Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchọ Akụ̀ Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Ọmarịcha Ugwu Ndị Dị n’Obodo Altaị

Ịchọ Akụ̀ Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Ọmarịcha Ugwu Ndị Dị n’Obodo Altaị

Akwụkwọ Ozi Si Rọshịa

Ịchọ Akụ̀ Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Ọmarịcha Ugwu Ndị Dị n’Obodo Altaị

ALTAỊ bụ obodo mara ezigbo mma nke dị na ndịda ebe ọdịda anyanwụ Saịberịa. N’ụbọchị anyị gara ebe ahụ n’ọnwa Mee, obi dị anyị ezigbo ụtọ. Anyị si na windo ụgbọala anyị lepụ anya ma hụ oké ọhịa ndị nnukwu osisi juru, hụkwa ugwu ndị dị n’azụ oké ọhịa ndị ahụ. Snoo kpuchiri ugwu ndị ahụ. Ọ bụ n’obodo a bụ́ ugwu ugwu ka ndị Altaị bi, ha nwekwara asụsụ nke ha.

Afọ ole na ole gara aga, mụ na nwunye m mụrụ asụsụ ndị ogbi nke Rọshịa ma malite ịga na-eleta ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova bụ́ ndị na-amụ ihe n’asụsụ ndị ogbi nakwa ìgwè Ndịàmà Jehova dị iche iche bụ́ ndị ogbi. Ná mba Rọshịa, e nwere ihe karịrị otu narị agbụrụ na iri asaa bụ́ ndị na-asụ otu asụsụ a na-akpọ Rọshịan. Ma, ndị ogbi nwere asụsụ nke ha, ya bụ, asụsụ ndị ogbi nke Rọshịa. Ndị ogbi a hụrụ ibe ha n’anya. Ọtụtụ n’ime ha anyị hụrụ na-eji obi ụtọ akọrọ anyị ọtụtụ ihe banyere onwe ha, ha na-elekwa anyị ọbịa nke ọma. Otú a ka ndị nke anyị hụrụ n’obodo Altaị mekwara.

Anyị nọ n’obodo Gọno-Alteyisk nụ na e nwere ụfọdụ ndị ogbi bi n’obere obodo dị narị kilomita abụọ na iri ise ma e si na Gọno-Alteyisk gawa ya. Anyị ma na e nwere Ndịàmà Jehova ole na ole n’ebe ahụ, ma o nweghị onye n’ime ha ma asụsụ ndị ogbi. Anyị meteere ndị ogbi bi n’obodo Altaị ebere, n’ihi ya, anyị kpebiri ịga hụ ha. Mgbe otu dị na nwunye bụ́ ndị ogbi hụrụ na ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịga nyere ndị Altaị aka, ha kwuru na ha ga-eso anyị gaa. Aha di na nwunye a bụ Yury na Tatyana. Anyị kwanyere ụfọdụ diiviidi Ndịàmà Jehova mepụtara maka ndị ogbi n’ụgbọala, kwanyekwa ihe e ji akpọ ya. Anyị tinyekwara nnukwu flaskị na-ajụ ihe oyi, achịcha, poteto, na keki, na ihe ndị ọzọ anyị ga-eri. Tupu anyị agawa, anyị gbara ọgwụ àkpịrị́ n’ahụ́ na n’uwe anyị nakwa n’akpụkpọ ụkwụ anyị n’ihi na àkpịrị́ juru ebe ahụ. Àkpịrị́ dị ebe ahụ na-atanye mmadụ ọrịa ọjọọ n’ahụ́.

Ka anyị na-aga, anyị gbafere ugwu dị iche iche mara mma. Ebe niile na-esi ísì ọma n’ihi osisi ndị na-esi ísì ọma juru ebe ahụ. Nke a mere anyị obi ụtọ! Obi tọrọ anyị ụtọ mgbe anyị hụrụ ìgwè atụ́ ndị Saịberịa ka ha ji nwayọọ nwayọọ na-ata ahịhịa n’akụkụ ugwu ahụ. Anyị hụkwara ụlọ ndị Altaị. Ha na-eji osisi arụ ụlọ. Ha rụchaa ya, ha akụọ ya gbamgbam mara mma. Ha nwekwara ụdị ụlọ ọzọ ha na-eji osisi arụ. Ihe ha na-akpọ ya bụ ayil. Ụlọ ahụ na-adị okirikiri. Gbamgbam ha na-akụ n’elu ya na-adịkwa okirikiri, pịakwa ọnụ ka okoso. Malite n’ọnwa Mee ruo Septemba, ọtụtụ ndị Altaị na-ebi n’ụlọ ahụ ha na-akpọ ayil, ma ha na-akwafe n’ụlọ ha nke ọzọ n’oge oyi.

Ndịàmà Jehova bi n’obodo ahụ ji obi ụtọ nabata anyị ma duru anyị gaa n’ụlọ otu di na nwunye dara ogbi bụ́ ndị Altaị. Obi dị ha ụtọ mgbe ha hụrụ anyị, ha chọkwara ịma ebe anyị si na ihe mere anyị ji bịa. Ebe di na nwunye ahụ nwere kọmputa n’ụlọ ha, anyị wepụtara otu diiviidi gosi ha, ha ekwuo na ha ga-eleriri ya. Mgbe ha bidoro ile ya, ha ekweghịzi akpanyere anyị ụka, ya eyizie ka hà amaghị na anyị nọ ebe ahụ. Naanị ebe anya ha dị bụ n’ihe ahụ ha na-ele. Mgbe ụfọdụ, ha hụ ihe tọrọ ha ụtọ, ha ekwee n’isi ma gbalịa iji aka ha kwughachi ya. Anyị jisiri ike mee ka ha kwụsịtụ gee anyị ntị ka anyị nwee ike gaghachi n’ebe mbido diiviidi ahụ bụ́ ebe gosiri otú ụwa ga-adị mgbe a ga-eme ka ọ ghọọ paradaịs. Anyị kwụsịtụrụ n’otu ebe na diiviidi ahụ ma kọwaara ha ihe Chineke ga-emere ndị mmadụ n’ọdịnihu nakwa ụdị ndị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ahụ. Otú ha si gee anyị ntị mere anyị obi ụtọ. Mgbe anyị na ha nọchara, ha gwara anyị na e nwere di na nwunye ọzọ dara ogbi bụ́ ndị bi n’otu obere obodo ga-ewe awa ole na ole iji ruo ya.

Anyị tinyeziri isi n’ụzọ mara mma e si aga n’obere obodo ahụ. Ụzọ ahụ si n’etiti ugwu gafee, ọ dịkwa rịgọrịgọ. Anyị hụrụ nwoke ahụ na nwunye ya na nwa ha nwoke na nne nwunye ya. Obi tọrọ ha ụtọ na anyị bịara na nke ha. Mgbe anyị batara n’ụlọ ahụ a na-akpọ ayil, anyị nụrụ ísì ọma na-esi n’ụlọ ahụ, ya bụ, ísì osisi e ji rụọ ụlọ ahụ na ísì mmiri ara ehi. Elu ụlọ ahụ dị okirikiri, pịakwa ọnụ ka okoso, ma o nwere oghere dị n’elu ya nke ìhè na-esi abata n’ụlọ ahụ. Ekwú ha dị n’otu akụkụ ụlọ ahụ, e ji brik rụọ ya ma tee ya nzụ. Ha jikwa ihe dị ka kapet na-acha ọbara ọbara sachie ahụ́ ime ụlọ ahụ. Di na nwunye ahụ nyere anyị nri ndị Altaị, ya bụ, kpọf kpọf na tii ha gbanyere n’obere efere ndị Eshia. Anyị jụrụ ha ma hà echetụla echiche ma hà nwere ike ịbụ ndị enyi Chineke. Ha chebaara ajụjụ a anyị jụrụ ha echiche. Nne nwunye nwoke ahụ gwaziri anyị na mgbe ọ bụ nwata, o nwere mgbe o bu nri gaa n’ugwu chụọrọ chi ha àjà. Ọ kpọrọ n’ubu ma mụmụọ ọnụ ọchị, sị: “Amaghị m ihe mere e ji eme ihe ahụ. Ma, ọ bụ omenala anyị.”

Anyị gosiri ha otu diiviidi kwuru banyere nke ahụ, obi atọọ ha ụtọ. Ha chọrọ ka anyị na ha na-amụ Baịbụl, ma oleekwanụ otú anyị na ha ga-esi mụwa ya? Ọ bụ eziokwu na ọ na-adị mfe iji ekwe ntị ezigara ndị ogbi ozi, ma e nweghịdị otu mkpụrụ poolu e ji enweta ozi n’ekwe ntị n’ebe ahụ. N’ihi ya, anyị kwere ha nkwa na anyị ga na-edetara ha akwụkwọ ozi.

Anyanwụ adawala mgbe anyị hapụrụ ndị enyi ọhụrụ anyị a ma laghachiwa Gọno-Alteyisk. Ọ bụ eziokwu na ike gwụchara anyị, obi dị anyị ụtọ. Mgbe obere oge gafere, anyị jụrụ Ndịàmà Jehova bi n’ebe ahụ banyere ezinụlọ ahụ, ha agwa anyị na otu ugboro n’ime izu abụọ ọ bụla, nwoke ahụ na-aga amụ Baịbụl n’otu obodo mepetụrụ emepe, gaakwa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova n’ebe ahụ. Ọ bụ nwanna nwaanyị nọ n’ebe ahụ, nke ma asụsụ ndị ogbi, na-enyere ya aka. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na mgbalị anyị efughị ọhịa.

E nwere ike iji mgbalị anyị na-eme ịchọta ndị ogbi chọrọ ịmụ Baịbụl tụnyere mgbalị a na-eme ịchọta akụ̀ zoro ezo n’ugwu. Mgbe anyị chọgidere akụ̀ a ma mechaa chọta ya n’ebe anyị na-atụghị anya ya, obi na-atọ anyị ụtọ. N’eziokwu, anyị agaghị echefu ọmarịcha ugwu ndị dị n’obodo Altaị echefu n’ihi na ọ na-echetara anyị ndị chọrọ ịmụ Baịbụl bụ́ ndị anyị hụrụ n’ebe ahụ.