Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Gịnị bụ ebe ịchụàjà ahụ Pọl onyeozi hụrụ n’Atens nke ihe e dere n’elu ya bụ “Nye Chi A Na-amaghị Ama”?—Ọrụ 17:23.

Ọtụtụ ndị Gris bụ́ ndị dere akwụkwọ n’oge ochie dere banyere ebe ịchụàjà ndị dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, otu ọkọ akụkọ ihe mere eme nke aha ya bụ Pausanias, onye dịrị ndụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ asatọ gara aga, kwuru na n’Olimpịa, bụ́ ebe a nọ mee egwuregwu Olimpik mbụ, e nwere “ebe ịchụàjà bụ́ maka chi dị iche iche A Na-amaghị Ama.” Otu ọkà okwu na ọkachamara aha ya bụ Philostratus kwuru na e nwere “ebe ịchụàjà ndị e wuuru chi dị iche iche a na-amaghị ama” n’Atens.

Otu onye na-ede akwụkwọ n’oge ochie, nke aha ya bụ Diogenes Laertius, bụ́ onye dịrị ndụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ asaa gara aga, dere banyere otú e si malite inwe “ebe ịchụàjà ndị e wuuru chi ndị a na-amaghị aha ha.” Akụkọ ahụ o dere, bụ́ nke a sịrị na o mere n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ ise gara aga ma ọ bụ puku afọ abụọ na narị afọ isii gara aga, kọrọ otú otu onye aha ya bụ Epimenides si mee ka ọrịa nọ na-arịa ndị Atens kwụsị ịrịa ha. Diogenes dere, sị: “[Epimenides] kpụụrụ atụrụ . . . kpụga n’obodo Ariopagọs; ma hapụ atụrụ ndị ahụ ka ha gawa ebe dị ha mma, gwakwa ndị na-eso atụrụ ndị ahụ ka ha kaa akara n’ebe ọ bụla atụrụ nke ọ bụla ruru makpuru ma chụọrọ chi obodo e nwere n’ebe ahụ àjà. E kwuru na ọ bụ otú ahụ ka ọrịa ahụ si kwụsị. Ọ bụ ya mere e ji nwee ebe ịchụàjà ndị a na-edeghị aha chi ndị e wuuru ha n’ebe dị iche iche n’obodo Atika taa.”

Otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru ihe ọzọ mere e ji wuoro chi ndị a na-amaghị aha ha ebe ịchụàjà. Akwụkwọ ahụ sịrị na “ụjọ nọ na-atụ ha maka na e nwere ike inwe chi nwoke ma ọ bụ chi nwaanyị ha na-amaghị bụ́ nke ha na-anaghị akwanyere ùgwù. Ha chere na nke a nwere ike ime ka chi ahụ na-eweso ha iwe ma ọ bụ ghara imere ha ihe ọma.”

Gịnị mere ndị Juu oge ochie ji kpọọ ndị ọnaụtụ asị?

Kemgbe ụwa, ndị mmadụ na-ele ndị ọnaụtụ anya ọjọọ. Ma, ná mba Izrel oge ochie, e weere ndị ọnaụtụ ka ndị kacha erigbu ndị mmadụ na ndị a kacha asọ oyi n’obodo.

Ndị Rom, bụ́ ndị na-achị n’oge ahụ, na-ana ndị mmadụ ego ụtụ isi buru ibu. Ndị ọchịchị Rom na-eji aka ha ana ndị mmadụ ụtụ ala nakwa ụtụ isi. Ma, ọ bụ onye kwetara iwetara ndị ọchịchị Rom ego kacha buo ibu ka ha na-agwa ka ọ na-ana ndị mmadụ ụtụ ahịa, dị ka nke a na-ana onye tụbatara ngwá ahịa na onye bu ngwá ahịa gaa mba ọzọ, nakwa onye si mba ọzọ buru ngwá ahịa na-agafe ka ọ gaa ree ya ná mba ọzọ. N’ihi ya, ọ na-abụ ndị ọchụ nta ego kwụọ ndị Rom ụgwọ, e nye ha ikike ịnakọta ụtụ n’ebe ụfọdụ. Otu akwụkwọ kwuru na ebe ọ bụ na ndị Rom ji ndị ọnaụtụ a mere ngwá ọrụ, ndị Juu ibe ha kpọrọ ha asị ma were ha ka “ndị na-agba ndị Juu ibe ha mgba okpuru na ndị hapụrụ ife Chineke, nakwa ndị rụrụ arụ n’ihi otú ha na ndị na-anaghị efe Chineke si emekọ ihe mgbe niile.”

Ndị ọnaụtụ anaghị akwụwa aka ọtọ, ha na-eji ego ha na-anata ndị Juu ibe ha afọju akpa ha. Ụfọdụ n’ime ha na-ana ndị nwe ngwá ahịa ego karịrị ego ole ha kwesịrị ịkwụ ma were ego mara ya n’elu, ebe ndị ọzọ na-ebo ndị ogbenye ebubo ụgha ma si otú ahụ nata ha ego. (Luk 3:13; 19:8) Ọ bụ ya mere akwụkwọ bụ́ The Jewish Encyclopedia ji kwuo na e weere ndị ọnaụtụ otú e si were ndị mmehie, werekwa ha “ka ndị na-erughị eru ịbụ ndị ọkàikpe ma ọ bụ ndị na-erughị eru ịgba akaebe.”—Matiu 9:10, 11.

[Foto dị na peeji nke 18]

Ebe ịchụàjà e wuuru chi a na-amaghị ama n’obodo Pegamum dakpọrọla adakpọ, nke dị ná mba Tọki

[Foto dị na peeji nke 18]

Onye ọnaụtụ ndị Rom kpụrụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ asatọ gara aga

[Ebe E Si Nweta Foto]

Erich Lessing/Art Resource, NY