Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

À Ga-ebibi Ụwa A?

À Ga-ebibi Ụwa A?

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

À Ga-ebibi Ụwa A?

▪ Ụfọdụ ndị kweere na a ga-ebibi ụwa n’Ọktoba 21, 2011. Ma, e bibighị ụwa mgbe ahụ. Nke a gosiri na amụma Harold Camping, bụ́ onye Amerịka nke na-agbasa ozi na redio, buru emezughị. O buru amụma na Chineke ga-ekpe ụwa ikpe na Mee 21, 2011, nakwa na nnukwu ala ọma jijiji ga-eme n’ụwa niile n’ụbọchị ahụ. O kwukwara na mgbe ọnwa ise gachara, ya bụ, n’Ọktoba 21, a ga-ebibi ụwa a.

Ma, e mekataghị bibie ụwa a. Onye kere ụwa agaghị ekwe ka nke ahụ mee. Okwu ya bụ́ Baịbụl kwuru, sị: “Ị tọsiwo ntọala ụwa ike, ka o wee dịgide.”—Abụ Ọma 119:90.

Ma, ụfọdụ ndị na-agụ Baịbụl nwere ike ikwu na a ga-eji ọkụ bibie ụwa a. Ha na-eji ihe e kwuru na 2 Pita 3:7, 10 na-akwado ihe ha na-ekwu. Ebe ahụ sịrị: “Site n’otu okwu ahụ, eluigwe na ụwa dị ugbu a ka e debeere ọkụ, a na-edebekwa ha ruo ụbọchị ikpe na ụbọchị mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. . . . Ma ụbọchị Jehova ga-abịa dị ka onye ohi, bụ́ mgbe eluigwe ga-eji oké ụzụ gabiga, ma ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa ga-adị oké ọkụ wee gbazee, a ga-ekpughekwa ụwa na ọrụ ndị a rụrụ n’ime ya.” Ihe a Pita onyeozi kwuru ọ̀ pụtara na a ga-ebibi ụwa nkịtị?

Mbanụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe ahụ Pita kwuru kwesịrị ịkwekọ n’ihe ndị ọzọ o kwuru n’akwụkwọ ozi ya nakwa n’ihe ndị ọzọ e kwuru na Baịbụl. Ọ bụrụ na mmadụ aghọta na ihe amaokwu ndị ahụ na-ekwu bụ na a ga-ebibi ụwa nkịtị, ihe ọ pụtara bụ na a ga-eji ọkụ bibiekwa eluigwe na ijeri kwuru ijeri kpakpando niile nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị n’eluigwe naanị n’ihi na e nwere ndị ajọ mmadụ n’ụwa. Cheta na ụwa dị obere ma e jiri ya tụnyere eluigwe na ihe ndị dị na ya. Ị̀ ga-agba otu nnukwu akpa ahụekere ọkụ n’ihi na otu mkpụrụ ahụekere n’ime ya mebiri emebi? O nweghị onye isi dị mma ga-eme ụdị ihe ahụ! Jehova n’onwe ya agaghị ebibi eluigwe na ụwa o kere eke n’ihi na ụfọdụ ndị bi n’ụwa nupụụrụ ya isi.

E wezụga nke ahụ, ichewe na a ga-ebibi ụwa adabaghị n’ihe Jizọs Kraịst kwuru. Ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, n’ihi na ha ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5; Abụ Ọma 37:29) Nna nke hụrụ ndị ezinụlọ ya n’anya ọ̀ ga-arụchara ha ezigbo ụlọ ma mechaa gbaa ya ọkụ? (Abụ Ọma 115:16) Mbanụ! Jehova agakwaghị eme otú ahụ, ọ bụghị naanị na ọ bụ ya kere anyị, ọ bụkwa Nna anyị nke hụrụ anyị n’anya.—Abụ Ọma 103:13; 1 Jọn 4:8.

Ụwa Pita na-ekwu okwu ya ebe ahụ abụghị ụwa nkịtị, ọ bụ ụmụ mmadụ, ya bụ, ndị ajọ omume. N’amaokwu ndị bu ụzọ, ị ga-ahụ na Pita ji ihe ga-eme n’oge anyị a tụnyere ihe mere n’Iju Mmiri nke oge Noa. (2 Pita 3:5, 6) N’oge ahụ, ọ bụ naanị ndị ajọ omume ka e bibiri; e bibighị ụwa, e bibighịkwa Noa na ndị ezinụlọ ya. Otú ahụkwa ka ọ dị “eluigwe” ahụ Pita kwuru okwu ya. Ọ bụghị eluigwe nkịtị. Ihe ọ pụtara bụ ọchịchị ụmụ mmadụ. N’ihi ya, ihe a ga-ebibi bụ ndị ajọ omume na-achọghị ịgbanwe, bibiekwa ọchịchị ọjọọ niile dị n’ụwa. E bibichaa ha, Alaeze Chineke achịwa.—Daniel 2:44.

Ebe ọ dị otú ahụ, Chineke ọ̀ ga-ebibi ụwa a? Mbanụ. Ihe a ga-ebibi bụ ndị ajọ omume. Ụwa na ndị ezi omume ga-ebi na ya n’ọdịnihu ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.—Ilu 2:21, 22.