Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka I Chere Jizọs Bụ?

Gịnị Ka I Chere Jizọs Bụ?

Gịnị Ka I Chere Jizọs Bụ?

Ì chere na Jizọs bụ nwa ọhụrụ, nwoke nọ n’ọnụ ọnwụ, ka ọ̀ bụ Eze e buliri elu?

Baịbụl mere ka anyị mata na Jizọs bụ Eze dị ike. Ma olee otú nke a si gbasa gị?

Ọtụtụ ndị kwetara na Jizọs nwụrụ n’ihi ha. Ma, olee otú ọnwụ otu nwoke nwụrụ n’ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga ga-esi mee ka ndị ọzọ dị ndụ taa?

Anyị ji obi ụtọ akpọ gị ka ị bịa nụrụ otú a ga-esi jiri Baịbụl zaa ajụjụ ndị ahụ. A ga-aza ajụjụ ndị ahụ mgbe Ndịàmà Jehova ga-ezukọ icheta ọnwụ Jizọs. N’afọ a, ncheta ọnwụ Jizọs ga-abụ na Tọzdee, Eprel 5, mgbe anyanwụ dachara.

Biko, jụọ Ndịàmà Jehova bi gị nso ebe a ga-eme ya na oge ọ ga-abụ.

N’izu na-eso izu a ga-echeta ọnwụ Jizọs, Ndịàmà Jehova ga-atụle isiokwu si na Baịbụl nke ga-abara onye ọ bụla uru. Isiokwu ahụ bụ, “Ọgwụgwụ Ọ̀ Dịla Nso Karịa Otú I Chere?” Okwu ahụ ga-eso ná mbọ a na-agba n’ụwa niile iji mee ka ndị niile hụrụ eziokwu n’anya matakwuo Jizọs. Anyị na-akpọ gị ka ị bịa.