Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Emewo M Ka Ha Mara Aha Gị’

‘Emewo M Ka Ha Mara Aha Gị’

‘Emewo M Ka Ha Mara Aha Gị’

“Emewo m ka aha gị pụta ìhè nye ndị i si n’ụwa nye m. . . . Emewokwa m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka a mara ya.”—JỌN 17:6, 26.

Gịnị Ka Ihe A Jizọs Kwuru Pụtara? Jizọs mere ka ndị mmadụ mara aha Chineke mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma. Ọ ga-abụ na Jizọs kpọrọ aha Chineke n’oge ndị ọ na-agụpụta ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ. (Luk 4:16-21) N’ekpere ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya, ọ gwara ha ka ha na-arịọ Chineke, sị: “Nna, ka e doo aha gị nsọ.”—Luk 11:2.

Ndị Kraịst Oge Mbụ Hà Mere Ihe ahụ Jizọs Mere? Pita onyeozi gwara ndị okenye nọ na Jeruselem na Chineke si n’etiti ndị mba ọzọ “wepụtara aha ya otu ndị.” (Ọrụ 15:14) Ndịozi Jizọs na ndị ọzọ gwara ndị mmadụ mgbe ha na-ekwusa ozi ọma na ọ bụ “onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.” (Ọrụ 2:21; Ndị Rom 10:13) Ha dekwara aha Chineke n’akwụkwọ Baịbụl ndị ha dere. Otu akwụkwọ iwu ndị Juu, nke e dechara n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ asaa gara aga, kọrọ otú ndị na-emegide Ndị Kraịst si kpọọ akwụkwọ Ndị Kraịst oge ochie dere ọkụ. Akwụkwọ ahụ sịrị: ‘Ha anaghị ewepụta akwụkwọ Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma dere na akwụkwọ ndị e chere na ha bụ nke Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu ka ọkụ ghara ịgba ha. Kama, ha na-ahapụ ha ka ọkụ gbaa ha n’ebe ha dị, gbaakwa Aha Chineke e dere na ha.’

N’oge Anyị A, Ole Ndị Na-eme Ihe ahụ Jizọs Mere? Ihe e dere ná mmalite Baịbụl bụ́ Revised Standard Version sịrị: “Ebe ọ bụ na e nwere naanị otu Chineke, ịkpọ aha ya ga-eme ka o yie ka à ga-asị na e nwere chi ndị ọzọ a chọrọ igosi na ha na Chineke abụghị otu. N’ihi ya, ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu kwụsịrị ịkpọ aha Chineke tupu oge Ndị Kraịst, Chọọchị Ndị Kraịst niile e nwere n’ụwa ekwesịghịkwa ịkpọ aha ahụ.” Ọ bụ ya mere e ji were okwu bụ́ “ONYENWE ANYỊ” dochie aha Chineke na Baịbụl ahụ. N’oge na-adịchabeghị anya, ndị isi chọọchị Katọlik si na Vatịkan gwa ndị bishọp Katọlik, sị: “E kwesịghị ịna-akpọ tetragramatọn ahụ, ya bụ, YHWH * nke bụ́ aha Chineke, mgbe a na-abụ abụ ma ọ bụ mgbe a na-ekpe ekpere.”

Ole ndị taa na-akpọ aha Chineke ma na-akụziri ya ndị ọzọ? E nwere otu nwoke aha ya bụ Sergey bụ́ onye Kegịstan. Mgbe ọ dị afọ iri na ise, o lere otu fim nke kwuru na aha Chineke bụ Jehova. Ọ nụghịzi aha ahụ ọzọ ruo ihe dị ka afọ iri. Sergey mechara kwaga Amerịka. Otu ụbọchị, Ndịàmà Jehova abụọ bịara n’ụlọ ya ma gosi ya aha Chineke na Baịbụl. Obi tọrọ Sergey ụtọ na e nwere ndị na-akpọ aha ahụ bụ́ Jehova ma na-akụziri ya ndị ọzọ. Ọ dị mma ịmara ihe akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ Webster’s Third New International Dictionary kwuru mgbe ọ na-akọwa aha ahụ bụ́ “Jehova Chineke.” O kwuru na “ọ bụ chi Ndịàmà Jehova weere ka chi kachanụ, bụrụkwa naanị chi ha na-efe.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Otú e si asụgharịkarị aha Chineke n’asụsụ Igbo bụ “Jehova.”