Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ọ Rapaara Jehova n’Ahụ́’

‘Ọ Rapaara Jehova n’Ahụ́’

Kụziere Ụmụ Gị ihe

‘Ọ Rapaara Jehova n’Ahụ́’

MMADỤ ọ̀ gwatụla gị ka ị nyapawa foto n’akwụkwọ? * Ọ bụrụ na gọm i ji nyapawa foto ahụ dị mma, foto ahụ ga-arapara nke ọma n’akwụkwọ ahụ. Okwu ahụ bụ́ ‘ịrapara Jehova n’ahụ́’ pụtara ịnọ Jehova nso na irubere ya isi mgbe niile. Anyị chọrọ ịkọrọ gị maka otu onye Baịbụl kwuru na ọ ‘rapaara Jehova, bụ́ ezi Chineke, n’ahụ́.’ Aha onye ahụ bụ Hezekaya. Ka anyị hụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ya.

Obi anaghị atọ Hezekaya ụtọ mgbe ọ bụ nwata n’ihi na nna ya Ehaz, bụ́ eze Juda, kwụsịrị ife Jehova. Ehaz malitere ife arụsị mgbe Hezekaya ka bụ nwata. Ehaz gburu otu nwa ya ma ọ bụ ụmụ ya ụfọdụ ma jiri ha chụọrọ chi ọ na-efe àjà. Ụmụ ya ahụ o gburu bụ ụmụnne Hezekaya.

Hezekaya akwụsịghị irubere Jehova isi n’agbanyeghị na nna ya Ehaz nọ na-eme ihe ọjọọ. Ì chere na ọ dịịrị ya mfe irubere Jehova isi?— Mba. Hezekaya akwụsịghị irubere Jehova isi! Ka anyị chọpụta ihe nyeere ya aka ịrapara Jehova n’ahụ́ nakwa otú anyị nwere ike isi mee ka ya.

Hezekaya mụtara banyere ndị ọzọ bụ́ ndị rapaara Jehova n’ahụ́. Devid bụ otu n’ime ha. Ọ bụ eziokwu na Devid dịrị ndụ ọtụtụ narị afọ tupu a mụọ Hezekaya, Hezekaya mụtara banyere Devid n’Akwụkwọ Nsọ. Devid dere, sị: “Ọ bụrụ na nna m na nne m ahapụ m, Jehova ga-akpọrọ m.”

Ị̀ hụrụ ihe nyeere Devid aka irubere Jehova isi?— Ọ bụ okwukwe ya. Devid maara na ọ bụrụ na ya erubere Jehova isi, Jehova ga-enyere ya aka. Obi siri ya ike na Jehova ga-enyere ya aka. O doro anya na ihe nyeere Hezekaya aka ịrapara Jehova n’ahụ́ ma ọ bụ irubere ya isi bụ na o chebaara otú Devid si fee Chineke echiche. Obi kwesịkwara isi gị ike na Jehova ga-enyere gị aka ma ọ bụrụ na ị rapara ya n’ahụ́ ma na-erubere ya isi.

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na papa gị ma ọ bụ mama gị anaghị efe Jehova?— Chineke kwuru na ụmụaka kwesịrị irubere papa ha na mama ha isi. N’ihi ya, i kwesịrị irubere papa gị na mama gị isi. Ma, ọ bụrụ na papa gị ma ọ bụ mama gị agwa gị mee ihe Chineke sịrị gị emela, gwa ha na ị gaghị eme ya, gwakwa ha ihe mere na ị gaghị eme ya. I kwesịghị ịgha ụgha, izu ohi, ma ọ bụ ime ihe ọ bụla ọzọ Chineke kwuru na ọ dịghị mma, n’agbanyeghị onye gwara gị mee ihe ahụ. I kwesịrị irubere Chineke isi.

E nwere ọtụtụ ndị rubeere Chineke isi bụ́ ndị anyị nwere ike ịmụta ihe ọma n’aka ha. Ọ bụghị naanị n’aka Devid ka Hezekaya si mụta ihe ọma, ọ mụtakwara ihe ọma n’aka nna nna ya bụ́ Jotam. Ọ bụ ezie na Jotam nwụrụ tupu a mụọ Hezekaya, ọ ga-abụ na Hezekaya si na Baịbụl mụta banyere Jotam otú ahụ anyị nwekwara ike isi na Baịbụl mụta banyere ya taa. Ò nwere ndị ọzọ ị ma anyị nwere ike ịmụta ihe ọma n’aka ha?

N’eziokwu, i nwere ike isi na Baịbụl mụta na e nwere mgbe Hezekaya, Devid, Jotam, na ndị ọzọ mere ihe na-adịghị mma n’ihi na ha ezughị okè. Ma ha hụrụ Jehova n’anya, kwetakwa na ihe ha mere adịghị mma ma gbalịa ime ihe ziri ezi. Cheta na ọ bụ naanị Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs, bụ mmadụ zuru okè mgbe ọ nọ n’ụwa. Anyị kwesịrị ịmụta banyere ya ma gbalịa ịna-eme ka ya.

Gụọ ebe ndị a na Baịbụl gị

2 Ndị Eze 18:6; 2 Ihe E Mere 28:1-3

Abụ Ọma 27:10; Ndị Efesọs 6:1; Ndị Kọlọsi 3:20

2 Ihe E Mere 27:1, 2; 1 Pita 2:21

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.