Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Amagedọn Bụ n’Ezie

Ihe Amagedọn Bụ n’Ezie

Ihe Amagedọn Bụ n’Ezie

“Ndị mmụọ ọjọọ . . . na-agakwuru ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi, . . . ha wee kpọkọta ha n’ebe a na-akpọ Ha-Magedọn n’asụsụ Hibru.” —MKPUGHE 16:14, 16.

AKWỤKWỌ Mkpughe kwuru na e nwere ebe a na-akpọ Amagedọn ma ọ bụ Ha-Magedọn. Ma, gịnị mere o ji abụ e kwute okwu Amagedọn, ihe na-agbatakarị ndị mmadụ n’uche abụrụ agha ma ọ bụ ihe yiri ya? Gịnị ka okwu ahụ bụ́ Amagedọn pụtara n’ezie?

A Kpọkọtara Ha n’Ebe A Na-akpọ Amagedọn

Okwu Hibru bụ́ Ha-Magedọn pụtara “Ugwu Megido.” Ọ bụ eziokwu na e nweghị ugwu aha ya bụ “Ugwu Megido,” ma e nwere ebe a na-akpọ Megido. Megido dị n’otu ebe a ma ama ụzọ wara ngalaba, n’agbata ebe ugwu na ebe ọdịda anyanwụ nke ala Izrel oge ochie. A nọ n’akụkụ ebe ahụ lụọ ọtụtụ agha kpụ ọkụ n’ọnụ n’oge ochie. Ọ bụ ya mere na e kwutehaala okwu Megido, ihe na-agbata ndị mmadụ n’obi bụ agha. *

Ma, ihe anyị kwesịrị icheta ma anyị nụ Megido abụghị agha ndị a lụrụ na ya, kama ọ bụ ihe mere e ji lụọ agha ndị ahụ. Megido so n’ala ahụ Jehova Chineke kwere nkwa inye ụmụ Izrel. (Ọpụpụ 33:1; Jọshụa 12:7, 21) Ọ ṅụụrụ ụmụ Izrel iyi na ọ ga-echebe ha ka ndị iro ha ghara imeri ha, o chebekwara ha. (Diuterọnọmi 6:18, 19) Dị ka ihe atụ, ọ bụ na Megido ka Jehova nọ napụta ụmụ Izrel n’aka ndị agha eze Kenan, bụ́ Jebin, na onyeisi ndị agha ya, bụ́ Sisera, mgbe ha bịara ibuso ụmụ Izrel agha.—Ndị Ikpe 4:14-16.

N’ihi ya, o nwere ihe dị mkpa okwu ahụ bụ́ “Ha-Magedọn,” ma ọ bụ “Amagedọn,” pụtara. Amagedọn bụ agha kpụ ọkụ n’ọnụ nke ìgwè ndị agha abụọ bụcha dike ga-alụ.

Amụma e buru n’akwụkwọ Mkpughe kwuru na n’oge na-adịghị anya, Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ga-eme ka ndị ọchịchị kpọkọta ndị agha ha ka ha lụso ndị Chineke agha. Ọtụtụ nde mmadụ ga-anwụ n’agha ahụ n’ihi na Chineke ga-agbachitere ndị ya ma bibie ndị ahụ bịara ịlụso ndị ya agha.—Mkpughe 19:11-18.

Ma, ebe ọ bụ na Baịbụl kwuru na Chineke bụ ‘onye na-eme ebere, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ na onye obiọma ya dị ukwuu,’ gịnịzi mere ọ ga-eji egbu ọtụtụ mmadụ? (Nehemaya 9:17) Anyị ga-aghọta ihe mere Chineke ga-eji eme otú ahụ ma anyị mata azịza ajụjụ atọ ndị anyị ga-eleba anya na ha ugbu a. Ajụjụ atọ ahụ bụ: (1) Ònye ga-amalite agha ahụ? (2) Gịnị mere Chineke ga-eji agbachitere ndị ya? (3) Olee uru agha ahụ ga-abara ụwa na ndị bi na ya?

1. ÒNYE GA-AMALITE AGHA AHỤ?

Amagedọn abụghị agha Chineke ga-anọkata lụsowa ndị mmadụ. Kama nke ahụ, ihe Chineke ga-eme bụ ịgbachitere ndị ezi omume ka ndị chọrọ ibibi ha ghara ibibi ha. Ndị ga-ebido agha ahụ bụ “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi,” ya bụ, ndị ọchịchị ụwa. Gịnị mere ha ga-eji alụso ndị na-efe Chineke agha? Ọ bụ maka na Setan ga-eme ka ndị ọchịchị na ndị agha ụwa gaa lụso ndị na-efe Jehova Chineke agha kpụ ọkụ n’ọnụ.—Mkpughe 16:13, 14; 19:17, 18.

N’ebe ụfọdụ n’ụwa taa, ndị mmadụ nweere onwe ha ikwu uche ha na ikpe okpukpe ọ bụla dị ha mma. N’ihi ya, mmadụ nwere ike iche na o nweghị ihe ga-eme ka ndị ọchịchị lụsowe okpukpe ọ bụla ọgụ ma ọ bụdị chọwa igbuchapụ ndị na-ekpe okpukpe ahụ. Ma, ụdị ihe ahụ mere n’oge na-adịchabeghị anya, ọ ka na-emekwa ugbu a. * Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, e nwere ụzọ ihe abụọ mere ọgụ ahụ ndị ọchịchị na-alụso okpukpe ji dị iche n’ọgụ ha ga-alụso ndị na-efe Chineke bụ́ nke ga-akpata Amagedọn. Nke mbụ bụ na ọ bụ n’ụwa niile ka a ga-alụso ndị na-efe Chineke ọgụ ahụ. Nke abụọ abụrụ na ihe Jehova Chineke ga-eme mgbe ọ ga-agbachitere ndị ya ga-akarị ihe o metụrụla iji chebe ndị na-efe ya. (Jeremaya 25:32, 33) Baịbụl kpọrọ ọgụ ahụ “agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.”

2. GỊNỊ MERE CHINEKE GA-EJI AGBACHITERE NDỊ YA?

Jehova gwara ndị na-efe ya ka ha na mmadụ ibe ha na-adị n’udo nakwa ka ha hụ ndị iro ha n’anya. (Maịka 4:1-3; Matiu 5:43, 44; 26:52) N’ihi ya, mgbe ndị iro Chineke ga-eji iwe bịa ịlụso ndị na-efe Chineke ọgụ, ndị na-efe Chineke agaghị alụ ọgụ iji chebe onwe ha. Ọ bụrụ na Chineke alụchiteereghị ha ọgụ, a ga-ekpochapụ ha. Ọ bụrụ na ndị iro Jehova ebibie ndị na-efe ya, ọ ga-eme ka ndị mmadụ lelịa Jehova Chineke ma ọ bụ ghara ịsọpụrụ aha ya. Ọ ga-emekwa ka o yie ka Jehova ahụghị ndị na-efe ya n’anya, ka ike adịghị ya ịlụchitere ha ọgụ, ma ọ bụkwanụ ka mmegbu ọ̀ na-adị ya mma. N’eziokwu, Chineke ga-alụchitere ndị na-efe ya ọgụ!—Abụ Ọma 37:28, 29.

Chineke achọghị igbu onye ọ bụla, ọ bụ ya mere o ji agwa ndị mmadụ ihe ọ chọrọ ime. (2 Pita 3:9) Chineke ji Okwu ya, bụ́ Baịbụl, na-eme ka mmadụ niile mata na mgbe ndị iro ya lụsoro ndị na-efe ya ọgụ n’oge ochie, ọ lụchiteere ha ọgụ. (2 Ndị Eze 19:35) Baịbụl gwakwara anyị na mgbe Setan na ndị o ji mere ngwá ọrụ ga-alụso ndị Chineke ọgụ n’ọdịnihu, Jehova ga-alụchitere ndị ya ọgụ. N’eziokwu, ọ dịla anya Baịbụl kwuru na Jehova ga-ebibi ndị ajọ omume. (Ilu 2:21, 22; 2 Ndị Tesalonaịka 1:6-9) Ọ bụ mgbe ahụ Jehova ga-alụchitere ndị ya ọgụ ka ndị ahụ na-alụso ndị na-efe Jehova ọgụ ga-aghọta na ọ bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ka ha na-alụso ọgụ.—Ezikiel 38:21-23.

3. OLEE URU AGHA AHỤ GA-ABA?

Agha Amagedọn ga-eme ka a zọpụta ọtụtụ nde mmadụ. N’eziokwu, a lụchaa agha Amagedọn, a ga-enwezi udo n’ụwa.—Mkpughe 21:3, 4.

Akwụkwọ Mkpughe kwuru na a ga-enwe “oké ìgwè mmadụ,” ndị a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, bụ́ ndị agha ahụ na-agaghị egbu. (Mkpughe 7:9, 14) Chineke ga-agwa oké ìgwè mmadụ ahụ ihe ndị ha ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs otú Jehova chọrọ ka ọ dị mgbe o kere ụwa.

Ànyị maara mgbe ndị iro Chineke ga-alụso ndị na-efe Chineke ọgụ?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 E nwekwara ebe ndị ọzọ ọ na-abụ a kpọọ aha ha, ihe na-agbatakarị ndị mmadụ n’obi abụrụ agha. Dị ka ihe atụ, e ji ngwá agha ọgwụrụ mba bibie obodo Hiroshima nke dị na Japan. N’ihi ya, ihe ndị mmadụ na-echetakarị ma ha nụ Hiroshima bụ agha a ga-eji ngwá agha ọgwụrụ mba lụọ.

^ par. 12 Ụdị ihe a mere n’oge Agha Ụwa nke Abụọ mgbe ndị ọchịchị Nazi chọrọ igbuchapụ ndị Juu na ndị okpukpe ụfọdụ. Nke a gosiri na ndị ọchịchị nwere ike ịnọkọta chọọ ikpochapụ ndị mmadụ ma ọ bụ okpukpe. N’agbata afọ 1917 na 1991, ndị ọchịchị Sọviet Yuniọn ekwetụdịghị ka ụfọdụ ndị kpee okpukpe ha otú ha chọrọ. Gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Na-achọghị Nsogbu Agbachitere Aha Ọma Ha,” n’Ụlọ Nche Mee 1, 2011. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Foto dị na peeji nke 6]

N’oge ochie, Jehova Chineke lụchiteere ndị na-efe ya ọgụ ma bibie ndị iro ha

[Foto dị na peeji nke 7]

N’agha Amagedọn, Jehova ga-alụchitere ndị ya ọgụ ọzọ