị anya ma e si Tui gawa ya.
Eduardo Vila, bụ́ Onyeàmà Jehova bi na Tui, kwuru, sị: “Ọ bụ na Disemba afọ 2001 ka anyị
na ụmụnna anyị ndị Pọchụgal kparịtara ihe ahụ anyị chọrọ ime. Mgbe anyị na ha kparịtachara, achọpụtara m na Jehova metụrụ ụmụnna anyị ahụ aka n’obi. Ọ dịghịrị ha mfe ịrụ ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ, ma obi tọrọ m ụtọ ịhụ na ha chọrọ ka anyị bịa na-amụ ihe n’ebe ahụ.”Américo Almeida, bụ́ onye Pọchụgal nke nọ mgbe a kparịtara ihe ahụ, sịrị: “Anyị ji obi anyị niile gwa ụmụnna anyị ahụ si Spen ka ha bịawa. Obi siri anyị ike na Jehova ga-agọzi ihe ahụ anyị ji otu obi kpebie na anyị ga-eme.” Ndịàmà Jehova ahụ bi na Pọchụgal na ndị nke ahụ si Spen na-emekọ ihe ọnụ. Paolo, bụ́ onye bi na Valensa, sịrị: “N’eziokwu, anyị anaghịdị echeta na anyị esighị n’otu mba. Anyị niile ma na anyị bụ ụmụnna.”
Ọ bụrụ na mmadụ abata n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ, ọ ga-ahụ klọọkụ abụọ yiri ibe ha ndị e kowere n’azụ azụ. Ma, klọọkụ abụọ ahụ anaghị akụ otu ihe n’ihi na oge ndị Spen na oge ndị Pọchụgal abụghị otu. Ọ kụọ elekere isii na klọọkụ ndị Pọchụgal, ọ ga na-akụ elekere asaa na nke ndị Spen. Mgbe a chọrọ ịrụzigharị Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ, kọmitii na-ahụ maka ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, bụ́ nke nọ na Spen, haziri ọrụ ahụ. Ụmụnna ahụ bi na Pọchụgal na ndị nke si Spen jikọkwara aka rụọ ya. Paolo sịrị: “Ọtụtụ Ndịàmà Jehova iwu ụlọ doro anya si Spen bịa nyere anyị aka, ụfọdụ sidị ihe karịrị otu narị kilomita na iri isii bịa. Ọrụ ahụ anyị rụkọrọ ọnụ mere ka anyị hụkwuo ibe anyị n’anya.”
Ka anyị leba anya n’ihe atụ ọzọ na-egosi na Ndịàmà Jehova anaghị ekwe ka ókèala obodo mee ka ha na Ndịàmà Jehova ibe ha ghara ịdị ná mma.
Ha Ekweghị Ka Ndagwurugwu Kewaa Ha
E nwere otu obodo dị na Spen a na-akpọ Puiteda. Ọ dị n’ókè mba Spen na mba Frans, n’otu ndagwurugwu nke ala ya na-eme nri nke ọma. Ugwu a na-akpọ Piriniiz gbakwara ya gburugburu. A na-akpọ ndagwurugwu niile ahụ Sedana, ọ bụkwa mba Spen nwebu ebe ahụ. Ma n’afọ 1659, mgbe Frans na Spen mere udo, mba Spen hapụụrụ mba Frans otu akụkụ ndagwurugwu ahụ.
Taa, ndị Frans na-aga azụ ahịa na Puiteda, bụ́ obodo a kacha mara amara na ndagwurugwu ahụ. N’afọ 1997, Ndịàmà Jehova bi na Puiteda nabatakwara Ndịàmà Jehova ibe ha bi na Frans ka ha bịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha na-amụ Baịbụl. Ihe kpatara ya bụ na n’afọ ahụ, o nwere ihe merenụ nke mere Ndịàmà Jehova ahụ bi na Frans ga-eji kwapụ n’ebe ha na-anọ amụ Baịbụl, nke bụ́kwanụ ebe ha na-akwụ ụgwọ ya. Ụlọ Nzukọ Alaeze ọzọ kacha ha nso e nwere na Frans dị ha ezigbo anya. Ha ga-eji ụgbọala gbaa otu awa tupu ha eruo ebe ọ dị, ịga ebe ahụ na-esikwa ike n’oge oyi n’ihi na snoo na-ekpuchikarị ebe e si agafe nnukwu ugwu ahụ.
Mgbe Ndịàmà Jehova ahụ bi na Frans kọọrọ Ndịàmà Jehova ibe ha bi na Spen na ha na-achọ ebe ha ga na-anọ amụ Baịbụl, ụmụnna ha bi na Spen gwara ha ozugbo ka ha gafeta n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha. Otu Onyeàmà Jehova bi na Spen, nke aha ya bụ Prem, kwuru, sị: “Ụmụnna niile ahụ bi na Spen chọrọ ka ụmụnna ha bi na Frans bịa na-amụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha. Ọ bụ ihe ndị anyị na-amụta n’Akwụkwọ Nsọ kemgbe ọtụtụ afọ mere anyị ji chọọ inyere ha aka. Mgbe izu ole na ole gara, ha bidoro ịmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị, o ruokwala afọ iri na atọ anyị na ha nọwara.”
Eric bụ otu n’ime ndị na-elekọta ọgbakọ Ndịàmà Jehova ahụ si Frans bịa. Ọ sịrị: “Puiteda bụ ebe kacha mma anyị ga na-aga amụ Baịbụl. M ka na-echeta otú ụmụnna anyị ahụ bi na Spen si nabata anyị n’ụbọchị mbụ anyị bịara. Ha ji okooko osisi chọọ Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ mma, deekwa ‘Ụmụnna anyị nnọọnụ.’”
Eric sịkwara: “Mgbe anyị kwụsịrị ịmụ ihe n’ebe anyị na-anọbu amụ ihe, ndị mmadụ chere na Ndịàmà Jehova anọghịzi n’ebe ahụ. Ma mgbe ha hụrụ na anyị ka na-ekwusa ozi ọma mgbe niile n’ebe ahụ, na-ahụkwa akwụkwọ anyị ji akpọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị dị na Spen, ha chọpụtara na anyị ka nọkwa ya. Ọ na-atọ ndị nwere mmasị n’ozi ọma anyị ụtọ ịbịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ dị na Spen. Ihe ọzọ bụ na ebe ọ bụ na anyị na ụmụnna anyị ndị Spen na-amụ ihe n’otu ebe, anyị na ha adịkwuola ná mma. Mgbe mbụ, anyị ma na e nwere ọgbakọ na-amụ Baịbụl n’asụsụ Spanish n’ebe dị anyị nso, ma anyị na ha amachaghị nke ọma. Ugbu a, anyị na ha na-ahụ mgbe niile, ọ naghịzi adị anyị ka ọ̀ bụ naanị anyị bụ Ndịàmà Jehova nọ na ndagwurugwu a.”
Na ha esighị n’otu mba ò mere ka ihe ghara ịna-adabara ha? Otu nwaanyị Onyeàmà Jehova bụ́ onye Frans nke dị afọ iri asatọ, kwuru, sị: “Mgbe a gwara anyị na anyị ga na-aga ọmụmụ ihe na Spen, ọ dịchaghị m mma n’obi. Ma otú ụmụnna anyị ndị bi na Puiteda si nabata anyị mere ka obi ruo m ala. O medịrị ka o dokwuo m anya na Ndịàmà Jehova n’ụwa niile bụ otu.”
Ihe Kacha Eme Ka Ndị Mmadụ Dịrị n’Udo
Ndị bidoro Òtù Jikọtara Mba Ndị Dị na Yurop kwuru na mba niile so n’òtù ahụ “kpebisiri ike na ha ga-eme ihe ọ bụla ha nwere ike ime ka ndị niile bi na Yurop dịrị n’otu.” N’agbata afọ 1981 na afọ 1999, a gwara mba ndị so n’òtù ahụ ka ha kụtusịa ebe ndị a na-anọ eche nche n’ókè ha na mba ndị ọzọ so n’òtù ahụ. Ma mba ndị ahụ ga-akwụsịrịrị ịkpọ ibe ha asị ma ọ bụrụ na ha chọrọ ibi n’udo.
Ndịàmà Jehova na-eme ihe niile ha nwere ike ime ka ha ghara ịkpọ mmadụ ibe ha asị ma ọ bụ nyowe mmadụ ibe ha enyo. Ha ghọtara na o nwere ọtụtụ uru ha na-erite maka na ụmụnna ha si n’ebe dị iche iche, ghọtakwa na “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu.” (Ọrụ 10:34) N’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha nakwa ná mgbakọ ha nke Ndịàmà Jehova si mba dị iche iche na-abịa, ha ahụla na ‘ọ dị mma, bụrụkwa ihe na-enye obi ụtọ mgbe ụmụnne bikọtara ọnụ n’ịdị n’otu!’ (Abụ Ọma 133:1) Otú Ndịàmà Jehova ahụ bi na Valensa nakwa ndị nke bi na Puiteda na ndị agbata obi ha si dị n’ezigbo mma gosiri na nke a bụ eziokwu.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]
“N’eziokwu, anyị anaghịdị echeta na anyị esighị n’otu mba. Anyị niile ma na anyị bụ ụmụnna”
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]
“Ọrụ ahụ anyị rụkọrọ ọnụ mere ka anyị hụkwuo ibe anyị n’anya”
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 15]
‘Ọ dị mma, bụrụkwa ihe na-enye obi ụtọ mgbe ụmụnne bikọtara ọnụ n’ịdị n’otu!’ ABỤ ỌMA 133:1
[Foto dị na peeji nke 12, 13]
Obodo Tui na Osimiri Min-yo ma a nọrọ n’obodo Valensa do Min-yo lee ya
[Foto dị na peeji nke 14]
Mgbe ha na-arụzigharị Ụlọ Nzukọ Alaeze ha
[Foto dị na peeji nke 15]
Ugwu Piriniiz na ndagwurugwu Sedana
[Foto dị na peeji nke 15]
Mmadụ abụọ n’ime ndị na-elekọta ọgbakọ Ndịàmà Jehova abụọ ndị na-amụ Baịbụl n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Puiteda—otu bụ onye Spen, nke ọzọ bụ onye Frans