Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Aztek nke Oge A Aghọọ Ezigbo Ndị Kraịst

Ndị Aztek nke Oge A Aghọọ Ezigbo Ndị Kraịst

Ndị Aztek nke Oge A Aghọọ Ezigbo Ndị Kraịst

“A gbara ụlọ arụsị ha niile ọkụ, bibie arụsị ha, gbaakwa akwụkwọ niile ha ji ekpere arụsị ọkụ. Ma, ha akwụsịbeghị ife chi dị iche iche ndị obodo ha fere n’oge ochie.”—Akwụkwọ bụ́ Las antiguas culturas mexicanas (Omenala Ndị Meksiko Oge Ochie).

MEKSIKO bụ obodo ndị Aztek. Ha si ebe ọzọ bịa biri na Meksiko n’ihe dị ka narị afọ asatọ gara aga. Ma, obodo ha mechara ghọọ nnukwu obodo nke kpara ike ka ndị Inka, bụ́ ndị bi n’obodo Peru. Ọ bụ eziokwu na ọchịchị ndị Aztek kwụsịrị mgbe Hernán Cortés, bụ́ onye Spen, meriri isi obodo ndị Aztek, bụ́ Tenọchtitlan, n’afọ 1521, a ka na-asụ asụsụ ndị Aztek bụ́ Nawatụl. * Ihe dị ka otu nde ndị Aztek na narị puku ise, bụ́ ndị bi n’ihe dị ka steeti iri na ise na Meksiko, ka na-asụ asụsụ ahụ. Dị ka onye na-eme nnyocha aha ya bụ Walter Krickeberg kwuru n’elu, asụsụ a so n’ihe mere ndị Aztek ka ji na-eme omenala ụfọdụ ndị nna nna ha mere n’oge ochie. Gịnị bụ ụfọdụ omenala ndị ahụ?

Omenala Ha Yichara Ihe A Na-eme na Chọọchị

O nwere ike ịbụ na omenala ndị Aztek ndị mmadụ kacha mara bụ na ha na-eji mmadụ achụ àjà. Ihe mere ha ji eme omenala ahụ bụ na ha kweere na anyanwụ ga-akwụsị ịcha ma ọ bụrụ na ha ejighị obi mmadụ na ọbara mmadụ chụọrọ anyanwụ àjà. Onye Spen aha ya bụ Diego Durán, bụ́ ụkọchukwu ndị Katọlik, kwuru na n’afọ 1487, ndị Aztek ji ihe karịrị puku mmadụ iri asatọ chụọ àjà n’ime mkpụrụ ụbọchị anọ n’oge ha na-enyefe chi ha nnukwu ụlọ arụsị ha rụrụ n’obodo Tenọchtitlan.

Ọ bụ eziokwu na omenala a wụrụ ndị Spen akpata oyi n’ahụ́, o juru ha anya na ọtụtụ omenala ndị Aztek yiri ihe hanwa bụ́ ndị chọọchị Katọlik na-eme. Dị ka ihe atụ, ndị Aztek na-eri oriri nsọ. Ha na-eji ọka kpụọ ihe yiri chi ha ma rie ya ma ha riwe oriri nsọ ha. Mgbe ụfọdụ, ha na-erikwa anụ ndị mmadụ ha ji chụọ àjà. Ndị Aztek na-eji obe efe chi ha, ha na-ekwupụta mmehie, na-emekwa ụmụ ọhụrụ baptizim. Ọ ga-abụ na otu ihe kacha ju ndị Spen anya n’ihe ndị Aztek na-eme, bụ́ nke yiri ihe hanwa na-eme, bụ na ndị Aztek na-efe chi bụ́ Tonantzin. Chi a bụ chi na-amaghị nwoke nke ha na-akpọ “Nne nke Chi Niile,” ha na-akpọkwa ya Obere Nne Anyị iji gosi otú ha hụruru ya n’anya.

Ọ bụ n’ugwu ebe ndị Aztek na-efe chi ahụ bụ́ Tonantzin ka a sịrị na Meri Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke nke Guadalup pụtara n’ihu otu nwoke onye Aztek n’afọ 1531. Ọ dị oji mgbe ọ pụtara n’ihu nwoke Aztek ahụ, ọ gwakwara nwoke ahụ okwu n’asụsụ Nawatụl. Nke a mere ka ndị Aztek kpewe okpukpe Katọlik n’egbughị oge. E wuuru nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ụlọ n’ebe ụlọ arụsị chi ahụ bụ́ Tonantzin dịbu. Ọtụtụ narị puku ndị Meksiko na-aga chọọchị Katọlik dị n’ebe ahụ n’abalị iri na abụọ n’ọnwa Disemba ọ bụla. Ọtụtụ n’ime ndị ahụ na-aga ebe ahụ na-asụ asụsụ Nawatụl.

Ọtụtụ ndị Nawatụl bi n’ime ime obodo ndị dị n’ugwu. Ha na-emere ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị ha chere na-enyere ha aka ọtụtụ ememme. Ụfọdụ ememme ahụ na-ewe ọtụtụ ụbọchị ma ọ bụkwanụ ọtụtụ izu. Otu akwụkwọ kwuru na ndị Aztek “weere na ofufe ndị Katọlik na-efe ndị nsọ na ememme ndị Aztek na-eme tupu Hernán Cortés emerie ndị Aztek bụ otu ihe.” Ndị Nawatụl na-eme mgbaasị nke ukwuu. Ọ na-abụ ha rịawa ọrịa, ha agakwuru ndị dibịa afa bụ́ ndị na-eji anụmanụ achụrụ ha àjà ka ha gbakee. Ihe ọzọ bụ na ọtụtụ n’ime ha amaghị akwụkwọ, ọtụtụ amaghịkwa agụ asụsụ Spanish ma ọ bụ asụsụ Nawatụl. Ndị mmadụ enweghị ihe ha ji ndị Aztek kpọrọ. Ihe kpatara ya bụ na ha dara ogbenye, ha achọghịkwa ịmụ asụsụ ọzọ na ịhapụ omenala ha.

Ndị Aztek Amụta Eziokwu Baịbụl

Kemgbe ọtụtụ afọ, Ndịàmà Jehova bi na Meksiko agbaala mbọ ikwusara mmadụ niile bi na Meksiko ‘ozi ọma nke alaeze.’ (Matiu 24:14) N’afọ 2000, ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Meksiko mere ndokwa ka a malite ikwusara ndị Nawatụl niile ozi ọma n’asụsụ ha, meekwa ndokwa ka ndị Nawatụl, bụ́ ndị na-aga ọmụmụ ihe n’ebe Ndịàmà Jehova na-amụ ihe n’asụsụ Spanish, bidozie ịga ọmụmụ ihe n’ebe ha na-amụ ihe n’asụsụ Nawatụl. A họpụtara ndị ga na-asụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ Nawatụl. E mekwara ndokwa ka a malite ịkụziri ndị Nawatụl otú e si agụ na otú e si ede asụsụ ha. Gịnị merela kemgbe ahụ? Ka anyị hụgodị.

Mgbe mbụ otu nwaanyị onye Nawatụl nụrụ ebe e ji asụsụ Nawatụl kwuo okwu Baịbụl n’ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, o ji obi ụtọ kwuo, sị: “O ruola afọ iri anyị gawara ọmụmụ ihe, ma anyị anaghị aghọtacha ihe a na-ekwu n’asụsụ Spanish. Ma, ọ dị anyị ka ọ̀ bụ ugbu a ka anyị malitere ịmụ Baịbụl!” Kemgbe afọ asatọ, otu nwoke dị afọ iri isii, nke aha ya bụ Juan, na nwunye ya na ụmụ ya na-amụ Baịbụl n’asụsụ Spanish ma na-aga ọmụmụ ihe n’ebe Ndịàmà Jehova na-amụ ihe n’asụsụ Spanish, ma o nwechaghị ihe ha na-amụta. Juan maliteziri mụwa Baịbụl n’asụsụ Nawatụl. O rughịdị otu afọ, ya aghọọ Onyeàmà Jehova e mere baptizim!

Nke a na-egosi na ọtụtụ ndị Nawatụl bu ụzọ mụwa Baịbụl n’asụsụ Spanish. Ma, ihe a na-akụziri ha anaghị edocha ha anya mgbe ahụ. Ugbu a e jizi asụsụ ha na-akụziri ha ihe n’ọmụmụ ihe nakwa ná mgbakọ Ndịàmà Jehova, ha enweekwa akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ ha, ha aghọtawala ihe Baịbụl na-ekwu, ghọtakwa ihe Chineke chọrọ ka Ndị Kraịst na-eme.

Imeri Nsogbu Ndị Ha Na-enwe

Ọtụtụ nsogbu bịaara ndị Nawatụl ka ha na-agbalị ife Chineke otú Baịbụl kwuru. Dị ka ihe atụ, ndị obodo ha nyere ha nsogbu ka ha soro ha mewe ememme dị iche iche a na-eme n’obodo ha. N’obodo San Agọstin Oapan, e kweghị ka Ndịàmà Jehova na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma n’ụlọ ha. Ihe kpatara ya bụ na ndị obodo ahụ chere na ọ ga-eme ka ndị mmadụ kwụsị ịtụ ego e ji eme ememme ndị ahụ. Mgbe Florencio na Ndịàmà Jehova ole na ole bụ́ ndị Nawatụl nọ na-ekwusa ozi ọma, e jidere ya na mmadụ abụọ ọzọ. Mgbe ọ na-erula nkeji iri abụọ e jidere ha, ìgwè mmadụ gbakọtara ka ha kwuo ihe a ga-eme ha.

Florencio kwuru, sị: “Ha chọrọ ịnọ ebe ahụ gbuo anyị. Ụfọdụ kwuru ka e kee anyị eriri ma tụba anyị n’ime mmiri ka mmiri rie anyị! Anyị nọboro chi n’ebe ha kpọchiri anyị. N’echi ya, otu Onyeàmà Jehova bụ́ ọkàiwu na ụmụnna abụọ ọzọ bịara inyere anyị aka. Ma, a kpọchikwara ha. Ndị isi mechara hapụ anyị niile ka anyị lawa, ma ha gwara anyị ka anyị kwapụ n’obodo ahụ.” N’agbanyeghị ihe a merenụ, e nwere ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’ebe ahụ mgbe otu afọ gafere. Mmadụ iri na asaa nọ n’ọgbakọ ahụ bụ Ndịàmà Jehova e mere baptizim, mmadụ iri ise na-abịakwa ọmụmụ ihe n’ọgbakọ ahụ.

N’obodo ndị Nawatụl a na-akpọ Koapala, ndị obodo gwara Onyeàmà Jehova aha ya bụ Alberto, ka o soro ha mee ememme obodo ha. Ma o kweghị, ha atụọ ya mkpọrọ. Mgbe ndị obodo ahụ zukọtara, ụfọdụ sịrị ka a kwụgbuo Alberto iji mee ka ụjọ jide onye ọ bụla chọrọ ịhapụ omenala obodo ahụ ma soro ya bụrụ Onyeàmà Jehova. Ụfọdụ Ndịàmà Jehova gbara mbọ ka a tọhapụ Alberto, ma e jidekwara ha. Mgbe ndị obodo ahụ mechara ememme ha ahụ, bụ́ nke were otu izu, a tọhapụrụ ha niile. Ma, mgbe ndị obodo na-ekweghị akwụsị nsogbu ha na-enye Ndịàmà Jehova, Ndịàmà Jehova gaziri kọọrọ gọọmenti, gọọmenti nyeziri iwu nke mere ka ndị obodo ahụ kwụsị inye Ndịàmà Jehova nsogbu. Otu ihe ọma merenụ bụ na otu nwoke kacha enye Ndịàmà Jehova nsogbu malitere ịmụ Baịbụl mgbe obere oge gafere, e meekwa ya baptizim. E nwere ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’obodo ahụ ugbu a.

Ha Yiri Ihe Ubi Chara Acha Maka Owuwe Ihe Ubi

Ọtụtụ Ndịàmà Jehova amụwala asụsụ Nawatụl n’ihi na ọtụtụ ndị Nawatụl chọrọ ịmụ Baịbụl. Ma ịmụta asụsụ a adịghị mfe. Ihe kpatara ya bụ na ndị Nawatụl na-emekarị ihere, ọ na-esikwara ha ike ịsụrụ ndị ọzọ asụsụ ha n’ihi otú ndị mmadụ sirila meso ha omume. Ihe ọzọ bụ na otú e si asụ asụsụ Nawatụl n’otu ebe na-adị iche n’otú e si asụ ya n’ebe ọzọ.

Otu Onyeàmà Jehova nke na-ekwusa ozi ọma oge niile, onye aha ya bụ Sonia, kwuru ihe mere ya ji mụwa asụsụ Nawatụl. Ọ sịrị: “E nwere ihe dị ka puku ndị Nawatụl isii bi nso n’ebe m bi. Ha si n’ebe dị iche iche na Nawatụl bịa biri ebe a na-arụ ọrụ. Ha bi ná mkpakara ụlọ, ndị nche na-echekwa ebe ahụ nche. O nweghị ka ọ hà ha, ndị mmadụ na-emesikwa ha ike. Ahụhụ ha na-ata gbara m anya mmiri n’ihi na ha bụ ndị a na-akwanyere ùgwù n’oge ochie, ọ bụkwa ha malitere mba anyị. Anyị ekwusaarala ha ozi ọma afọ iri abụọ n’asụsụ Spanish, ma ihe anyị na-akụziri ha anaghị atọcha ha ụtọ n’ihi na ha anaghị aghọtacha ihe anyị na-akụziri ha. Ma, mgbe m mụtara okwu ụfọdụ n’asụsụ ha, m malitere iji ya na-ezi ha ozi ọma. Ọtụtụ n’ime ha na-agbakọta gee m ntị. M gwara otu nwaanyị na ọ bụrụ na ọ kụziere m otú e si asụ asụsụ Nawatụl, m ga-akụziri ya otú e si agụ na otú e si ede ihe. Ugbu a, ihe ha na-akpọzi m n’ebe ahụ ha bi bụ ‘nwaanyị Nawatụl.’ Ọ dịcha ka m̀ na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ.” Taa, e nwere ọgbakọ Ndịàmà Jehova na-amụ ihe n’asụsụ Nawatụl n’ebe ahụ.

Maricela, bụ́ onye na-ekwusa ozi ọma oge niile, na-agbasikwa mbọ ike ịmụ asụsụ Nawatụl. O bu ụzọ kụziwere otu nwoke aha ya bụ Félix, bụ́ onye dị afọ iri asaa, Baịbụl n’asụsụ Spanish. Mgbe Maricela mụtakwuru asụsụ Nawatụl, ọ malitere iji asụsụ a na-akụziri Félix ihe. Ihe ahụ o mere nyeere Félix aka. Ọ metụrụ ya n’ahụ́ mgbe Félix jụrụ ya, sị, “Jehova ọ̀ na-ege m ntị ma m gwawa ya okwu n’asụsụ Nawatụl?” Obi tọrọ Félix ụtọ mgbe a gwara ya na Jehova na-anụ asụsụ niile. Félix na-agachi ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova anya n’agbanyeghị na ọ na-eji ụkwụ aga otu awa na ọkara tupu ya eruo ebe a na-enwe ọmụmụ ihe ahụ. E meekwala ya baptizim ugbu a. Maricela kwuru, sị: “Obi dị m ezigbo ụtọ na m so ndị mmụọ ozi na-ekwusara ụdị mmadụ niile ozi ọma!”—Mkpughe 14:6, 7.

N’eziokwu, e nwere ike ịsị na ndị Nawatụl yiri ihe a kụrụ n’ubi nke ‘chara acha maka owuwe ihe ubi.’ (Jọn 4:35) Ekpere anyị bụ ka Jehova Chineke nọgide na-akpọ ndị si ná mba niile dị n’ụwa, ma ndị Aztek nke oge a, ka ha gbagoo n’ugwu ya ka ọ kụziere ha ụzọ ya.—Aịzaya 2:2, 3.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Nawatụl so n’asụsụ ndị a na-akpọ Yuto-Aztek. Ndị na-asụ Nawatụl bụ ndị agbụrụ Hopi, Shoshoni, na Komanche bụ́ ndị bi n’Ebe Ugwu Amerịka. E nwere okwu Bekee ndị e si n’asụsụ Nawatụl nweta. Dị ka ihe atụ, e si n’asụsụ Nawatụl nweta ihe ndị Bekee na-akpọ ube Bekee, chokọlet, na tomato.

[Map dị na peeji nke 13]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

MEKSIKO SITI

OLE NDỊ AZTEK DỊ NA STEETI NKE Ọ BỤLA

150,000

EBE HA NA-ERUGHỊ 1,000